Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 32 p. 78-p. 79 para. 7
  • Olee Ihe Iwu Kwadoro na E Nwere Ike Ime n’Ụbọchị Izu Ike?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ihe Iwu Kwadoro na E Nwere Ike Ime n’Ụbọchị Izu Ike?
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ziri Ezi n’Iwu n’Ụbọchị Izu Ike?
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Iwu Ò Ji Ndị Kraịst Idebe Ụbọchị Izu Ike?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 32 p. 78-p. 79 para. 7
Mgbe Jizọs chọrọ ịgwọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ

ISI NKE 32

Olee Ihe Iwu Kwadoro na E Nwere Ike Ime n’Ụbọchị Izu Ike?

MATIU 12:9-14 MAK 3:1-6 LUK 6:6-11

  • JIZỌS AGWỌỌ OTU NWOKE AKA YA KPỌNWỤRỤ AKPỌNWỤ N’ỤBỌCHỊ IZU IKE

N’Ụbọchị Izu Ike ọzọ, Jizọs gara n’otu ụlọ nzukọ. Ọ ga-abụ na nke dị na Galili ka ọ gara. Ọ hụrụ otu nwoke aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ ebe ahụ. (Luk 6:6) Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ na-ele Jizọs anya. Gịnị mere ha ji na-ele ya? Ha gosiri ihe mere ha ji na-ele ya mgbe ha jụrụ ya, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ịgwọ ọrịa n’ụbọchị izu ike?”—Matiu 12:10.

Ndị ndú okpukpe ndị Juu kweere na mgbe iwu kwadoro ka a gwọọ mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike bụ naanị ma ọ bụrụ na ọrịa ahụ ga-egbu onye ahụ ma a gwọghị ya n’ụbọchị ahụ. Dị ka ihe atụ, ha chere na iwu akwadoghị ịgba mmadụ ọkpụkpụ ma ọ bụ ikechi ọnyá n’Ụbọchị Izu Ike, ebe ọ bụ na ọkpụkpụ gbajiri agbaji ma ọ bụ ọnyá agaghị egbu onye ahụ ma ọ bụrụ na e nweghị ihe e mere ya n’Ụbọchị Izu Ike. N’eziokwu, ihe mere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ji na-ajụ Jizọs ajụjụ ahụ abụghị n’ihi na ọnọdụ nwoke a na-emetụ ha n’obi. Kama, ha na-achọ ihe ha ga-akụdo aka maa Jizọs ikpe.

Ma, Jizọs ma ihe ha nọ na-eche. Ọ chọpụtara na ha enweela ihe ndị ha kpebirila na ha bụ imebi iwu ahụ kwuru ka a ghara ịrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, nke na-abụghịkwanụ ihe Baịbụl kwuru. (Ọpụpụ 20:8-10) Ma, ihe a abụghị mbụ a na-akatọ ọrụ ọma Jizọs na-arụ. Ugbu a, Jizọs meziri ihe ga-eme ka ndị ahụ katọsikwuo ya ike mgbe ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie bịa n’etiti.”—Mak 3:3.

O lere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ anya sị ha: “Ònye n’ime unu nke nwere otu atụrụ bụ onye na-agaghị ejide ya dọpụta ya, ma ọ bụrụ na atụrụ ahụ adaba n’olulu n’ụbọchị izu ike.” (Matiu 12:11) Atụrụ bụ ihe na-enye onye nwe ya ego, n’ihi ya, ha agaghị ahapụ atụrụ ha n’olulu chi efoo. Ha hapụ ya, o nwere ike ime ka ezigbo ego funahụ ha. Ihe ọzọ bụkwa na Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Onye ezi omume na-elekọta mkpụrụ obi anụ ụlọ ya.”—Ilu 12:10.

Jizọs jizi ihe atụ a tụnyere mmadụ. Ọ sịrị: “Lee ka mmadụ si dị oké ọnụ ahịa karịa atụrụ! Ya mere, ọ bụ ihe iwu kwadoro ime ezi ihe n’ụbọchị izu ike.” (Matiu 12:12) N’ihi ya, Jizọs anaghị emebi Ụbọchị Izu Ike ma ọ gwọọ mmadụ n’ụbọchị ahụ. Ndị ndú okpukpe ahụ enwelighị ike ịgbagha ihe a doro anya Jizọs kwuru. N’ihi ya, ha mechiri ọnụ.

Echiche a na-ezighị ezi ha nwere were Jizọs ezigbo iwe, wutekwa ya. O lere anya gburugburu ma sị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị.” (Matiu 12:13) Ozugbo nwoke ahụ gbatịrị aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, aka dịrị ya mma. Ihe a merenụ mere ka nwoke ahụ nwee obi ụtọ. Ma, olee otú obi dị ndị ahụ na-achọ inweta Jizọs?

Mgbe ndị ndú ndị Juu na-agba izu ka ha gbuo Jizọs

Kama inwewa obi ụtọ na aka adịla nwoke ahụ mma, ndị Farisii gara “ha na ndị òtù Herọd wee malite ịgbara [Jizọs] izu ozugbo, ka ha wee gbuo ya.” (Mak 3:6) Ọ ga-abụ na ndị so ná ndị òtù Herọd a bụ ndị òtù okpukpe a na-akpọ ndị Sadusii. Ndị Farisii na ndị Sadusii adịghị ná mma, mana ugbu a, ha gbakọrọ aka na-emegide Jizọs.

  • Gịnị mere ndị ndú okpukpe ndị Juu ji sesa Jizọs okwu?

  • Olee echiche na-ezighị ezi ndị ndú okpukpe ndị Juu nwere banyere iwu Ụbọchị Izu Ike?

  • Olee otú Jizọs si gosi na echiche ndị Farisii nwere banyere Ụbọchị Izu Ike ezighị ezi?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya