Egwu—Ọ Dị Ebe Nile Ugbu A Ma Ọ Gaghị Adị Ruo Mgbe Ebighị Ebi!
NDỊ na-amụ Okwu Chineke enweghị ihe ijuanya na egwu dị nnọọ ebe nile. Dị ka Ndịàmà Jehova kwupụtaworo n’ụzọ dị ukwuu n’ozi ha, e nwere ihe àmà bara ụba na anyị na-ebi n’oge a kara aka n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ị maara na egwu zuru ebe nile na-aka ya akara. Ma ogologo oge gara aga Jisọs kara akara, ma ọ bụ rụtụ aka, n’oge anyị. Ọ na-aza ajụjụ nke ndị ozi ya jụrụ ya banyere ọnụnọ ya na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, ma ọ bụ ‘ọgwụgwụ nke ụwa.’—Matiu 24:3.
Nke a bụ akụkụ nke ihe Jisọs buru amụma ya:
“Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ala ọma jijiji ga-adịkwa, oké ụnwụ na ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche; ihe dị egwu na ihe ịrịba ama ukwu ga-adịkwa site n’eluigwe.”—Luk 21:10, 11.
Ị̀ rịbara okwu ya banyere “ihe dị egwu” ama? Mgbe ọ na-aga n’ihu ná nzaghachi ya ahụ, Jisọs kwuru ihe ọzọ dị mkpa banyere egwu nke pụrụ imetụ gị na ndị ị hụrụ n’anya kpọmkwem n’ụzọ siri ike. Ma tupu anyị elebara nke ahụ anya, ka anyị tụleghachi ná mkpirikpi ụfọdụ ihe àmà e nwekwuru na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ.—2 Timoti 3:1.
Egwu Kwesịrị Ekwesị Banyere Agha
Mburịta agha ebibiwo ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ Geo kpọrọ ọdọ mmanụ ndị na-ere ọkụ nke akụkụ a na-emeri emeri gbahapụrụ ná ngwụsị nke agha nke Middle East nke a lụsịrị n’oge na-adịbeghị anya “mbibi nke gburugburu ebe obibi kachasịnụ nke mmadụ kpatatụworo.” Agha egbuwo ma ọ bụ nye ọtụtụ iri nde nkwarụ. Tụkwasị n’ọtụtụ nde ndị agha na ndị nkịtị nwụrụ n’Agha Ụwa Mbụ, e gburu 55 nde n’Agha Ụwa nke Abụọ. Cheta na dị ka akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ na ọgwụgwụ ụwa dị nso, Jisọs sịrị na “mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.”
Anyị apụghịkwa ileghara mgbalị mmadụ meworo igbuchapụ ìgwè mmadụ n’otu—mbibi nke agbụrụ ma ọ bụ otu ndị. Ọnwụ nke ọtụtụ nde ndị Armenia, ndị Cambodia, ndị Juu, ndị Rwanda, ndị Ukraine, na ndị ọzọ atụkwasịwo ihe n’oké ikpe ọmụma ọbara nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ime narị afọ nke 20. Igbu ọchụ ahụ ka na-agakwa n’ihu n’ala ebe ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè na-agba ume inwe ịkpọasị agbụrụ. Ee, agha ka ji ọbara ụmụ mmadụ na-ede elu ala ka mmiri.
Agha nke oge a ka nọgidere na-ata isi nke ọtụtụ ndị ọbụna mgbe a kwụsịchara ịlụ agha. Dị ka ihe atụ, chee banyere olili a na-eli ogbunigwe aghara aghara n’ime ala. Dị ka otu akụkọ òtù na-eme nnyocha bụ́ Human Rights Watch si kwuo, “ihe dị ka 100 nde ogbunigwe ndị e liri n’ala gburugburu ụwa na-eyi ndị nkịtị egwu.” Ụdị ogbunigwe ndị ahụ nọgidere na-abụ ihe ize ndụ nye ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị aka ha dị ọcha ọbụna mgbe agha e ji ha lụọ kwụsịworo. A na-akọ na kwa ọnwa, ụdị ogbunigwe ndị ahụ na-egbu ma ọ bụ na-emenye ọtụtụ puku mmadụ ọrụsị n’ihe karịrị 60 mba. Gịnị mere na e jighị nwayọọ nwayọọ wepụsịa ihe iyi egwu nke a nke ndụ na nke nkwarụ? Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru, sị: “A na-eli ọtụtụ ogbunigwe n’ime ala kwa ụbọchị karịa ka a na-ewepụ ha n’usoro ihe omume imebi ogbunigwe, ya mere ọnụ ọgụgụ ndị ọ na-emerụ ahụ nọgidere na-arị elu.”
Isiokwu akwụkwọ akụkọ ahụ nke e biri na 1993 kọrọ na ire ogbunigwe ndị a aghọwo azụmahịa nke “na-eweta ihe ruru $200 nde kwa afọ.” O metụtara “ihe dị ka 100 ụlọ ọrụ na ngalaba gọọmenti dị iche iche na 48 mba” bụ́ ndị “nọrịị na-ebupụ 340 ụdị dị iche iche” nke ogbunigwe n’ofesi. N’ụzọ dị njọ, a na-eme ụfọdụ ogbunigwe inwe ọdịdị nke ihe ụmụaka ji egwu egwu iji mee ka ọ dọta mmasị ụmụaka! Leedị nnọọ, ịmara ụma na-achọ inweta ụmụaka aka ha dị ọcha iji merụọ ha ahụ ma bibie ha! Otu uche akwụkwọ akụkọ a kpọrọ “100 Nde Ígwè Ọrụ Mbibi” kwuru na ogbunigwe “egbuwo ma ọ bụ menye ọtụtụ mmadụ ọrụsị karịa agha e ji mmiri ọgwụ, ihe ndị dị ntụ, na nuklia lụọ.”
Ma ọ bụghị nanị ogbunigwe ndị a na-eli n’ala bụ nanị ngwá ahịa na-akpata ọnwụ ndị a na-ere n’ahịa ụwa. Ndị ahịa anyaukwu na-atụ mgbere ngwá agha nwere azụmahịa na-eweta ọtụtụ ijeri dollar gburugburu ụwa. Magazin bụ́ The Defense Monitor, nke Òtù Na-ahụ Maka Ihe Ọmụma Nchebe, na-akọ, sị: “N’ime afọ iri gara aga [mba a ma ama] bupụrụ ngwá agha ọnụ ahịa ya dị $135 Ijeri.” Mba a dị ike ‘nyekwara ikike maka iresị 142 mba ngwá agha, ihe owuwu ndị agha, na ọzụzụ, nke ọnụ ahịa ya ruru $63 Ijeri.” E si otú a na-agha mkpụrụ maka ịlụ agha na ịta ahụhụ ndị mmadụ n’ọdịnihu. Dị ka magazin bụ́ The Defense Monitor si kwuo, na “1990 nanị, agha mere ka nde mmadụ 5 nọrọ ná nkwadebe, fuo ihe karịrị $50 Ijeri, gbuokwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu nde mmadụ, ihe ka n’ime ha bụ ndị nkịtị.” N’ezie, ị pụrụ iche banyere ọtụtụ agha nke a lụworo kemgbe afọ ahụ, na-eweta egwu na ọnwụ nye ọtụtụ nde mmadụ ndị ọzọ!
Ibibikwu Ụwa na Ndụ Ya
Professor Barry Commoner na-adọ aka ná ntị, sị: “Ekwenyere m na ịnọgide na-emetọ elu ala, ọ bụrụ na a kparaghị ya ókè, ga-emesịa bibie ọnọdụ nke mbara ala nke a dị ka ebe mmadụ pụrụ ịdị ndụ.” Ọ gara n’ihu ikwu na nsogbu ahụ abụghị amaghị nke a na-akọ kama anyaukwu a ma ụma na-eme. Ị̀ na-eche na Chineke anyị na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-ahụ n’anya ga-ekwere ọnọdụ a ruo oge a na-akaghị aka, na-ekpughe anyị nye egwu nke mmetọ na-aka njọ? Mmebi nke elu ala chọrọ ka e soro ndị na-emebi ya mee mpịazi na mgbe e mesịrị Chineke iweghachi mbara ụwa a n’ọnọdụ ya. Nke ahụ bụ otu akụkụ nke ihe Jisọs kwuru banyere ya ná nzaghachi ya nye ndị ozi banyere ‘ọgwụgwụ ụwa.’
Tupu anyị atụlee otú Chineke ga-esi weta mpịazi ahụ, ka anyị gaa n’ihu inyocha ihe ndekọ mmadụ. Ọbụna ndepụta na-ezughị ezu nke mmetọ nile nke mmadụ na-akpata mwute: mmiri ozuzo nwere acid na mgbutu osisi e ji anyaukwu na-eme bụ́ nke na-ebibi oké ọhịa nile; ịwụsa ihe mkpofu nuklia, mmiri ọgwụ ndị na-egbu egbu, na nsị a na-etinyeghị ọgwụ na ha n’ajụghị ase; ime ka ihe nchebe ozone ghara isi ike; na iji ọgwụ e ji egbu ahịhịa na ọgwụ e ji egbu ahụhụ eme ihe n’ajụghị ase.
Ọdịmma azụmahịa na-emetọ ụwa n’ụzọ ndị ọzọ n’ihi uru. A na-awụnye ọtụtụ tọn nke ihe mkpofu n’ime osimiri, oké osimiri, ikuku, na n’ájá kwa ụbọchị. Ndị ọkà mmụta sayensị na-eji mkpọkọrọ ngwongwo nke ụgbọ mbara igwe na-emetọsị eluigwe, n’azachaghị ebe ha metọsịrị mgbe ha mechara, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ụwa ji ọsọ na-aghọ ebe ihe mkpofu nke na-aga ya gburugburu kpuchiri. Ọ bụrụ na ọ bụghị usoro ndị sitere n’okike bụ́ ndị Chineke meworo ka ụwa nwee ike na-adịghachi ọhụrụ n’onwe ya, ebe obibi elu ala anyị agaraghị na-akwado ndụ, o yikwara ka mmadụ ọ gaara anwụworị n’ihe mkpofu nke onwe ya.
Mmadụ ọbụna na-emetọ onwe ya. Were dị ka ihe atụ, iji ụtaba na ọgwụ ndị ọzọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Na United States, a kpọwo iji ihe ndị na-eri ahụ na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi “nsogbu ahụ ike kachasịnụ nke mba.” Ọ na-efu mba ahụ $238 ijeri kwa afọ, bụ nke a na-emefu $34 ijeri n’ime ya ná “nlekọta ahụ ike na-adịghị mkpa [ya bụ, nke a pụrụ izere].” Gịnị ka i chere ụtaba na-efu n’ego ma ná ndụ ebe i bi?
Ụzọ ndụ mmadụ mere otú ọ masịrị ya na nke dị iche n’ihe ọha mmadụ nakweere, nke ọtụtụ na-esiri ọnwụ na ha bụ ihe ruuru ha, amịpụtawo mkpụrụ na-atụ egwu nke ọrịa ndị na-egbu mmadụ bụ́ ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, na-akpọga ọtụtụ ndị na-emebeghị agadi n’ili ha. A chọpụtawo na akụkụ akwụkwọ akụkọ a na-ama ọkwa ndị nwụrụ anwụ n’akwụkwọ akụkọ obodo ukwu ndị bụ́ isi na-egosi ugbu a ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị na-anwụ n’afọ ndị 30 na 40 ha. N’ihi gịnị? Ọtụtụ mgbe n’ihi ihe ndị dị njọ na-esi n’àgwà mbibi ha apụta. Ụdị ịba ụba dị mwute nke ọrịa mmekọahụ na ọrịa ndị ọzọ kwekọkwara n’amụma Jisọs, n’ihi na o kwuru na a ga-enwe ‘ajọ ọrịa na-efe efe n’ebe dị iche iche.’
Otú ọ dị, mmetọ kasị njọ bụ nke uche na mmụọ mmadụ, ma ọ bụ àgwà ya. Ọ bụrụ na ị tụleghachi ụdị mmerụ nile nke anyị kpọtụworo aha ruo ugbu a, ọ́ bụghị eziokwu na ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ihe sitere n’uche e metọrọ emetọ? Lee oké mbibi nke uche na-arịa ọrịa na-emepụta n’ụdị nke igbu ọchụ, ndina n’ike, izu ohi, na ụdị ndị ọzọ nke ime ihe ike nke otu onye na-emeso onye ọzọ. Ọtụtụ ndị ghọtakwara na ọtụtụ nde nke isikwopụ afọ ime nke a na-eme kwa afọ bụ ihe àmà nke mmetọ uche na ime mmụọ.
Anyị na-ahụ ihe dị ukwuu n’ime ya n’omume nke ntorobịa. Enweghị nkwanye ùgwù maka ịchịisi nke nne ma ọ bụ nna na ndị ọzọ na-etinye ihe ná ndakpọ ezinụlọ na inupụrụ iwu na ụkpụrụ isi. Enweghị ezi egwu a nke ịchịisi bụ nke e jikọrọ ya na enweghị ihe ime mmụọ nke onye ntorobịa. Ya mere, ndị ahụ na-ezi evolushọn, ekweghị na Chineke, na ozizi ndị ọzọ na-ebibi okwukwe bu ikpe ọmụma dị ukwuu. Ndị ọzọ ikpe makwara bụ ọtụtụ ndị ozizi okpukpe bụ́ ndị gbakụtaworo Okwu Chineke azụ ná mgbalị ha ịbụ ndị a nabatara dị ka ndị ọgbara ọhụrụ na “ndị ziri ezi.” Ha na ndị ọzọ jupụtara n’amamihe nke ụwa na-akụzi nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ ndị na-emegiderịta onwe ha.
Ihe ndị ọ rụpụtaworo taa doro anya. Ọ bụghị ịhụnanya nke Chineke na nke mmadụ ibe ha na-akwali ndị mmadụ taa, kama ọ bụ anyaukwu na ịkpọasị. Mkpụrụ ọjọọ ya bụ omume rụrụ arụ, ime ihe ike, na enweghị olileanya gbasara ebe nile. N’ụzọ dị mwute, nke a na-eme ka ndị obi ha ziri ezi nọrọ n’egwu, tinyere egwu na mmadụ ga-ebibi onwe ya na mbara ụwa.
Ọ̀ Ga-aka Njọ Ka Ọ̀ Ga-aka Mma?
Gịnị ka ọdịnihu dị nso nwere banyere egwu? Egwu ọ̀ ga-anọgide na-arị elu, ka à ga-emeri ya? Ka anyị rịbakwa ama ihe Jisọs gwara ndị ozi ya.
Ọ rụtụrụ aka n’ihe ga-eme n’ọdịnihu dị nso—mkpagbu ukwu. Ihe ndị a bụ okwu ya: “Ngwa ngwa, mgbe mkpagbu mgbe ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya, kpakpando nile ga-adakwa site n’eluigwe, a ga-emekwa ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ: mgbe ahụ ka ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.”—Matiu 24:29, 30.
Ya mere anyị pụrụ ịtụ anya na mkpagbu ukwu ahụ ga-amalite n’oge na-adịghị anya. Amụma ndị ọzọ nke Bible na-egosi na akụkụ ya nke mbụ ga-abụ ịkwụghachi okpukpe ụgha gburugburu ụwa ụgwọ ọrụ ha. Mgbe ahụ ka ihe omume ahụ a ka hotasịrị nke na-awụ akpata oyi n’ahụ ga-abịa, gụnyere ụdị ihe omume ụfọdụ nke eluigwe. Gịnị ga-abụ mmetụta ya n’ahụ ọtụtụ nde ndị mmadụ?
Ọ dị mma, tụlee ihe ndekọ nke nzaghachi Jisọs ya na nke ahụ yiri, bụ́ ebe anyị nwere okwu amụma ndị e mere ka ọ saa mbara:
“Ihe ịrịba ama dị iche iche ga-adịkwa n’anyanwụ na ọnwa na kpakpando; n’elu ụwa ka mkpagbu nke mba dị iche iche ga-adịkwa, ndị nọ n’obi abụọ n’ihi mbigbọ nke oké osimiri na ebili mmiri; mmadụ na-atụgbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi: n’ihi na a ga-eme ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ.”—Luk 21:25, 26.
Nke ahụ dị anyị n’ihu. Ma ọ bụghị mmadụ nile ga-anọ mgbe ahụ n’ụdị egwu ahụ nke ga-eme ka ha tụbọọ. N’ụzọ dị iche, Jisọs kwuru, sị: “Mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.”—Luk 21:28.
Ọ bụ ezi ndị na-eso ụzọ ya ka ọ gwara okwu ndị ahụ na-agba ume. Kama ịbụ ndị tụbọrọ ma ọ bụ kụnwụọ n’egwu, ha ga-enwe ihe mere ha ga-eji welie isi ha elu n’atụghị egwu, ọ bụ ezie na ha ma na mmezu nke mkpagbu ukwu ahụ dị nso. N’ihi gịnị ka ha na-agaghị eji tụọ egwu?
N’ihi na Bible na-asị n’ụzọ doro anya na a ga-enwe ndị nlanarị nke ‘oké mkpagbu’ ahụ nile. (Mkpughe 7:14) Ihe ndekọ nke naenwe nkwa nke a na-asị na ọ bụrụ na anyị soro n’ime ndị nlanarị ahụ, anyị pụrụ inweta ngọzi ndị na-enweghị atụ site n’aka Chineke. O mechiri site n’ikwe nkwa na Jisọs “ga-azụ ha dị ka atụrụ, Ọ ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ: Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.”—Mkpughe 7:16, 17.
Ndị ahụ—a pụkwara ịgụnye anyị—ga-enweta ngọzi ndị ahụ agaghị enwe egwu ndị ahụ na-eti ndị mmadụ ihe otiti taa. Ma, nke ahụ adịghị apụta na ha agaghị enwe egwu ọ bụla ma ọlị, n’ihi na Bible na-egosi na e nwere egwu dị mma na nke na-adịghị mma. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe nke a bụ na otú o kwesịrị isi emetụta anyị.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 7]
Mmetọ: Foto: Godo-Foto; rọket: foto U.S. Army; osisi ndị na-ere ọkụ: Richard Bierregaard, Smithsonian Institution
[Foto dị na peeji nke 8]
Ndị na-efe Jehova ofufe ji obi ụtọ na-echere ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ