Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lmd ihe ọmụmụ 3
  • Dịrị Obiọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Dịrị Obiọma
  • Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jizọs Mere
  • Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
  • Na-eme Ka Jizọs
  • Kwuo Ihe Ga-amasị Ndị Ọzọ
    Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Kwe Ka “Iwu Obiọma” Na-eduzi Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ịchụso Obiọma n’Ụwa nke Na-enweghị Omume Enyi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Mee Ihe Na-atọ Jehova Ụtọ Site n’Igosi Obi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
lmd ihe ọmụmụ 3

ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA

Ebe Jizọs ji nwayọọ na-emetụ otu nwoke kpuru ìsì aka n’anya ka ọ gwọọ ya.

Jọn 9:1-7

IHE ỌMỤMỤ NKE 3

Dịrị Obiọma

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Ịhụnanya dị obiọma.’​—1 Kọr. 13:4.

Ihe Jizọs Mere

Ebe Jizọs ji nwayọọ na-emetụ otu nwoke kpuru ìsì aka n’anya ka ọ gwọọ ya.

VIDIO: Jizọs Gwọrọ Onye Ìsì

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Jọn 9:1-7. Zazie ajụjụ ndị a:

  1. Ihe Jizọs bu ụzọ mee ọ̀ bụ ịgwọ onye ìsì ahụ, ka ọ̀ bụ izi ya ozi ọma?​—I nwere ike ịgụ Jọn 9:35-38.

  2. Olee ihe i chere mere nwoke ahụ ji gee Jizọs ntị?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Mmadụ ga-aka ege anyị ntị ma ọ chọpụta na anyị ji ya kpọrọ ihe.

Na-eme Ka Jizọs

3. Metere onye ahụ ebere. Gbalịa ghọta otú obi dị ya.

  1. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị nwere ike ịna-echegbu ya? Olee ihe nwere ike inyere ya aka, masịkwa ya?’ Ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka isi n’obi gị mee ihe ga-egosi na i nweere ya obiọma.

  2. Gee mmadụ ntị iji gosi na ihe gbasara ya na-emetụ gị n’obi. Ọ gwa gị ihe o chere gbasara otu ihe ma ọ bụ nsogbu o nwere, ahapụla ihe ahụ o kwuru kwuwe ihe ọzọ.

4. Meda obi gwa ya okwu, kwanyekwara ya ùgwù. Ọ bụrụ na ị na-emetere ya ebere, chọọkwa inyere ya aka, ọ ga-esi n’otú i si ekwu okwu chọpụta ya. Kpachara anya n’ihe ị na-ekwu na otú i si ekwu ya. Ekwukwala ihe nwere ike ịkpasu ya iwe.

5. Nyere ya aka. Chọpụta ohere dabara adaba ị ga-eji enyere ya aka. Imere mmadụ ihe ọma nwere ike ime ka anyị na onye ahụ kparịta ụka.

I NWEKWARA IKE ỊGỤ

Rom 12:15, 16; Gal. 6:10; Hib. 13:16

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya