Jehova na Kraịst Ndị Na-enweghị Atụ ná Nkwurịta Okwu
“N’ezie Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na o kpugheghị izu nzuzo ya nye ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma ya.”—EMỌS 3:7.
1. Olee ụzọ nzirịta ozi ndị e ji eme ihe taa?
TAA, nzirịta ozi bụ azụmahịa nke na-enye ọtụtụ nde dollar. Akwụkwọ nile ndị a na-ebipụta, akwụkwọ akụkọ na magazin ndị a na-ebipụta kwa mgbe, ihe omume redio na telivishọn ndị a na-eme, tinyekwara ihe nkiri sinima na ihe nkiri dị iche iche bụcha mgbalị a na-eme iji nwee ike izirịta ozi. Otú ahụkwa ka ọ dị n’akụkọ ozi nile ndị e deworo ma zipụ, tinyere òkù telifonu nile ndị a kpọworo. Ha nile bụcha mgbalị a na-eme iji nwee ike izirịta ozi.
2. Olee ihe atụ ndị e nwere nke ọganihu mmadụ nweworo n’akụkụ nkà na ụzụ́ nke izirita ozi?
2 Ọganihu mmadụ nweworo n’akụkụ nkà na ụzụ n’ihe metụtara nzirịta ozi dị nnọọ ukwu. Dị ka ihe atụ, waya a na-akpọ fiber-optic cable, nke ka nnọọ mma nke ukwuu ma e jiri ya tụnyere waya ndị e ji ọla mee, pụrụ ibu ọtụtụ iri puku ozi telifonu n’otu oge. Mgbe ahụ e nwere ígwè ọrụ satellite ndị e ji ezirịta ozi, bụ́ ndị na-agba ụwa gburugburu n’ime mbara igwe ma nwee ígwè ọrụ maka izighachite ozi ndị na-abịa n’ụdị ozi telifonu, telegraph, redio, na telivishọn. Otu ụdị satellite dị otú a pụrụ ibusasị 30,000 ozi telifonu dị iche iche n’otu mgbe!
3. Gịnị na-eme mgbe e nwere ihe mgbochi n’inwe nkwurịta okwu?
3 Ma n’agbanyeghị ụdị nzirịta ozi ndị a nile, a ka nwere oké nhụjuanya n’ụwa n’ihi enweghị nkwurịta okwu n’etiti ụmụ mmadụ na ibe ha. Otú a, a na-agwa anyị na “e nwere nkewa na-ebuwanye ibu—‘enweghị nkwurịta okwu’ nke na-amụbawanye—n’etiti ndị na-achị achị na ndị ha na-achị.” Gịnị bụkwa ihe ahụ a kpọrọ enweghị nkwurịta okwu n’etiti ndị meworo okenye na ndị ka na-eto eto ma ọ bụghị enweghị ihe ịga nke ọma nke ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha n’ikwurịta okwu? Ndị na-enye ndụmọdụ n’ihe banyere alụmdi na nwunye na-akọ na nsogbu kachasị e nwere n’ihe banyere alụmdi na nwunye bụ ọdịda a na-ada n’inwe nkwurịta okwu n’etiti di na nwunye. Enweghị ezi nkwurịta okwu pụrụ ọbụna ịkpata ọnwụ. Ná mmalite 1990, 73 ndị mmadụ nwụrụ n’ihe mberede ụgbọ elu, ihe àmà na-egosikwa na otu n’ihe ndị kpatara ya bụ enweghị nkwurịta okwu n’etiti onye na-akwọ ụgbọ elu na ndị nọ n’ala na-eduzi ụgbọ ahụ. Otu isiokwu akwụkwọ akụkọ kwupụtara, sị: “Ihe Mgbochi n’Inwe Nzirịta Ozi Dujere n’Oké Ọdachi.”
4. (a) Gịnị ka “nkwurịta okwu” pụtara? (b) Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ nke nkwurịta okwu n’etiti ndị Kraịst?
4 Gịnị bụ nkwurịta okwu n’ọnọdụ nke ndị Kraịst? Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, “nkwurịta okwu” pụtara “izipụ ihe ọmụma, echiche, ma ọ bụ mmetụta n’ụzọ a ga-anabata ya nke ọma ma ghọta ya.” Akwụkwọ ọkọwa okwu ọzọ na-akọwa ya dị ka “ụzọ nke ikwupụta echiche mmadụ n’ụzọ dị ìrè.” Rịba ama nkọwa ahụ bụ “ịkwupụta echiche mmadụ n’ụzọ dị ìrè.” Ọ dị mkpa karịsịa na nkwurịta okwu nke ndị Kraịst ga-adị ìrè n’ihi na ọ bụ ihe mgbaru ọsọ ya iji eziokwu nke Okwu Chineke rute obi ụmụ mmadụ, ka ọ ga-abụ na ma eleghị anya, ha ga-eme ihe banyere ihe ndị ha mụtara. N’ụzọ pụrụ iche, ọ bụ enweghị ọchịchọ onwe onye na inwe ịhụnanya na-akpali ya.
Jehova dị ka Onye Na-ekwurịta Okwu
5. Gịnị bụ otu n’ime ụzọ ndị Jehova Chineke siworo gwa mmadụ okwu?
5 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova Chineke bụ Onye Kachasị n’inwe nkwurịta okwu. N’ihi na o kere anyị n’onyinyo na oyiyi ya, ọ pụrụ iso anyị kwurịta okwu, o kwekwara mee bụ́ anyị isoro ndị ọzọ kwurịta okwu banyere ya. Kemgbe e kere mmadụ, Jehova agwawo ihe o kere eke nọ n’ụwa okwu banyere onwe ya. Otu ụzọ o siworo mee nke a bụ site n’ihe okike ya anya na-ahụ. Otú a, onye ọbụ abụ ahụ na-agwa anyị, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka ya ka mbara eluigwe na-egosi. Otu ụbọchị na-agwawara ụbọchị ibe ya okwu ọnụ n’ụba, otu abalị na-ekwupụtakwara abalị ibe ya ihe ọmụma.” (Abụ Ọma 19:1, 2) Ndị Rom 1:20 na-agwakwa anyị na ‘ihe Chineke anya na-ahụghị ka a na-ahụ nke ọma site n’okike ụwa.’ “A na-ahụ nke ọma,” na-egosi nkwurịta okwu dị ìrè!
6. Olee ihe Jehova gwara ihe o kere eke ndị bi n’elu ala mgbe ha nọ n’ogige Iden?
6 Ndị na-enweghị okwukwe na Chineke na ná mkpughe ya ga-achọ ime ka anyị kwere na a hapụrụ mmadụ n’amamihe nke onwe ya iji mata ihe mere o ji dịrị adị. Ma Okwu Chineke na-eme ka o doo anyị anya na Chineke agwawo mmadụ okwu site ná mmalite. Otú a, Chineke gwara nwoke na nwanyị mbụ ahụ okwu iwu banyere ịmụpụta ụmụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, budaa ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ . . . anụ nile ọ bụla dị ndụ.” Chineke nyekwara ha ike isi ná mkpụrụ osisi ndị dị n’ime ogige ahụ rijuo afọ—na-agụpụ nanị otu. Mgbe ahụ, mgbe Adam na Iv nupụrụ isi, Jehova kwuru okwu banyere nkwa mbụ nke metụtara Mesaịa ahụ, na-enye agbụrụ mmadụ olileanya, sị: “Iro ka m ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.”—Jenesis 1:28; 2:16, 17; 3:15.
7. Gịnị ka akwụkwọ Jenesis na-ekpughe banyere Jehova ịgwa ndị ohu ya okwu?
7 Mgbe nwa nwoke Adam bụ Ken jupụtara n’anya ụfụ jọgburu onwe ya, Jehova Chineke gwara ya okwu, na-asị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya: ‘Lezie anya! Ị na-eche nsogbu ihu!’ Ma Ken jụrụ ige ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ ma gbuo nwanne ya nwoke. (Jenesis 4:6-8) Mgbe ahụ, mgbe ụwa jupụtara n’ime ihe ike na mmebi iwu, Jehova gwara onye ezi omume ahụ bụ Noa nzube Ya ikpochapụ ihe nile dị n’ụwa nke na-emetọ ya. (Jenesis 6:13–7:5) Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ka Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta, Jehova gwara ha nzube ya banyere ịdị nsọ nke ndụ na ọbara, sitekwa n’eke na egwurugwu ahụ, o nyere ihe na-emesi obi ike na ọ gaghị eji mmiri bibie ihe nile dị ndụ ọzọ ma ọlị. Narị afọ ole na ole n’ọdịnihu, Jehova gwara Abraham nzube ya ime ka ezinụlọ nile nke agbụrụ mmadụ gọzie onwe ha site ná Mkpụrụ Abraham. (Jenesis 9:1-17; 12:1-3; 22:11, 12, 16-18) Mgbe Chineke kwukwara na ya ga-ebibi ndị Sọdọm na Gọmọra ahụ na-eme omume jọgburu onwe ya, o ji ịhụnanya gwa Abraham banyere ya, na-asị: “Mụ onwe m, m̀ na-ezonahụ Abraham ihe mụ onwe m na-eme?”—Jenesis 18:17.
8. N’ụzọ anọ ndị dị aṅaa ka Jehova siworo gwa ndị ohu ya ndị nọ n’ụwa okwu?
8 Na-amalite n’ebe Mosis nọ, Jehova sitere n’aka ọtụtụ ndị amụma gwa Israel okwu. (Ndị Hibru 1:1) Mgbe ụfọdụ ọ na-eme ya site n’ịkpọpụta okwu ha ga-edekọ, dị ka mgbe ọ gwara Mosis, sị: “Deere onwe gị okwu ndị a n’ihe.” (Ọpụpụ 34:27) Ọtụtụ mgbe karị, Jehova gwara ndị bụ ọnụ na-ekwuru ya okwu site n’ọhụụ, dị ka o meworo n’ebe Abraham nọ.a Jehova jikwa nrọ mee ihe ịgwa ụmụ mmadụ okwu, ọ bụghịkwa nanị ndị na-ejere ya ozi, kama ndị ha na ndị na-ejere ya ozi na-emekọ ihe. Dị ka ihe atụ, Jehova mere ka mmadụ abụọ ha na Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ rọọ nrọ, bụ́ nke Josef kọwaara ha. Jehova mekwara ka Fero na Nebukadneza rọọ nrọ, nke ndị ohu ya bụ Josef na Daniel kọwaara ha. (Jenesis 40:8–41:32; Daniel, isi 2 na 4) Tụkwasịkwa, n’ọtụtụ oge, Jehova ji ndị ozi bụ mmụọ mee ihe ịgwa ndị ohu ya okwu.—Ọpụpụ 3:2; Ndị Ikpe 6:11; Matiu 1:20; Luk 1:26.
9. Gịnị kpaliri Jehova ịgwa ndị ya Israel okwu, dị ka a pụrụ ịhụ n’okwu ya ndị dị aṅaa?
9 Ozi ndị dị otú ahụ Jehova ziri site n’ọnụ ndị amụma ya gosipụtara ịhụnanya ya maka ndị ya Israel. Dị ka ihe atụ, o kwuru site n’ọnụ onye amụma ya bụ Ezikiel, sị: “Ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ ma ọlị; kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ: chigharịanụ, sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu chigharị; ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka unu ga-anwụ, ụlọ Israel?” (Ezikiel 33:11) Jehova bụ Onye Na-ekwurịta Okwu nke nwere ogologo ntachi obi ma nwee ndidi n’ebe ndị ya nke oge ochie na-enupụ isi nọ, dị ka a pụrụ ịhụ site na 2 Ihe Emere 36:15, 16: “Jehova, bụ́ Chineke nke ndị bụ nna ha, wee zigara ha ozi n’aka ndị ozi ya, na-ebili n’isi ụtụtụ, na-ezikwa; n’ihi na o nwere ọmịiko n’ahụ ndị ya na n’ebe obibi ya dị: ha wee . . . na-elelịkwa okwu ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma ya nọ . . . ruo mgbe ngwọta na-adịghị.”
10. Olee otú Jehova si agwa ndị ya okwu taa, ruokwa n’ókè ha aṅaa ka ọ bụ Chineke nke na-enwe nkwurịta okwu?
10 Taa, anyị nwere Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible Nsọ, nke Jehova na-esi n’ime ya na-agwa anyị okwu banyere onwe ya, nzube ya nile na ihe bụ uche ya maka anyị. (2 Timoti 3:16, 17) N’ezie, dị ka Onye Na-ekwurịta Okwu nke Kachasịnụ, bụ́ Jehova na-ekwu, sị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na o kpugheghị izu nzuzo ya nye ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma ya.” (Emọs 3:7) Ọ na-agwa ndị na-ejere ya ozi ihe ọ na-ezube ime.
Ọkpara Chineke dị ka Onye Na-ekwurịta Okwu
11. Ònye bụ ngwá ọrụ bụ isi Jehova si n’ọnụ ya agwa mmadụ okwu, n’ihi gịnịkwa ka utu aha ya nke bụ́ “Okwu ahụ” ji kwesị ekwesị?
11 Ná ndị nile Jehova ji mee ihe n’ikwu ihe bụ uche Ya, onye kachasị bụ Okwu ahụ, bụ́ Logos ahụ, onye ghọrọ Jisọs Kraịst. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịkpọ ya Okwu ahụ, ma ọ bụ Logos? Ọ pụtara na ọ bụ Ọnụ Bụ Isi nke Na-ekwuru Jehova. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịbụ ọnụ na-ekwuru onye ọzọ? Ọ bụ onye na-ekwuchitere onye ọzọ ihe o nwere ikwu. Ya mere Logos ahụ ghọrọ onye na-ekwu okwu Jehova Chineke gwa ihe O kere eke nọ n’ụwa ndị nwere ọgụgụ isi. Ọrụ ya dị oké mkpa nke na a kpọrọ ya Okwu ahụ.—Jọn 1:1, 2, 14.
12. (a) N’ihi nzube dị aṅaa ka Jisọs ji bịa n’ụwa? (b) Gịnị na-agba àmà banyere ikwesị ntụkwasị obi ya n’imezu nzube ahụ?
12 Jisọs n’onwe ya gwara Pọntịọs Paịlet na nzube bụ isi ya ji bịa n’ụwa bụ ikwu eziokwu ahụ gwa agbụrụ mmadụ: “A mụwo mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Ihe ndekọ dị n’Oziọma ndị ahụ na-akọwakwa ụzọ o si rụzuo ọrụ ahụ nke ọma. A matara Ozizi Elu Ugwu ya dị ka ozizi kachasịnụ nke mmadụ ọ bụla zitụworo. Lee nnọọ ụzọ mara mma o si gwa ndị ọzọ okwu site n’ozizi ndị ahụ! “Ibubo ozizi ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile [ndị nụrụ ozizi ahụ] n’ahụ.” (Matiu 7:28) Banyere oge ọzọ, anyị na-agụ, sị: “Oké ìgwè mmadụ ahụ wee were obi ụtọ nụ okwu ya.” (Mak 12:37) Mgbe e zipụrụ ndị ọrụ ọchịchị ụfọdụ ịga jide Jisọs, ha lọghachitere n’ejideghị ya. N’ihi gịnị? Ha zara ndị Farisii ahụ, sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ kwuru okwu dị otú a.”—Jọn 7:46.
E Nyere Ndị Ozi Kraịst Ọrụ Ịbụ Ndị Na-ekwurịta Okwu
13. Gịnị na-egosi na Kraịst enweghị afọ ojuju na nanị ya ịbụ onye na-enwe nkwurịta okwu?
13 N’ihi enweghị afọ ojuju na nanị ya ịbụ onye na-enwe nkwurịta, Jisọs bu ụzọ họpụta ndị ozi 12, e mesịakwa, 70 ndị nkwusa ịga dị ka ndị na-ekwu okwu ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Luk 9:1; 10:1) Mgbe ahụkwa nwa oge tupu ọ rịgoo n’eluigwe, ọ gwara ndị ozi ya ka ha rụọ otu ọrụ pụrụ iche. Olee ọrụ ọ bụ? Dị ka anyị na-agụ na Matiu 28:19, 20, ọ gwara ha ka ha bụrụ ndị na-enwe nkwurịta okwu; ha ga-akụzikwara ndị ọzọ otú ha ga-esi ghọọ ndị na-enwe nkwurịta okwu.
14. Ruo ókè ha aṅaa ka ndị Kraịst oge mbụ bụ ndị dị ìrè n’inwe nkwurịta okwu?
14 Ndị ozi ahụ hà bụ ndị na-enwe nkwurịta okwu dị ìrè? N’ezie ha bụ! N’ihi nkwusa ha mere n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., a tụkwasịrị 3,000 ndị mmadụ n’ọgbakọ ndị Kraịst ahụ e guzobere ọhụrụ. N’oge na-adịghị anya, ọnụ ọgụgụ ahụ mụbara ibu 5,000 ndị mmadụ. (Ọrụ 2:41; 4:4) Ka a sịkwa ihe mere na ndị iro ha bụ ndị Juu gwara ha na ha ejiriwo ozizi ha mejupụta Jerusalem ma mesịakwa mee mkpesa na ha ejiwo nkwusa ha kpugharịa elu ụwa dum mmadụ bi ihu!—Ọrụ 5:28; 17:6.
15. Olee ngwá ọrụ Jehova jiworo mee ihe n’oge a n’ịgwa ndị mmadụ okwu?
15 Olee banyere oge a? Dị ka e buru n’amụma na Matiu 24:3, 45-47, Onyenwe anyị, bụ́ Jisọs Kraịst ahọpụtawo “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi,” nke ndị mejupụtara ya bụ ndị Kraịst e tere mmanụ, ilekọta ihe onwunwe ya nile n’ụwa n’oge nke a nke ọnụnọ ya. Ọ bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ́ nke nwere dị ka ụzọ mkpọsa ozi ya, Watch Tower Bible and Tract Society, na-anọchite anya ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi taa. N’ụzọ kasị kwesị ekwesị, a kpọwokwa ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, ụzọ nke Chineke si ekwu okwu. Ọ na-agbakwa anyị ume n’otu aka ahụ ịbụ ezi ndị na-enwe nkwurịta okwu. N’ezie, mbipụta mbụ nke Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence dụrụ ndị na-agụ ya ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na i nwere onye agbata obi ma ọ bụ enyi nke i chere na ọ ga-enwe mmasị na [magazin nke a] ma ọ bụ rite uru site n’ihe ozizi dị na ya, ị pụrụ ime ka ha mara banyere ya; si otú a na-ekwusa Okwu ahụ ma na-eme ihe ọma nye mmadụ nile dị ka i nwere ohere ya.”
16. Gịnị na-egosi na a chọrọ ihe dị ukwuu karịa nanị ịgụ Bible ka Chineke wee nwee ike n’ụzọ dị ìrè ịgwa ndị ohu ya nọ n’ụwa okwu?
16 Otú ọ dị, nanị inwe Okwu Chineke na ịgụ ya n’onwe gị ezughị ezu iji nweta ezi ihe ọmụma nke na-eme ka mmadụ gaa ije n’ụzọ nke ndụ. Cheta onye Etiopia ahụ na-arụ ọrụ n’òbíeze, bụ́ onye na-agụ amụma Aịsaịa ma ọ ghọtaghị ihe ọ na-agụ. Filip onye na-ezisa ozi ọma kọwaara ya amụma ahụ, bụ́ nke mgbe a kọwasịịrị ya, ọ dị njikere ime baptism dị ka onye na-eso ụzọ Kraịst. (Ọrụ 8:27-38) Na a chọrọ ihe dị ukwuu karịa nanị ịgụ Bible n’onwe onye ka a pụrụ ịhụ site ná Ndị Efesọs 4:11-13, ebe Pọl na-egosi na ọ bụghị nanị na Kraịst nyere ụfọdụ dị ka ndị e sitere n’ike mmụọ nsọ mee ka ha bụrụ ndị ozi na ndị amụma kamakwa o nyere “ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi; ime ka ndị nsọ zuo okè ịrụ ọrụ nke ije ozi, iwuli ahụ nke Kraịst elu dị ka ụlọ: ruo mgbe anyị nile ga-eru ịdị n’otu nke okwukwe na nke mmazu nke Ọkpara Chineke, ruo ịbụ nwoke tozuru okè.”
17. Site n’akara ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ iji mata òtù nke Jehova ji eme ihe taa iji gwa agbụrụ mmadụ ihe ndị bụ nzube ya?
17 Olee otú anyị ga-esi chọpụta ndị ahụ Jehova Chineke na Jisọs Kraịst ji eme ihe n’inyere ndị ga-aghọ ndị Kraịst aka iru ọnọdụ nke ịbụ ndị tozuru okè? Dị ka Jisọs si kwuo, otu n’ime akara ndị a ga-eji chọpụta ga-abụ na ndị a ga-ahụrịta ibe ha n’anya dị ka Jisọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya. (Jọn 13:34, 35) Akara ọzọ e ji amata ha: Ha agaghị abụ akụkụ nke ụwa, ọbụna dị ka Jisọs na-abụghị akụkụ nke ụwa. (Jọn 15:19; 17:16) Akara ọzọ ga-abụkwa na ha ga-amata Okwu Chineke dị ka eziokwu, dị ka Jisọs mere, na-erube isi mgbe nile n’ike o nwere. (Matiu 22:29; Jọn 17:17) Itinye aha Chineke n’ọnọdụ mbụ dị ka Jisọs mere, ga-abụkwa akara ọzọ. (Matiu 6:9; Jọn 17:6) Akara ọzọkwa ga-abụ ịgbaso ihe nlereanya Jisọs n’ikwusa ozi Alaeze Chineke. (Matiu 4:17; 24:14) E nwere nanị otu òtù nke na-erute ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a nile, ya bụ, ndị ahụ zuru ụwa ọnụ na-enwe nkwurịta okwu, ndị a maara dị ka Ndịàmà nke Jehova na-eso ụzọ Kraịst.
18. Akụkụ atọ ndị dị aṅaa nke inwe nkwurịta okwu ka isiokwu ndị na-eso ga-atụle?
18 Otú ọ dị, nkwurịta okwu pụtara inwe ibu ọrụ n’ebe ndị ọzọ nọ. Olee ndị ọ bụ ibu ọrụ ndị Kraịst isoro kwurịta okwu? N’ụzọ bụ isi, e nwere akụkụ atọ ndị Kraịst na-aghaghị ichebara echiche n’ịnọgide na-ahụ na ohere nkwurịta okwu ghere oghe mgbe nile: n’ime ezinụlọ, n’ọgbakọ ndị Kraịst, na n’ozi ubi ndị Kraịst. Isiokwu ndị na-eso ga-eleba anya n’akụkụ ndị a nke isiokwu anyị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Jenesis 15:1; 46:2; Ọnụ Ọgụgụ 8:4; 2 Samuel 7:17; 2 Ihe Emere 9:29; Aịsaịa 1:1; Ezikiel 11:24; Daniel 2:19; Obadaịa 1; Nehum 1:1; Ọrụ 16:9; Mkpughe 9:17.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Ọdachi dị aṅaa pụrụ ịpụta ma ọ bụrụ na e nweghị nkwurịta okwu?
◻ Olee ndị abụọ na-enweghị atụ kachasị n’inwe nkwurịta okwu?
◻ Ụzọ ndị dị aṅaa ka Chineke jiworo mee ihe n’ịgwa mmadụ okwu?
◻ Olee otú Jisọs si dị elu dị ka onye na-enwe nkwurịta okwu?
◻ Ruo ókè ha aṅaa ka ndị Kraịst oge gboo nwere ihe ịga nke ọma n’inwe nkwurịta okwu?
[Foto dị na peeji nke 18]
Dị ka Nna ya nke bi n’eluigwe, Jisọs bụ onye dị obi ebere nke na-enwe nkwurịta okwu