Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 5/1 p. 8-13
  • Bụkuo Jehova Abụ Otuto

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bụkuo Jehova Abụ Otuto
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Pụrụ Isi Too Jehova
  • Ịbụku Jehova Abụ Otuto n’Oge Bible
  • Ịbụ Abụ Otuto​—⁠Akụkụ Dị Mkpa nke Ofufe Anyị
  • Gosi Ekele Maka Ịdị Mma Jehova Site n’Ịbụ Abụ
  • Jirinụ Ọṅụ Na-abụku Jehova Abụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ọnọdụ Egwú n’Ofufe nke Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jiri Abụ Na-eto Jehova
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Bụkuo Jehova Abụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 5/1 p. 8-13

Bụkuo Jehova Abụ Otuto

“Ka m bụkuo Jehova abụ, n’ihi na O biliwo elu nke ukwuu.”​—⁠ỌPỤPỤ 15:1.

1. Ọdịdị na àgwà ndị dị aṅaa nke Jehova na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji too ya?

UGBO iri na atọ Abụ Ọma 150 na-enye iwu ka e too Jehova ma ọ bụ Ja. Amaokwu nke ikpeazụ na-akpọsa, sị: “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Ja. Toonụ Ja.” Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị maara na Jehova kwesịrị ịnara otuto anyị. Ọ bụ Ọkaaka Eluigwe na Ala, Onye Kachasị Ihe Nile Elu, Eze nke mgbe ebighị ebi, Onye Okike anyị, Onye Na-emere Anyị Ihe Ọma. Ọ dịghị onye ya na ya hà, ọ pụrụ iche, o nweghị atụ, o nweghị o yiri, n’ọtụtụ ụzọ. Ọ mazuru ihe nile, nwee ike ime ihe nile, zuo okè n’ikpe, bụrụkwa ịhụnanya n’onwe ya. Ọ bụ nanị ya dị mma; ọ na-eguzosi ike n’ihe. (Luk 18:19; Mkpughe 15:​3, 4) Ò kwesịrị ịnara otuto anyị? O kwesiri nnọọ n’ezie!

2. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji gosipụta ekele nye Jehova?

2 Jehova kwesịrị ịnara ọ bụghị nanị ofufe na otuto anyị kamakwa ekele maka ihe nile o mewooro anyị. Ọ bụ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè.” (Jemes 1:17) Ọ bụ Mmalite, Isi Iyi, nke ndụ nile. (Abụ Ọma 36:9) Ihe nile anyị na-ama ụtọ ha dị ka ndị òtù nke agbụrụ mmadụ sitere n’aka ya, n’ihi na ọ bụ Onye Okike Ukwu anyị. (Aịsaịa 42:5) Ọ bụkwa Onye Na-enye ngọzi ime mmụọ nile na-abịara anyị site na mmụọ ya, nzukọ ya, na Okwu ya. Anyị nwere mgbaghara nke mmehie ná ndabere nke onyinye o nyere Ọkpara ya dị ka ihe mgbapụta. (Jọn 3:16) Anyị nwere olileanya Alaeze ahụ nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Anyị nwere mkpakọrịta dị mma nke anyị na ndị Kraịst ibe anyị. (Ndị Rom 1:​11, 12) Anyị nwere ihe ùgwù na ngọzi nke ịbụ Ndịàmà ya. (Aịsaịa 43:​10-⁠12) Anyị nwekwara ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ekpere. (Matiu 6:​9-⁠13) N’eziokwu, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kelee Jehova!

Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Pụrụ Isi Too Jehova

3. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi too Jehova ma gosipụta obi ekele anyị nye ya?

3 Olee otú anyị, dị ka ndị ji obi ha na-ejere Jehova ozi, pụrụ isi too ya ma gosipụta ekele anyị? Anyị pụrụ ime otú ahụ site n’ikere òkè n’ozi ndị Kraịst​—⁠na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-eme nletaghachi, na-eduzi ọmụmụ Bible, na ikere òkè n’ịgba àmà okporo ama. Anyị pụkwara ito ya site n’ịgba àmà mberede mgbe ọ bụla ọnọdụ nyere ohere ya. Ọzọkwa, anyị pụrụ ito Jehova site n’àgwà anyị ziri ezi, ọbụna site n’ụzọ dị mma n’anya ma kwesị ekwesị anyị si eyi uwe ma na-eji ejiji n’onwe anyị. E towo Ndịàmà Jehova ọtụtụ mgbe n’ihi ịbụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ ndị a. Karịsịa, anyị pụrụ ito Jehova ma kelee ya site n’ekpere.​—⁠Lee 1 Ihe Emere 29:​10-⁠13.

4. Gịnị bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma anyị pụrụ isi too Nna eluigwe anyị nke na-ahụ n’anya?

4 Tụkwasị na nke a, otu n’ime ụzọ kasị mma anyị pụrụ isi too Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya bụ site n’ibuli ya na ịma mma ya nile elu site n’abụ Alaeze ndị na-atọ ụtọ. Ọtụtụ ndị na-eti egwú na ndị na-arọ egwú kwetara na ngwá egwu kasị mma bụ olu mmadụ. Ndị ọkà n’egwú ọdịnala gbalịri ide abụ ihe nkiri n’ihi na e nwere afọ ojuju dị ukwuu n’ige ntị n’olu mmadụ nke e weliri elu n’abụ.

5. N’ihi ihe ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị iji were anyị ịbụ abụ Alaeze n’ihe dị mkpa?

5 Lee ka Jehova na-aghaghị isi na-enwe ọṅụ n’ige ntị ka ndị mmadụ na-abụ abụ, karịsịa mgbe ha na-abụ abụ otuto na ekele! Mgbe ahụ n’ezie, anyị kwesịrị iji ịbụ abụ Alaeze anyị kpọrọ ihe ná nnọkọ anyị dị iche iche​—⁠nzukọ ọgbakọ, mgbakọ sekit, ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, mgbakọ distrikti, na mgbakọ mba nile. Akwụkwọ abụ anyị jupụtara n’abụ ndị bụ abụ olu ụtọ n’ezie, nke ndị nọ n’èzí toworo ịma mma ya ugboro ugboro. Ka anyị na-abanyekwu ná mmụọ nke ịbụ abụ Alaeze, ruo ókè ahụ ka anyị na-ewetara ndị ọzọ obi ụtọ na abamuru nye onwe anyị.

Ịbụku Jehova Abụ Otuto n’Oge Bible

6. Olee otú ndị Israel si gosipụta ekele maka nnapụta ha n’Osimiri Uhie?

6 Okwu Chineke na-agwa anyị na Mosis na ndị Israel ndị ọzọ bụrụ abụ mmeri mgbe a napụtara ha site n’aka ndị agha Fero n’Osimiri Uhie. Abụ ha malitere n’okwu ndị a: “Ka m bụkuo Jehova abụ, n’ihi na O biliwo elu nke ukwuu: ịnyịnya na onye ọ na-ebu, Ọ tụbawo ha n’oké osimiri. Ike m na abụ ọma m ka Ja bụ. O wee ghọọrọ m nzọpụta: Onye a bụ Chineke m, m ga-emekwa Ya ka ọ dị elu.” (Ọpụpụ 15:​1, 2) Anyị pụrụ nnọọ iji uche anyị hụ ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ nke ndị Israel mgbe ha na-abụ okwu ndị ahụ n’abụ mgbe a napụtasịrị ha n’ụzọ ọrụ ebube!

7. Oge ndị ọzọ dị aṅaa bụ́ ndị dị ịrịba ama ka Akwụkwọ Nsọ Hibru dekọrọ banyere ndị Israel ito Jehova n’abụ?

7 Na 1 Ihe Emere 16:​1, 4-⁠36, anyị na-agụ na e toro Jehova site n’ịbụ abụ na site n’ịkpọ ngwá egwu dị iche iche mgbe Devid bubatara Igbe ahụ na Jerusalem. Nke ahụ n’ezie bụ oge ọṅụ. N’oge Eze Solomọn raara ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem nye, a bụkwara abụ otuto nye Jehova ya na egwú e ji ngwá egwú tie. Anyị na-agụ na 2 Ihe Emere 5:​13, 14, sị: “O wee ruo, mgbe ndị na-afụ opi na ndị ọbụ abụ dị ka otu onye, ime ka a nụ otu olu n’ito na ikele Jehova, mgbe ha werekwaara opi na ọja, na ihe abụ, na otuto e ji too Jehova, welie olu ha elu, sị, n’ihi na Ọ dị mma: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị: na igwe ojii jupụtara ụlọ ahụ, bụ́ ụlọ Jehova, ndị nchụàjà wee ghara inwe ike iguzo ije ozi n’ihi igwe ojii ahụ: n’ihi na ebube Jehova jupụtara ụlọ Chineke.” Gịnị ka nke ahụ na-egosi? Na Jehova gere ntị n’abụ otuto nke a, obi tọkwara ya ụtọ na ya, dị ka e gosipụtara site n’igwe ojii ahụ pụrụ iche. E mesịa, e nwere abụ nke òtù ndị ukwe abụọ bụrụ n’oge a na-arara mgbidi Jerusalem nye n’ụbọchị Nehemaịa.​—⁠Nehemaịa 12:​27-⁠42.

8. Gịnị na-egosi na ndị Israel ji ịbụ abụ kpọrọ ihe?

8 N’ezie, ịbụ abụ bụ akụkụ dị oké mkpa nke ofufe n’ụlọ nsọ ahụ nke na e doro 4,000 ndị Livaị iche maka ije ozi n’ihe banyere egwú. (1 Ihe Emere 23:​4, 5) Ndị a ga-esonyere ndị ọbụ abụ. Egwú, karịsịa ndị ọbụ abụ, nwere ọnọdụ dị mkpa n’ofufe, ọ bụghị nanị iji kụbanye akụkụ ndị dị ike nke Iwu ahụ, kama iji mee ka e nwee mmụọ ziri ezi maka ofufe. O nyeere ndị Israel aka ife Jehova n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Rịba ama ndokwa na nlebara anya n’ụmụ irighiri ihe nke e tinyere n’akụkụ nke a: “Ọnụ ọgụgụ ha, tinyere ụmụnne ha, ndị e ziworo abụ a na-abụku Jehova, bụ́ ndị nile nwere nghọta, dị [narị abụọ na iri asatọ na asatọ].” (1 Ihe Emere 25:7) Rịba ama otú ha si jiri ịbụku Jehova abụ otuto kpọrọ ihe. A kụziiri ha ịbụ abụ, ha bụkwa ndị nwere nghọta!

9. Olee otú e si kwusie okwu ike banyere ịbụ abụ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst?

9 Na-erute na narị afọ mbụ nke oge anyị, gịnị ka anyị na-ahụ? Jisọs, n’abalị ahụ a raara ya nye, ọ bụ ezie na o nwere ọtụtụ ihe dị arọ n’uche ya, ka nwekwara mmetụta nke mkpa ọ dị imechi Ememe Ngabiga ọ na-eme na iguzobe Ememe Ncheta nke ọnwụ ya site n’ịbụku Jehova abụ otuto. (Matiu 26:30) Ọzọ, anyị na-agụ na “dị ka n’etiti abalị,” Pọl na Saịlas, mgbe e tisịworo ha ihe, tụọkwa ha mkpọrọ, “na-ekpe ekpere na-abụkukwa Chineke abụ, ndị mkpọrọ wee na-ege ntị n’olu ha.”​—⁠Ọrụ 16:25.

Ịbụ Abụ Otuto​—⁠Akụkụ Dị Mkpa nke Ofufe Anyị

10. Iwu ndị dị aṅaa ka Okwu Chineke na-enye n’ihe banyere ito ya n’abụ?

10 Ọ̀ na-adị gị ma eleghị anya ka ịbụ abụ Alaeze abụkebeghị ihe dị mkpa nye gị iji obi gị chebara ya echiche? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ na i kwesịghị ịtụleghachi okwu ahụ, n’iburu n’uche ịdị mkpa nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst tụkwasịrị n’ịbụ abụ otuto? Leenụ, Okwu Chineke jupụtara n’iwu ka e too Jehova na ịbụ abụ otuto nye ya! Dị ka ihe atụ, n’Aịsaịa 42:10, anyị na-agụ, sị: “Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ, kwusaanụ otuto Ya site ná nsọtụ ụwa; unu ndị na-arịda n’oké osimiri, na újú ya, agwaetiti nile, na ndị bi ha.”​—⁠Leekwa Abụ Ọma 96:1; 98:1.

11. Okwu ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Pọl onyeozi kwuru n’ihe banyere ịbụ abụ?

11 Pọl onyeozi maara na ịbụ abụ pụrụ ịkwalite mmụọ anyị, ya mere ọ gwara anyị okwu ịdọ aka ná ntị ugbo abụọ n’okwu a. Anyị na-agụ ná Ndị Efesọs 5:​18, 19: “Jupụtanụ na Mmụọ Nsọ; na-ewere abụ ọma na ukwe na abụ nke Mmụọ Nsọ gwarịta onwe unu okwu, na-ewere obi unu bụọ abụ kpọọkwa ụbọ nye Onyenwe anyị.” Ná Ndị Kọlọsi 3:16, anyị na-agụ, sị: “Kweenụ ka okwu Kraịst were akụ̀ ya nile biri n’ime unu n’amamihe nile; werenụ abụ ọma na ukwe na abụ nke Mmụọ Nsọ na-ezirịta onwe unu ihe, na-adụrịtakwa onwe unu ọdụ, n’ime amara e nyere unu, na-abụnụ abụ n’ime obi unu nye Chineke.”

12. Ihe atụ ndị dị aṅaa ka anyị nwere nke abụ anyị inyere anyị aka ịkụziri ibe anyị ihe na ịdụ ha ọdụ?

12 Rịba ama na n’ọnọdụ nke ọ bụla Pọl kpọtụghachiri uche gaa n’ịbụ abụ, mgbe o kwuru banyere ‘abụ ọma, ukwe, abụ nke mmụọ nsọ, na-ewere obi unu bụọ abụ.’ Ọzọ, tupu ihe ọ gwara ndị Kọlọsi, o bu ụzọ kwuo na n’ụzọ dị otú a anyị pụrụ ịdị “na-ezirita onwe [anyị] ihe, na-adụrịtakwa onwe [anyị] ọdụ.” Ọ bụ nke ahụ ka anyị na-eme, dị ka a pụrụ ịhụ n’isiokwu dị iche iche nke abụ anyị​—⁠“Atụla Egwu Ha!” (nke 7), “Dị Ike n’Okwukwe!” (nke 17), “Too Jehova, Oké Nkume Ahụ” (nke 22), “Soro M Too Ja!” (nke 81), “N’akụkụ Olileanya Unu, Na-aṅụrịnụ Ọṅụ” (nke 111), iji nye nanị ihe atụ ole na ole. (Abụ ndị dị n’elu sitere n’akwụkwọ abụ nke 1966.)

13. Olee otú “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” siworo gosi ịdị mkpa nke ịbụ abụ dị ka akụkụ nke ofufe anyị?

13 N’ikwekọ n’iwu ndị a, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” emewo ndokwa ka nnọkọ anyị dị iche iche​—⁠nzukọ ọgbakọ, mgbakọ sekit, ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, mgbakọ distrikti, na mgbakọ mba nile⁠—​na-amalite ma na-emechi site n’ịbụ abụ Alaeze. (Matiu 24:45) Tụkwasị na nke a, e mekwara ndokwa ịbụ abụ n’oge ndị ọzọ mgbe nnọkọ ndị a na-aga n’ihu. Ebe ọ bụ na nzukọ anyị dị iche iche na-amalitekarị site n’ịbụ abụ Alaeze, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iwere ya n’ihe dị mkpa irute n’oge, n’ezi oge iji kere òkè n’akụkụ ahụ nke ofufe anyị? Ebe ọ bụkwa na nzukọ ndị a na-emechi site n’ịbụ abụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịnọgide ruo abụ mmechi na ekpere na-esochi ya ozugbo?

14. Ihe atụ ndị dị aṅaa ka anyị nwere nke abụ ndị kwesịrị ekwesị ịbụ ndị a họpụtara maka usoro ihe omume anyị dị iche iche?

14 E ji nlezianya họpụta abụ ndị a na-abụ ná nzukọ anyị ikwekọ n’usoro ihe omume ahụ. Dị ka ihe atụ, ná Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke” na 1993, abụ nke 191, “Mee Eziokwu ahụ nke Gị,” bụ́ nke na-agba ndị Kraịst ume ibuso Setan, ụwa, na anụ ahụ na-ezughị okè agha, sochiri okwu atọ metụtara ndị iro ndị a ozugbo. N’otu aka ahụ, abụ nke 164, “Ụmụ​—⁠Ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa Si n’Aka Chineke,” bụ́ nke jupụtara ná ndụmọdụ nye ndị mụrụ ụmụ, sochiri kpọmkwem otu okwu nke na-akọwapụta ibu ọrụ dịịrị ndị mụrụ ụmụ ịzụ ụmụ ha. Abụ nke 70, “Dị ka Jeremaịa,” butere usoro okwu ndị dabeere n’amụma Jeremaịa ụzọ. Mgbe okwu nke ọtụtụ ndị ga-ekwu banyere akụkụ dị iche iche nke ozi Alaeze anyị gasịkwara, e nwere abụ nke 156, “Achọrọ M,” bụ́ abụ nke metụtara nnọọ ije ozi. E jikwa otu nlezianya ahụ na-ahọpụta abụ nile maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, Nzukọ Ije Ozi, na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọ pụtara na mgbe ndị okenye ga-ekwu okwu ihu ọha ma gosi abụ a ga-eji meghee usoro ihe omume, ha kwesịrị ịhọrọ abụ kwesịrị isiokwu nke okwu ha.

15. Olee otú onye isi oche nke nzukọ pụrụ isi kwalite mmasị maka abụ a gaje ịbụ?

15 Ka a na-ama ọkwa abụ a ga-abụ, onye isi oche pụrụ ime ka e nwekwuo mmasị maka abụ ahụ site n’ịkpọ isiokwu ya. Ọ bụghị nọmba ka anyị na-abụ kama ọ bụ isiokwu Akwụkwọ Nsọ. Ọzọ ọ ga-enyere ọgbakọ aka inwekwu mmasị n’abụ ahụ ma ọ bụrụ na a kpọọ akụkụ akwụkwọ nsọ e depụtara n’okpuru isiokwu ahụ. Mgbe ahụ kwa, a pụrụ ikwu ihe ole na ole, dị ka na mmadụ nile kwesịrị inweta mmetụta nke abụ ahụ.

Gosi Ekele Maka Ịdị Mma Jehova Site n’Ịbụ Abụ

16. Olee otú anyị pụrụ isi nweta mmụọ nke abụ anyị?

16 Ebe ọ bụ na okwu ndị dị n’abụ Alaeze anyị jupụtara ná nghọta, ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị uche n’okwu ndị ahụ ka anyị na-abụ ha. Anyị chọrọ inweta mmetụta nke abụ nke ọ bụla. Ụfọdụ, dị ka ndị metụtara ịhụnanya, mkpụrụ nke mmụọ nsọ, na-eru n’obi. (Ndị Galetia 5:22) Anyị na-eji ume na ikpo ọkụ na-abụ abụ ndị a. Ndị ọzọ na-akpalị ọṅụ, anyị kwesịkwara ịgbalị ịbụ ha n’obi ụtọ. Ndị ọzọ kwa bụ abụ ndị dị ike, ndị e ji azọ ije, e kwesịkwara iji ịnụ ọkụ n’obi na nchekwube siri ike bụọ ha. N’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke anyị, a na-adụ anyị ọdụ igosipụta ikpo ọkụ na mmetụta nakwa ịnụ ọkụ n’obi n’okwu anyị. Igosi ikpo ọkụ, mmetụta, na ịnụ ọkụ n’obi mgbe anyị na-abụ abụ anyị dị mkpa ọbụna karị.

17. (a) Nkatọ dị aṅaa a katọrọ ndị Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi ka anyị na-agaghị achọ ka o metụta ịbụ abụ anyị? (b) Gịnị ga-esi na ya pụta mgbe anyị weere okwu ịdọ aka ná ntị ndị dị n’abụ anyị kpọrọ ihe?

17 Ọ bụrụ na anyị ga-abụ abụ Alaeze anyị ma tụkwasị uche anyị n’ihe ndị ọzọ, ghara ịdị na-enwe nghọta zuru ezu nke ihe okwu ndị ahụ pụtara, ọ̀ bụ na anyị agaghị na-adịtụ ka ndị Israel ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi bụ́ ndị a dọrọ aka ná ntị n’ihi na, ka ha ji egbugbere ọnụ ha na-eto Chineke, obi ha dị anya n’ebe ọ nọ? (Matiu 15:8) Anyị agaghị achọ ka nkatọ ahụ metụta ụzọ anyị si abụ abụ Alaeze, ànyị ga-achọ? Site n’imeso abụ Alaeze anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị, anyị ga-akpali ọ bụghị nanị onwe anyị kamakwa ndị nọ anyị gburugburu, gụnyere ndị na-eto eto. Ee, ọ bụrụ na mmadụ nile na-abụ abụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ewere okwu ịdọ aka ná ntị ndị abụ ndị a bu kpọrọ ihe, nke a ga-abụ ihe agbamume dị ike iji nụọ ọkụ n’obi n’ozi ahụ na izere ọnyà nke omume ọjọọ.

18. Mmetụta dị aṅaa ka ịbụ abụ Alaeze nwere n’ahụ otu nwanyị?

18 Ugboro ugboro, ịbụ abụ Alaeze anyị na-akpali mmasị ndị nọ n’èzí. N’otu mgbe, Ụlọ Nche bipụtara ihe a: “Na ịbụ abụ [anyị] pụkwara iweta ụmụ mmadụ n’ihe ọmụma banyere Jehova Chineke ka e gosipụtara site n’ahụmahụ nke otu nwanyị e mere baptism ná Mgbakọ ‘Mmeri Chineke’ nke 1973 na Yankee Stadium, n’obodo New York. O mewo nleta mbụ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ebe o bi n’enweghị onye kpọrọ ya, ọ nọgidekwara ná nzukọ abụọ ahụ. Ka ọgbakọ ahụ na-abụ abụ . . . ‘Lekwasị Anya Gị n’Ụgwọ Ọrụ Ahụ!,’ okwu ndị ahụ na ụzọ e si na-abụ ha metụrụ ya n’obi nke ukwuu nke na o kpebiri na nke a bụ ebe ọ chọrọ ịnọ. E mesịa o jekwuuru otu n’ime Ndịàmà ahụ ma rịọ maka ọmụmụ Bible, [ọ] malitekwara inwe ọganihu ozugbo ruo n’ịghọ onye Kraịst bụ́ Onyeàmà Jehova.”

19. Agbamume ikpeazụ dị aṅaa ka a na-enye n’ihe banyere anyị ịbụ abụ Alaeze site n’obi dum?

19 N’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná nzukọ anyị nile, e nwere ohere dị nnọọ nta maka ndị na-ege ntị igosipụta mmetụta na ekele ha. Ma anyị nile pụrụ igosipụta mmetụta anyị na-enwe banyere ịdị mma Jehova site n’iji obi anyị sonye n’ịbụ abụ Alaeze. E wezụga nke ahụ, mgbe anyị zukọrọ, ọ̀ bụ na obi adịghị adị anyị ụtọ? Ya mere anyị kwesịrị inwe mkpalị nke ịbụ abụ! (Jemes 5:13) N’ezie, ruo ókè anyị nwere ekele maka ịdị mma Jehova na amara ya na-erughịrị mmadụ, anyị ga-abụ abụ otuto site n’obi dum nye ya.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Olee isi ihe abụọ mere a ga-eji na-eto Jehova?

◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi too Jehova?

◻ Gịnị bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma anyị pụrụ isi too Jehova?

◻ Ihe atụ ndị dị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ ka anyị nwere maka ito Jehova n’abụ?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi bụọ abụ Alaeze anyị n’ụzọ ziri ezi?

[Igbe dị na peeji nke 11]

Nụ Ụtọ Abụ Ndị Ahụ!

O yiri ka ụfọdụ enwewo ihe isi ike ụfọdụ n’ịmụta ụfọdụ n’ime abụ ndị ọhụrụ ahụ. Otú ọ dị, ọgbakọ ụfọdụ enwebeghị oké ihe isi ike ọ bụla n’ịbụ ihe ka n’abụ ndị a. Ma eleghị anya itinyekwu nanị mgbalị dị nta n’ịmụ ihe na-eyi na mbụ ihe a na-amachaghị ama pụrụ ịbụ nanị ihe a chọrọ. Ozugbo a mụtara abụ ndị ahụ, ọgbakọ na-enwekarị mmasị na ha karịa ndị na-eweghị mgbalị ọ bụla n’ịmụta ha. Mgbe ahụ onye ọ bụla n’ime ọgbakọ pụrụ iji obi ike bụọ ha. Ee, ha pụrụ ịnụ ụtọ abụ ndị ahụ!

[Igbe dị na peeji nke 12]

Bụọ Abụ Alaeze ná Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ

Ọ bụghị iwu na anyị ịbụ abụ Alaeze ga-abụrịrị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Pọl na Saịlas bụkuru Jehova abụ otuto mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 16:25) Jemes onyeozi kwukwara, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla nwere obi ụtọ? ya bụọ abụ ọma.” (Jemes 5:13) Ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ onye ọ bụla na-enwe obi ụtọ. Ya mere gịnị mere a gaghị abụ abụ Alaeze? Nke a pụrụ ịdị ụtọ nke ukwuu ma ọ bụrụ na e jiri ngwá egwú piano ma ọ bụ ụbọ akwara kpọọ ya. Ma ọ bụkwanụ, e nwere tepu piano nke abụ Alaeze anyị; ọtụtụ ezinụlọ nke Ndịàmà nwere ọbọ tepu ndị a. Ọ bụghị nanị na ha na-enye aka nke ọma n’iji ha na-abụ abụ kama ha dịkwa mma maka iji mere egwú mara mma nke na-akpọ n’olu dị ala.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Mgbe nnapụta ha n’Osimiri Uhie ahụ gasịrị, Israel gosipụtara ọṅụ ha n’abụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Abụ ọṅụ bụ akụkụ nke ofufe ndị Kraịst taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya