Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 7/15 p. 29-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • “Ike Agwụla Unu n’Obi n’Ime Ihe Ọma”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ịhụ na Ọgbakọ Na-adị n’Udo ma Na-adị Ọcha
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • ‘Na-akwanyerenụ Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike N’etiti Unu Ùgwù’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 7/15 p. 29-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

‘Nrịba ama’ ahụ e kwuru okwu ya ná 2 Ndị Tesalọnaịka 3:14, ọ̀ bụ ihe ọgbakọ na-eme, ka ọ bụ ihe ndị Kraịst n’otu n’otu na-eme iji na-eze ndị isi ike?

Ihe Pọl onyeozi degaara ndị Tesalọnaịka na-egosi na ndị okenye ọgbakọ na-ekere òkè doro anya ná ‘nrịba ama’ dị otú ahụ. Otú ọ dị, ndị Kraịst n’otu n’otu na-emesị sonyere ha, na-eburu nzube ime mmụọ n’uche n’ime otú ahụ. Anyị pụrụ ịghọta nke a n’ụzọ kasị mma site n’ịtụle ọnọdụ kpatara Pọl ji nye ndụmọdụ ahụ.

Pọl nyere aka iguzobe ọgbakọ Tesalọnaịka, na-enyere ndị ikom na ndị inyom aka ịghọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 17:1-4) Mgbe e mesịrị, o si na Kọrint degara ha akwụkwọ iji jaa ha mma ma gbaa ha ume. Pọl nyekwara ndụmọdụ dị mkpa. Ọ gbara ha ume ‘ịnọdụ nwayọọ, ime ihe nile nke aka ha, na iji aka ha rụọ ọrụ.’ Ụfọdụ anọghị na-eme otú ahụ, ya mere Pọl gbakwụnyere, sị: “Anyị na-arịọ unu, ụmụnna anyị, na-adụnụ ndị na-adịghị agazi ije ọdụ, na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka.” N’ụzọ doro anya, e nwere ndị “na-adịghị agazi ije”a n’etiti ha bụ́ ndị ndụmọdụ dị mkpa.—1 Ndị Tesalọnaịka 1:2-10; 4:11; 5:14.

Ọnwa ụfọdụ mgbe e mesịrị, Pọl degaara ndị Tesalọnaịka akwụkwọ ozi ya nke abụọ, na-ekwu ihe ndị ọzọ banyere ọnụnọ Jisọs n’ọdịnihu. Pọl nyekwuru nduzi banyere otú a ga-esi mesoo ndị na-adịghị agazi ije bụ́ ndị ‘na-adịghị arụ ọrụ, kama na-etinye aka n’ọrụ nke na-abụghị nke aka ha.’ Omume ha dị iche ma n’ihe nlereanya Pọl setịpụrụ dị ka onye na-arụsi ọrụ ike ma n’iwu doro anya o nyere banyere mmadụ ịrụ ọrụ iji kwado onwe ya. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:7-12) Pọl nyere ntụzi ka a gbasoo nzọụkwụ ụfọdụ. A na-ewere nzọụkwụ ndị a mgbe ndị okenye mesịwororị ihe ha na-eme n’ịgba ndị ahụ na-adịghị agazi ije ume ma ọ bụ n’ịdụ ha ọdụ. Pọl dere, sị:

“Ma anyị na-enye unu iwu, ụmụnna anyị, . . . ka unu na-eze nwanna ọ bụla na-adịghị agazi ije, ọ dịghị ejekwa dị ka ozizi ahụ e nyere n’aka ha idebe nke ha natara n’aka anyị. Ma unu onwe unu, ụmụnna anyị, ike agwụla unu n’obi n’ime ihe ọma. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla aṅaghị ntị okwu anyị ji akwụkwọ ozi a kwuo, rịbanụ onye ahụ ama, ka unu ghara iso ya mekọọ ihe, ka e wee mee ya ihe ihere n’ihu. Unu agụkwala ya n’onye iro, kama na-adụnụ ya ọdụ dị ka nwanna.”—2 Ndị Tesalọnaịka 3:6, 13-15.

Ya mere nzọụkwụ ndị ọzọ ahụ gụnyere izere ndị na-adịghị agazi ije, ịrịba ha ama, ịkwụsị iso ha na-akpakọrịta, ma na-adụ ha ọdụ dị ka ụmụnna. Gịnị ga-eduga ndị òtù ọgbakọ iwere nzọụkwụ ndị ahụ? Dị ka ihe enyemaka iji ghọta nke a, ka anyị kọwaa ọnọdụ atọ Pọl na-adịghị ekwu banyere ha n’ebe a.

1. Anyị maara na ndị Kraịst ezughị okè, ha nwekwara adịghị ike. Ma, ịhụnanya bụ akara e ji amata ezi Iso Ụzọ Kraịst, na-achọ ka anyị na-egosi nghọta ma na-agbaghara ihie ụzọ nke ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst pụrụ iwe oké iwe bụ́ nke na-adịghị emekarị, dị ka nke mere n’etiti Banabas na Pọl. (Ọrụ 15:36-40) Ma ọ bụ n’ihi ike ọgwụgwụ, mmadụ pụrụ ikwu okwu ndị dị ike na ndị na-afụ ụfụ. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, site n’igosipụta ịhụnanya na itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ, anyị pụrụ ikpuchi njehie ahụ, nọgide na-eso onye Kraịst ibe anyị na-ebikọ, na-akpakọrịta, ma na-arụkọ ọrụ. (Matiu 5:23-25; 6:14; 7:1-5; 1 Pita 4:8) N’ụzọ doro anya, mmejọ ndị dị otú a abụghị ihe Pọl na-ekwu banyere ha ná 2 Ndị Tesalọnaịka.

2. Pọl adịghị ekwu banyere ọnọdụ ebe onye Kraịst họọrọ n’onwe ya ịkpara mmekọrịta nke ya na onye Kraịst ọzọ ókè bụ́ onye ụzọ ma ọ bụ omume ya na-adịghị mma—dị ka ihe atụ, onye o yiri ka ọ na-elekwasị anya ná ntụrụndụ ma ọ bụ n’ihe onwunwe gabiga ókè. Ma ọ bụ, nne ma ọ bụ nna pụrụ ịkpa ókè ná mkpakọrịta nke nwa ya na ụmụaka ndị na-adịghị erubere nne na nna ha isi, ndị na-egwu egwu n’ụzọ aghara ma ọ bụ n’ụzọ dị ize ndụ, ma ọ bụ ndị na-ejighị Iso Ụzọ Kraịst akpọrọ ihe. Ndị ahụ bụ nnọọ mkpebi onwe onye ndị kwekọrọ n’ihe anyị na-agụ n’Ilu 13:20: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Tụlee 1 Ndị Kọrint 15:33.

3. N’akụkụ ọzọ dị ike, Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ banyere onye na-eme mmehie dị oké njọ nke na-enweghịkwa nchegharị. E kwesịrị iwepụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị dị otú ahụ n’ọgbakọ. A ghaghị iwere “ajọ” onye ahụ nyefee Setan, dị ka a pụrụ ikwu ya. Mgbe nke a gasịrị, ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe agaghị eso ndị ọjọọ dị otú ahụ mekọọ ihe; Jọn onyeozi gbara ndị Kraịst ume ịghara ọbụna ikele ha. (1 Ndị Kọrint 5:1-13; 2 Jọn 9-11) Otú ọ dị, nke a ekwekọghịkwa na ndụmọdụ ahụ dị ná 2 Ndị Tesalọnaịka 3:14.

Nke dị iche n’ọnọdụ atọ ahụ dị n’elu bụ nke ahụ metụtara ndị “na-adịghị agazi ije” dị ka e kwuru ná 2 Ndị Tesalọnaịka. Pọl dere na ndị a ka bụ ‘ụmụnna,’ ndị a ga-adụ ọdụ ma mesoo ihe n’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ. N’ihi ya, nsogbu nke ụmụnna ahụ “na-adịghị agazi ije” abụghị n’ọnọdụ nke okwu nkịtị dị n’etiti ndị Kraịst abụọ, o rughịkwa ihe ndị okenye ọgbakọ ga-eji bata na ya site n’ịchụpụ ha n’ọgbakọ, dị ka Pọl mere banyere ọnọdụ ahụ rụrụ arụ dị na Kọrint. Ikpe mmehie dị oké njọ amaghị ndị ahụ “na-adịghị agazi ije,” dị ka ọ mara nwoke ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ na Kọrint.

Ikpe nke isi n’Iso Ụzọ Kraịst kpafuo n’ụzọ dị ịrịba ama mara ndị ahụ “na-adịghị agazi ije” na Tesalọnaịka. Ha adịghị arụ ọrụ, ma ọ́ bụghị n’ihi na ha chere na nlọghachi Kraịst dị nso ọ bụrụ n’ihi na ha dị umengwụ. Ọzọkwa, ha nọ na-akpasu oké ọgba aghara site ‘n’itinye aka n’ọrụ nke na-abụghị nke aka ha.’ Ma eleghị anya, ndị okenye ọgbakọ enyewo ha ndụmọdụ ugboro ugboro, n’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl nyere n’akwụkwọ ozi mbụ ya nakwa na ndụmọdụ ndị ọzọ sitere n’aka Chineke. (Ilu 6:6-11; 10:4, 5; 12:11, 24; 24:30-34) Ma ha nọgidere n’ụzọ nke wetaara ọgbakọ ahụ aha ọjọọ, nke pụkwara imetụta ndị ọzọ bụ́ ndị Kraịst. Ya mere, n’akpọghị ndị ahụ aha, onye Kraịst bụ́ okenye bụ́ Pọl kwupụtara agazighị ije ha n’ihu ọha, na-ekpughe ụzọ ọjọọ ha.

O mekwara ka ọgbakọ ahụ mara na o kwesịrị ekwesị ka ha, dị ka ndị Kraịst n’otu n’otu, ‘rịba ndị ahụ na-adịghị agazi ije ama.’ Nke a pụtara na ndị mmadụ n’otu n’otu kwesịrị ịrịba ndị ahụ omume ha kwekọrọ n’ụzọ ahụ a maara ọgbakọ ọkwa n’ihu ọha banyere ya ama. Pọl dụrụ ọdụ ka ha “na-eze nwanna ọ bụla na-adịghị agazi ije.” N’ezie, nke ahụ enweghị ike ịpụta izere onye dị otú ahụ kpam kpam, n’ihi na ha ka ga ‘na-adụ ya ọdụ dị ka nwanna.’ Ha ga-anọgide na-eso ya enwe mkpakọrịta ndị Kraịst ná nzukọ na ma eleghị anya n’ozi. Ha pụrụ inwe olileanya na nwanna ha ga-anabata ndụmọdụ e nyere ya ma gbahapụ ụzọ ya ndị na-akpata nsogbu.

N’echiche dị aṅaa ka ha ga “na-eze” ya? Ihe àmà na-egosi na nke a bụ n’ọnọdụ mmekọrịta ọha na eze. (Tụlee Ndị Galetia 2:12.) Ha ịkwụsị iso ya na-enwe mmekọrịta ọha na eze na ntụrụndụ pụrụ igosi ya na ụzọ ya amasịghị ndị ụkpụrụ na-eduzi. Ọ bụrụgodị na ihere emeghị ya, ọ gbanweekwa, ma ọ dịghị ihe ọzọ o yikarịghị ka ndị ọzọ hà ga-amụta ụzọ ya ma mewe ka ya. N’otu mgbe ahụ, ndị Kraịst a n’otu n’otu kwesịrị itinye uche ha n’ihe ndị na-ewuli elu. Pọl na-adụ ha ọdụ, sị: “Ma unu onwe unu, ụmụnna anyị, ike agwụla unu n’obi n’ime ihe ọma.”—2 Ndị Tesalọnaịka 3:13.

N’ụzọ doro anya, ndụmọdụ onyeozi a abụghị ihe ndabere maka ileda ụmụnna anyị ndị mere obere mmehie anya ma ọ bụ na-ekpe ha ikpe. Kama nke ahụ, nzube ya bụ iji nyere onye na-agbaso ụzọ na-akpata nsogbu bụ́ nke megidere nnọọ Iso Ụzọ Kraịst, aka.

Pọl enyeghị ọtụtụ iwu dị ka a ga-asị na ọ na-anwa iguzobe ụkpụrụ dị mgbagwoju anya. Ma o doro anya na ndị okenye kwesịrị ibu ụzọ nye onye na-adịghị agazi ije ndụmọdụ ma gbalịa inyere ya aka. Ọ bụrụ na ha enweghị ihe ịga nke ọma, onye ahụ akpọchiekwa ntị na-aga n’ụzọ ahụ na-akpata nsogbu nke pụkwara ịgbasa agbasa, ha pụrụ ikpebi na e kwesịrị ime ka ọgbakọ mara. Ha pụrụ ime ndokwa maka okwu dabeere n’ihe mere a ga-eji zere agazighị agazi dị otú ahụ. Ha agaghị akpọ mmadụ aha, ma okwu ịdọ aka ná ntị ha ga-enye aka ichebe ọgbakọ n’ihi na ndị na-erube isi ga-elezikwu anya ịkpa ókè n’ihe omume ọha na eze ndị ha so mmadụ ọ bụla nke na-egosipụta n’ụzọ doro anya agazighị ije dị otú ahụ, na-enwe.

E nwere olileanya na ka oge na-aga, ihere ga-eme onye ahụ na-adịghị agazi ije, a ga-akpalikwa ya ịgbanwe. Ka ndị okenye na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-ahụ mgbanwe ahụ, ha pụrụ ikpebi ịkwụsị ịkpa ókè ahụ ha na-akpa n’iso ya na-emekọ ihe.

Mgbe ahụ, ná nchịkọta: Ndị okenye ọgbakọ na-ebute ụzọ n’inye aka nakwa n’inye ndụmọdụ ma ọ bụrụ na mmadụ adịghị agazi ije. Ọ bụrụ na ọ hụghị ihe dị njọ n’ụzọ ya ma nọgide na-enwe mmetụta na-adịghị mma, ndị okenye pụrụ ịdọ ọgbakọ aka ná ntị site n’okwu na-eme ka echiche Bible doo anya—ma ọ̀ bụ iso onye na-ekweghị ekwe eme mkpapụ, ma ọ bụ ihe ọ bụla omume ọjọọ ahụ bụ. (1 Ndị Kọrint 7:39; 2 Ndị Kọrint 6:14) Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị e si otú a gbaara àmà, pụrụ ikpebi n’otu n’otu ibelata iso ụdị ndị ahụ o doro anya na ha adịghị agazi ije ma ka bụrụ ụmụnna, na-akpakọrịta.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a E ji okwu Grik ahụ mee ihe banyere ndị agha bụ́ ndị na-agbasoghị usoro ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị, nakwa banyere ndị ụjọ akwụkwọ, ndị na-esoghị mụọ ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ ha.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-adụ ndị na-adịghị agazi ije ọdụ ma ka na-ele ha anya dị ka ndị kwere ekwe ibe ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya