Isi nke 16
Ndị Ịnyịnya Anọ Na-agbafe!
Ọhụụ 3—Mkpughe 6:1-17
Isiokwu: Mgbafe nke ndị ịnyịnya anọ ahụ, ndịàmà ahụ e gburu n’ihi okwukwe ha, ndị nọ n’okpuru ebe ịchụ àjà ahụ, na oké ụbọchị ahụ nke iwe
Oge mmezu ya: Site na 1914 ruo mbibi nke usoro ihe nke a
1. Olee ụzọ Jehova si kpugheere Jọn ihe dị n’ime akwụkwọ ahụ na-akpali mmasị nke Jisọs meghere?
N’OGE ihe isi ike nke a, ọ̀ bụ na anyị enweghị oké mmasị ‘n’ihe na-aghaghị ịpụta n’isi nso’? N’ezie, anyị nwere, n’ihi na o metụtara anyị onwe anyị! N’ihi ya, ka anyị soro Jọn mgbe Jisọs gara n’ihu imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ na-akpali mmasị. E kwesịrị ịrịba ama na ọ dịghị mkpa ka Jọn gụọ ya n’onwe ya. Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? N’ihi na e mere ka ọ mata ihe ndị dị n’ime ya ‘n’ihe ịrịba ama’ site n’ọtụtụ ọnọdụ ihe nkiri ndị jupụtara n’ihe omume.—Mkpughe 1:1, 10.
2. (a) Gịnị ka Jọn hụrụ, nụkwa, gịnịkwa ka ọdịdị cherub ahụ na-ezo aka na ya? (b) Ònye ka cherub nke mbụ ahụ kpọrọ òkù, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka i ji zaa otú ahụ?
2 Gee Jọn ntị mgbe Jisọs na-emeghe akara nke mbụ dị n’akwụkwọ ahụ: “M wee hụ mgbe Nwa Atụrụ ahụ saghere otu n’ime akara asaa ahụ, m wee nụ otu n’ime ihe anọ ahụ nke dị ndụ, ka ọ na-asị, dị ka à ga-asị na o ji olu égbè eluigwe na-ekwu, sị, Bịa.” (Mkpughe 6:1) Nke a bụ olu cherub nke mbụ ahụ. Ọdịdị ya yiri nke ọdụm ga-egosi Jọn na nzukọ Jehova ga-eji obi ike mee ihe n’imezu ikpe ezi omume Ya. Ònyekwa ka a kpọrọ òkù ahụ? Ọ pụghị ịbụ Jọn, n’ihi na a kpọworị Jọn òkù ikiri ọnọdụ amụma ndị a. (Mkpughe 4:1) ‘Olu ahụ nke yiri olu égbè eluigwe’ na-akpọku ndị ọzọ ga-ekere òkè na nke mbụ n’ihe omume anọ na-akpali akpali.
Ịnyịnya Ọcha ahụ na Onye Ebube nke Na-anọkwasị Ya
3. (a) Gịnị ka Jọn na-akọwa ugbu a? (b) N’ikwekọ n’ihe atụ Bible, gịnị ka ịnyịnya ọcha ahụ na-aghaghị ise onyinyo ya?
3 Jọn, ya na òtù Jọn ahụ na-anụ ọkụ n’obi na ndị na-esonyere ha taa, nwere ihe ùgwù nke ịhụ otu ihe nkiri nke na-aga ngwa ngwa! Jọn na-asị: “M wee hụ, ma lee, ịnyịnya ọcha, onye na-anọkwasị ya nwekwara ụta; e wee nye ya okpueze: o wee pụta na-emeri, ya na ka o wee merie.” (Mkpughe 6:2) Ee, ná nzaghachi nye òkù ahụ dara dị ka égbè eluigwe nke sịrị, “Bịa!” otu ịnyịnya ọcha gbapụtara. N’ime Bible, ịnyịnya na-abụkarị ihe atụ nke ibu agha. (Abụ Ọma 20:7; Ilu 21:31; Aịsaịa 31:1) Ịnyịnya nke a, nke na-aghaghị ịbụ oké ịnyịnya mara mma, na-acha ọcha n’ụzọ na-egosi ịdị nsọ na-enweghị ntụpọ. (Tụlee Mkpughe 1:14; 4:4; 7:9; 20:11.) Lee nnọọ ka nke a si kwesị ekwesị, n’ihi na ọ na-egosi ibu agha nke dị ọcha, bụrụkwa nke ezi omume n’anya dị nsọ nke Jehova!—Leekwa Mkpughe 19:11, 14.
4. Ònye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ? Kọwaa.
4 Ònye bụ Onye Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke a? O ji ụta, bụ́ ihe e ji ebu agha, ma e nyekwara ya okpueze. Nanị ndị ezi omume a hụrụ ka ha kpu okpueze n’ime ụbọchị Onyenwe anyị bụ Jisọs na òtù ahụ nke 24 ndị okenye nọchitere anya ha. (Daniel 7:13, 14, 27; Luk 1:31-33; Mkpughe 4:4, 10; 14:14)a O yighị ihe kwere omume na a ga-ese onyinyo nke otu n’ime ìgwè 24 ndị okenye ahụ ịnata okpueze nke ya site n’iru eru nke onwe ya. N’ihi nke a, onye ahụ na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke a hụrụ nanị ya aghaghị ịbụ Jisọs Kraịst, ọ dịghịkwa onye ọzọ ọ bụ. Jọn hụrụ ya n’eluigwe n’oge ahụ oké ihe mere na 1914 mgbe Jehova kwuru, sị, “Mụ onwe m emewo ka eze m guzosie ike,” kọwapụtakwa nzube ya na “aga m enye gị mba nile ka ha bụrụ ihe nketa gị.” (Abụ Ọma 2:6-8)b Otú a, n’imeghe akara nke mbụ ahụ, Jisọs na-ekpughe otú ya onwe ya, dị ka Eze ahụ e kpubere okpueze ọhụrụ, si na-agbaga ibu agha n’oge Chineke kara aka.
5. Olee ụzọ onye ọbụ abụ ahụ si kọwaa Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya n’ụzọ yiri Mkpughe 6:2?
5 Ọnọdụ ihe nkiri nke a kwekọrọ nnọọ nke ọma n’Abụ Ọma 45:4-7, nke a bụrụ nye Eze ahụ Jehova dokwasịworo n’ocheeze: “N’ịma mma gị nọkwasị n’elu ịnyịnya gaa nke ọma, n’ihi eziokwu na umeala n’obi na ezi omume: aka nri gị ga-ezikwa gị ihe dị iche iche dị egwu. Àkụ́ gị nile bụ ihe dị nkọ; ndị nile dị iche iche na-ada n’okpuru gị; akụ gị dị n’obi ndị iro eze. Ocheeze gị, Chineke, na-adịru mgbe nile ebighị ebi: mkpanaka eze nke izi ezi ka mkpanaka eze nke alaeze gị bụ. Ị hụwo ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị: n’ihi nke a Chineke, bụ́ Chineke gị, tere gị mmanụ obi ụtọ n’isi karị ndị ibe gị.” Ebe Jọn maara nkọwa amụma ahụ nke ọma, ọ ga-aghọta na o metụtara ọrụ Jisọs dị ka Eze.—Tụlee Ndị Hibru 1:1, 2, 8, 9.
Ịga n’Ihu Na-enwe Mmeri
6. (a) N’ihi gịnị ka Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya na-aghaghị ịga n’ihu inwe mmeri? (b) Ruo ogologo oge hà aṅaa ka ọ ga-anọgide na-enwe mmeri?
6 Ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka Eze ahụ e kpubere okpueze ọhụrụ na-aghaghị ije agha? Ọ bụ n’ihi na e guzobere ọbụbụeze ya n’ihu oké mmegide sitere n’aka onyeisi ndị iro Jehova, Setan bụ́ Ekwensu, na ndị nọ n’elu ụwa ndị—ma hà maara ma ọ bụ na ha amaghị—na-emezu nzube Setan. Ọmụmụ nke Alaeze ahụ n’onwe ya mere ka e buo otu nnukwu agha n’eluigwe. Mgbe ọ na-ebu agha n’aha ahụ bụ́ Maịkael (nke pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”), Jisọs meriri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, tụdakwa ha n’elu ala. (Mkpughe 12:7-12) Ọgịga Jisọs na-aga n’ihu inwe mmeri nọgidere gabiga afọ iri ndị mbụ nke ụbọchị Onyenwe anyị mgbe a nọ na-achịkọta ụmụ mmadụ ndị yiri atụrụ. Ọ bụ ezie na ụwa dum ka na-atọgbọkwa “n’aka ajọ onye ahụ,” Jisọs nọgidere jiri ịhụnanya na-elekọta ụmụnna ya ndị e tere mmanụ na ndị na-esonyere ha, na-enyere nke ọ bụla n’ime ha aka inwe mmeri nke okwukwe.—1 Jọn 5:19.
7. Mmeri dịgasị aṅaa ka Jisọs nweworo n’ime iri afọ ndị mbụ nke ụbọchị Onyenwe anyị, gịnị kwesịkwara ịbụ mkpebi anyị?
7 Mmeri ndị ọzọ dị aṅaa ka Jisọs nweworo n’ihe karịrị afọ 90 gara aga nke ụbọchị Onyenwe anyị ahụ? Gburugburu ụwa, n’otu n’otu nakwa dị ka otu ọgbakọ, ndị Jehova enwewo ọtụtụ ihe isi ike, nrụgide, na mkpagbu, ndị yiri ndị ahụ Pọl onyeozi kọwara mgbe ọ na-enye ihe nnwapụta maka ọnọdụ ya dị ka onyeozi. (2 Ndị Kọrint 11:23-28) Karịsịa n’oge agha na ime ihe ike, ọ dịwo Ndịàmà Jehova mkpa inwe “ọkịka nke ike” ka ha wee nwee ntachi obi. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ma ọbụna n’ọnọdụ ihe isi ike kasị ukwuu, Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi enwewo ike ikwu dị ka Pọl kwuru, sị: “Onyenwe anyị guzoro m nso, wee mee ka m dị ike; ka e wee were ọnụ m kwusazuo nkwusa ahụ.” (2 Timoti 4:17) Ee, Jisọs nwere mmeri n’ihi ha. Ọ ga-anọgidekwa na-aga n’ihu n’inwe mmeri n’ihi anyị, ọ bụrụhaala na anyị kpebisiri ike inwezu mmeri nke okwukwe anyị.—1 Jọn 5:4.
8, 9. (a) Ná mmeri dịgasị aṅaa ka ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova kereworo òkè? (b) N’olee ebe ka ito eto nke Ndịàmà Jehova pụtakarịsịworo ìhè?
8 Ọgbakọ Ndịàmà Jehova zuru ụwa ọnụ ekerewo òkè n’ọtụtụ mmeri n’okpuru nduzi nke Eze ya na-emeri emeri. N’ụzọ pụtara ìhè o chebere Ndị Mmụta Bible ndị a ka a ghara ikpochapụ ha na 1918, mgbe òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Setan ‘meriri’ ha onwe ha ruo nwa oge. Otú ọ dị, na 1919, o tijisịrị ihe mkpọchi ụlọ mkpọrọ iji napụta ha, wee nye ha ume ikwusa ozi ọma ahụ “ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—Mkpughe 13:7; Ọrụ 1:8.
9 Tupu na n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, mba ndị ọchịchị aka ike ahụ nọ n’òtù Axis nwara ikpochapụ Ndịàmà Jehova n’ọtụtụ mba ebe ndị ndú okpukpe, karịsịa ndị nke Roman Katọlik, nyere ndị ọchịchị nchigbu ahụ nkwado pụtara ìhè ma ọ bụ nke na-apụtachaghị ìhè. Ma, 71,509 Ndịàmà ahụ na-ekwusa ozi ọma mgbe agha ahụ malitere na 1939 ruru 141,606 n’ọgwụgwụ ya n’afọ 1945, ọ bụ ezie na ihe karịrị 10,000 anọwo ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, e gbukwara ihe dị ka 2,000 mmadụ. Ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà gburugburu ụwa amụbawo ruo ihe karịrị nde mmadụ isii taa. E nwewo ito eto pụtara ìhè ná mba ndị bụ́ nke ndị Katọlik na ná mba ndị e nweburu mkpagbu siri oké ike—dị ka Germany, Itali, na Japan, bụ́ ebe ndị e nwere ugbu a ngụkọta nke Ndịàmà karịrị nnọọ 600,000 ndị na-arụsi ọrụ ike n’ozi ubi.—Aịsaịa 54:17; Jeremaịa 1:17-19.
10. Mmeri dịgasị aṅaa ka Eze ahụ na-enwe mmeri jiworo gọzie ndị ya “n’ime ngọpụ nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike”?
10 Eze anyị nke na-enwe mmeri agọziwokwa ndị ya na-anụ ọkụ n’obi site n’iduje ha n’ọtụtụ mmeri dị iche iche “n’ime ngọpụ nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike” n’ụlọikpe dị iche iche na n’ihu ndị ọchịchị. (Ndị Filipaị 1:7; Matiu 10:18; 24:9) E mewo nke a ná mba dị iche iche—n’Australia, Argentina, Canada, Gris, India, Swaziland, Switzerland, Turkey, na ná mba ndị ọzọ. N’ụfọdụ n’ime ikpe 50 e kpelaara Ndịàmà Jehova n’Ụlọikpe Kasi Elu nke United States, e nwewo ndị kwadoro ihe ruuru mmadụ ikwusa ozi ọma ahụ ‘n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ’ na ịjụ ikere òkè n’ememe ọchịchị ndị metụtara ikpere arụsị. (Ọrụ 5:42; 20:20; 1 Ndị Kọrint 10:14) Otú a, e meghewo ụzọ iji gbasapụ àmà ahụ a na-agba n’ụwa nile.
11. (a) Olee otú Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ahụ si ‘enwezu mmeri ya’? (b) Mmetụta dị aṅaa ka mmeghe nke akara nke abụọ, nke atọ, na nke anọ, kwesịrị inwe n’ebe anyị nọ?
11 Olee otú Jisọs si ‘enwezu mmeri ya’?c Ọ na-eme nke a, dị ka anyị ga-ahụ, site n’ibibi okpukpe ụgha, e mesịa ọ ga-atụba akụkụ nile fọdụrụ afọdụ ná nzukọ Setan a na-ahụ anya “n’ime ọdọ ọkụ” ihe atụ ahụ nke mbibi, iji wepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta. Anyị ji obi ike na-elepụ anya ugbu a gaa n’ụbọchị ahụ n’Amagedọn, mgbe ‘Eze anyị kasị ndị eze nile’ ga-enwe mmeri ikpeazụ megide nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị mmegbu nke Setan! (Mkpughe 16:16; 17:14; 19:2, 14-21; Ezikiel 25:17) Ka ọ dị ugbu a, Onye Mmeri ahụ a na-apụghị imeri emeri nke na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ nọgidere na-aga n’ihu ka Jehova nọgidekwara na-akpọbata ndị nwere obi eziokwu ná mba ezi omume Ya dị n’elu ala. (Aịsaịa 26:2; 60:22) Ị̀ na-esoro òtù Jọn ahụ e tere mmanụ na-ekere òkè n’ọrụ mgbasa Alaeze ahụ na-enye ọṅụ? Ya bụrụ otú ahụ, ihe Jọn onyeozi hụrụ mgbe e meghere akara atọ ndị ọzọ ahụ aghaghị ịkpali gị ikere òkè dị ukwuu ọbụna karị n’ọrụ Jehova maka ụbọchị anyị.
Lee, Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ!
12. Gịnị ka Jisọs kwuru na ọ ga-aka akara ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya dị ka Eze?
12 Mgbe ije ozi Jisọs n’elu ala na-eru ọgwụgwụ ya, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, jụọ ya, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a?” Ná nzaghachi, o buru amụma banyere ọdachi ndị ga-abụ “mmalite ihe mgbu.” Jisọs kwuru, sị: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ala ọma jijiji ga-adịkwa, oké ụnwụ na ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche; ihe dị egwu na ihe ịrịba ama ukwu ga-adịkwa site n’eluigwe.” (Matiu 24:3, 7, 8, NW; Luk 21:10, 11) Ihe ndị Jọn hụrụ mgbe e meghere akara ndị nke fọdụrụnụ nke akwụkwọ ahụ na-egosi ihe kwesịrị ịrịba ama ndị kwekọrọ n’amụma ahụ. Lee anya ugbu a ka Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube na-emeghe akara nke abụọ!
13. Ọdịiche dị aṅaa gaje ịpụta ìhè nye Jọn ugbu a?
13 “Mgbe ọ saghekwara akara nke abụọ, m wee nụ ihe nke abụọ ahụ nke dị ndụ, ka ọ na-asị, Bịa.” (Mkpughe 6:3) Ọ bụ cherub nke abụọ ahụ, nke yiri oké ehi, na-akpọ òkù ahụ. Ike bụ àgwà nke e gosipụtara n’ebe a, kama ọ bụ ike nke e ji mee ihe n’ụzọ ezi omume. Otú ọ dị, n’ụzọ megidere nke a, ihe Jọn hụrụ ugbu a bụ ngosipụta nke ike na-ebibi ihe, na-ewetakwa ọnwụ.
14. Ịnyịnya ọzọ dị aṅaa na onye na-anọkwasị n’elu ya ka Jọn hụrụ, gịnịkwa ka ọhụụ nke a sere onyinyo ya?
14 N’ihi nke a, olee ụzọ e si zaghachi ọkpụkpọ òkù ahụ bụ “Bịa”? Ọ bụ n’ụzọ nke a: “Ịnyịnya ọzọ wee pụta, bụ ịnyịnya nke na-acha ọkụ ọkụ: e wee nye onye na-anọkwasị ya ike ịnapụ udo n’ụwa, ya na ka ha wee gburita onwe ha: e wee nye ya oké mma agha.” (Mkpughe 6:4) Nke a bụ n’ezie ọhụụ ihe ọjọọ! Ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya banyere ihe o sere onyinyo ya: agha! Ọ bụghị agha ezi omume na-eweta mmeri nke Eze ahụ Jehova họpụtaworo nke na-enwe mmeri, kama ọ bụ mburịta agha nke mba nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, nke na-akpata mwụfu ọbara na ihe mgbu na-enweghị isi. Lee ka o si kwesị ekwesị na onye nke a na-anọkwasị n’elu ịnyịnya na-acha ọkụ ọkụ!
15. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịchọ ka e nwee ihe jikọrọ anyị na onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke abụọ nke a?
15 O doro anya na Jọn agaghị achọ ka e nwee ihe ọ bụla jikọrọ ya na onye ịnyịnya nke a na ajọ ngabiga ya, n’ihi na e buwo amụma banyere ndị Chineke, sị: “Ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4) Ọ bụ ezie na ha ka nọ ‘n’ime ụwa,’ Jọn, ọ bụrụkwa na a gbasawanye okwu ahụ, òtù Jọn na oké ìgwè mmadụ ahụ nke oge a, ‘abụghị akụkụ’ nke usoro ihe nke a ọbara metọsịworo. Ihe agha anyị bụ nke ime mmụọ, nke ‘Chineke mekwara ka ha dị ike’ iji na-arụsi ọrụ ike n’ikwusa eziokwu ahụ, n’etinyeghị aka n’ibu agha anụ ahụ.—Jọn 17:11, 14; 2 Ndị Kọrint 10:3, 4.
16. Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka e nyere onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ahụ na-acha ọkụ ọkụ “oké mma agha”?
16 E nwewo ọtụtụ agha tupu 1914, bụ́ afọ mgbe Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha natara okpueze ya. Ma ugbu a, a na-enye onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ahụ na-acha ọkụ ọkụ “oké mma agha.” Gịnị ka nke a pụtara? Malite ná ntiwapụ nke Agha Ụwa Mbụ, mburịta agha ụmụ mmadụ ghọrọ nke a na-awụfu ọbara ka ukwuu na ya, na-ebibi ihe karịa otú ọ bụla e meworo na mbụ. N’oge dị n’agbata 1914 ruo 1918, e jiri oké mgbukpọ, ụgbọ agha tank, ikuku e tinyere nsí, ụgbọ elu, ụgbọ okpuru mmiri, nnukwute égbè, na égbè ndị na-agba n’akwụsịghị akwụsị mee ihe, ma ọ bụghị nke mbụ ya, ọ bụrụ na e jiri ha mee ihe n’ókè a na-ejibeghị ha mee na mbụ. N’ihe dị ka 28 mba, e nubanyere ndị dum bi n’ime ha, ọ bụghị nanị ndị ọrụ ha bụ ibu agha, ịbanye n’ọrụ agha. Ọnụ ọgụgụ ndị e gburu egbu na ndị e merụrụ ahụ hiri nne nke ukwuu. E gburu ihe karịrị nde ndị agha itoolu, ọnụ ọgụgụ ndị nkịtị e gburu egbu ma ọ bụ merụọ ahụ dịkwa oké elu. Ọbụna mgbe agha ahụ kwụsịrị, e nwebeghị mgbe ezi udo bịaghachiri n’elu ala. Mgbe ihe karịrị 50 afọ a lụsịrị agha ahụ gasịrị, onye nọ n’ọkwá ọchịchị dị elu na Germany bụ Konrad Adenauer kwuru, sị: “Ịnọ ná ntụkwasị obi na ịnọ jụụ apụwo ná ndụ ụmụ mmadụ kemgbe 1914.” N’ezie, e nyewo onye na-anọkwasị ịnyịnya ahụ na-acha ọkụ ọkụ ike ịnapụ udo n’ụwa!
17. N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo nọgide na-eji “oké mma agha” na-eme ihe mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị?
17 Mgbe ahụ, ebe a kpaliworo ọchịchọ mwụfu ọbara ya, onye ahụ na-anọkwasị n’ịnyịnya na-acha ọkụ ọkụ mabanyere n’Agha Ụwa nke Abụọ. Ngwá agha ndị e ji egbu mmadụ jọwanyere njọ, ọnụ ọgụgụ ndị e gburu egbu na ndị e merụrụ ahụ rịkwara elu ruo okpukpu anọ nke ndị e gburu n’Agha Ụwa Mbụ. Na 1945, bọmbụ atọm abụọ gbawara na Japan, nke ọ bụla na-egbuchapụ—n’otu ntabi anya—ọtụtụ iri puku ụmụ mmadụ. N’oge agha ụwa nke abụọ, onye ahụ na-anọkwasị n’elu ịnyịnya na-acha ọkụ ọkụ wetara ihe ubi dị ukwuu nke ihe dị ka 55 nde ndụ mmadụ, ọbụnakwa mgbe ahụ, afọ ejubeghị ya. E nwetara akụkọ a pụrụ ịdabere na ya nke na-ekwu na ihe karịrị nnọọ nde mmadụ 20 adawo n’okpuru “oké mma agha” ahụ kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ.
18, 19. (a) Kama ịbụ na nkànụzụ ibu agha enwewo mmeri, gịnị ka oké mgbukpọ e nweworo kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ na-agba àmà ya? (b) Ihe ize ndụ dị aṅaa na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu, ma gịnị ka Onye Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ ga-eme iji gbochie ya?
18 À pụrụ ịkpọ nke a mmeri nke nkànụzụ ibu agha? Kama nke ahụ, ọ bụ ihe àmà nke na-egosi na ịnyịnya ahụ na-acha uhie uhie nke na-enweghị obi ebere ọ bụla na-agbafe. Oleekwa ebe ọ ga-agbaru? Ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na a pụrụ ịmalite agha nuklia n’amaghị ama—ma ya fọdụkwa oké mkpochapụ agha nuklia e leziri anya mee! Ma, ọ bụ ihe obi ụtọ na Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ nke na-enwe mmeri nwere echiche dị iche banyere nke a.
19 Ruo ogologo oge usoro ihe a kpọrọ mmadụ nọgidere na-adabere ná mpako na ịkpọasị nke mba dị iche iche, ihe a kpọrọ mmadụ aghaghị ịnọgide na-anọ n’ihe ize ndụ nke agha nuklia. Ọbụna ma a sị na mba nile, n’ihi amakwaghị ihe ha ga-eme, ekpofuo ngwá agha nuklia nile ha nwere, ha ga-anọgide na-enwe ihe ọmụma banyere ya. N’oge na-adịghị anya, ha pụrụ imepụtaghachi ajọ ngwá agha nuklia ndị ahụ; otú a, agha ọ bụla nke e ji ihe agha nkịtị na-ebu pụrụ itiwapụ n’oge na-adịghị anya gaa n’ịbụ oké mkpochapụ. Mpako na ịkpọasị nke jupụtara ebe nile taa aghaghị iduje ihe a kpọrọ mmadụ n’igbu onwe ya, ọ gwụla ma—ee, ọ gwụla ma Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ọ gbabichiri ihu wee gbochie mgbafe nke onye ahụ na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke na-acha ọkụ ọkụ ji ịwị ara na-agbafe. Ka anyị nwee obi ike na Eze ahụ bụ Kraịst ga-agbafe, inwezu mmeri ya n’elu ụwa nke a nke Setan na-eduzi nakwa iguzobe òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ n’elu ala, nke dabeere n’ịhụnanya—ịhụ Chineke na onye agbata obi n’anya—bụ́ ihe na-eweta udo, nke dị mma nke ukwuu karị ihe mgbochi ndị a na-ejighị n’aka n’ịkpụpụta ngwá agha nuklia n’oge anyị ndị a nọ n’oké ịwị ara.—Abụ Ọma 37:9-11; Mak 12:29-31; Mkpughe 21:1-5.
Ịnyịnya Ojii Agbapụta
20. Gịnị na-enye anyị obi ike na Onye Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ ga-enwe ike ime ihe banyere ọnọdụ ọjọọ ọ bụla dapụtaranụ?
20 Ugbu a, Jisọs na-emeghe akara nke atọ! Jọn, gịnị ka ị hụrụ? “Mgbe ọ saghekwara akara nke atọ, m wee nụ ihe nke atọ ahụ nke dị ndụ, ka ọ na-asị, Bịa.” (Mkpughe 6:5a) Ọ bụ ihe obi ụtọ na cherub nke atọ a ‘nwere ihu yiri nke mmadụ,’ na-egosipụta àgwà nke ịhụnanya. Ịhụnanya nke ụkpụrụ na-achịkwa ga-ejupụta ebe nile n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke, ọbụna dị ka ezi àgwà ahụ jupụtara n’ime nzukọ Jehova taa. (Mkpughe 4:7; 1 Jọn 4:16) Anyị pụrụ ijide n’aka na Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ, onye ‘na-aghaghị ịbụ eze, ruo mgbe Chineke ga-edebeworị ndị iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya,’ ga-eji ịhụnanya wepụ ọnọdụ ọjọọ nile ndị a na-eme ka Jọn nyochaa ugbu a.—1 Ndị Kọrint 15:25.
21. (a) Gịnị ka ịnyịnya ojii ahụ na onye na-anọkwasị n’elu ya sere onyinyo ya? (b) Gịnị na-egosi na ịnyịnya ojii ahụ ka nọ na-agbagharị?
21 Mgbe ahụ, gịnị ka Jọn hụru mgbe a zara òkù nke atọ ahụ bụ “Bịa”? “M wee hụ, ma lee, ịnyịnya ojii; onye na-anọkwasị ya nwekwara ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’aka ya.” (Mkpughe 6:5b) Oké ụnwụ! Nke ahụ bụ ozi ọjọọ nke ọnọdụ amụma nke a na-ezi. Ọ na-ezo aka gaa n’ọnọdụ dị ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị mgbe a na-aghaghị iji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-eke nri eke. Kemgbe 1914, ụnwụ nri abụrụwo nsogbu a nọgidere na-enwe n’ụwa dum. Ibu agha ọgbara ọhụrụ na-akpata ụnwụ nri, n’ihi na a na-etinyekarị ihe ndị a na-eji eme ihe ịzụ ndị agụụ na-agụ n’inweta ngwá agha. A na-anwụde ndị ọrụ ubi ka ha jee agha, mbara ala ndị e jiworo ngwá agha tụkasịa, àgwà nke imebisị ala kama ndị iro ga-ewere ya na-eme ka nri a na-emepụta dị ala. Lee nnọọ ka nke a si bụrụ eziokwu n’oge agha ụwa mbụ ahụ, mgbe ọtụtụ ndị nwụrụ n’ihi agụụ! Ọzọkwa, onye ahụ na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ojii nke agụụ akwụsịghị mgbe agha ahụ gwụsịrị. N’ime afọ ndị 1930, nde mmadụ ise nwụrụ n’ime nanị otu ụnwụ nri e nwere ná mba Ukraine. Agha ụwa nke abụọ wetara ụkọ nri na ụnwụ ka ukwuu mgbe ọ gasịrị. Ka ịnyịnya ojii ahụ nọgidere na-agbafe, òtù na-elebara ọnọdụ ihe oriri anya, bụ́ The World Food Council, kọrọ n’etiti afọ 1987 na 512 nde mmadụ nọ n’agụụ ngụgbu, na 40,000 ụmụntakịrị na-anwụkwa kwa ụbọchị n’ihi ihe ndị agụụ kpatara.
22. (a) Gịnị ka otu olu kwuru, na-ekwupụta mkpa dị aṅaa? (b) Gịnị ka ọnụ ahịa nke otu ọ̀tụ̀tụ̀ ọka wheat na ọ̀tụ̀tụ̀ nta atọ nke ọka barley na-egosi?
22 Jọn nwere ihe ndị ọzọ ọ ga-akọrọ anyị: “M wee nụ dị ka à ga-asị na ọ bụ olu n’etiti ihe anọ ahụ nke dị ndụ, ka ọ na-asị, Otu ọ̀tụ̀tụ̀ nta nke ọka bụ otu shilling, ọ̀tụ̀tụ̀ nta atọ nke barley bụ otu shilling; emejọkwala mmanụ na mmanya vine.” (Mkpughe 6:6) Ndị cherub anọ ahụ tinyekọtara olu ha n’ikwupụta mkpa ọ dị ilezi anya banyere otú e si enweta nri—dị ka ndị mmadụ ‘riri achịcha n’ọ̀tụ̀tụ̀ na n’ime nchegbu’ n’oge dịrị tupu mbibi Jerusalem na 607 T.O.A. (Ezikiel 4:16) N’oge Jọn, a na-ewere otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ọka wheat dị ka òkè dịịrị otu onye agha maka otu ụbọchị. Gịnị ga-abụ ọnụ ahịa ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dị otú ahụ? Otu shilling—bụ́ ụgwọ a na-akwụ mmadụ n’otu ụbọchị! (Matiu 20:2)d Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ enwee ezinụlọ? Ya bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịzụrụ ọ̀tụ̀tụ̀ nta atọ nke ọka barley a na-afụchaghị afụcha. Ọbụna nke ahụ ga-eju nanị ezinụlọ dị nta afọ. Ọzọkwa, barley bụ ihe a na-adịghị ele anya dị ka nri na-edozi ahụ dị ka ọka wheat.
23. Gịnị ka okwu ahụ bụ, “Emejọkwala mmanụ na mmanya vine” pụtara?
23 Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Emejọkwala mmanụ na mmanya vine” pụtara? Ụfọdụ enwewo echiche nke bụ na ọ pụtara na ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ga-anọ n’ụkọ nri na ọbụna agụụ ngụgbu, a gaghị emetụ ihe okomoko nke ndị ọgaranya aka. Ma, n’Etiti Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, mmanụ na mmanya abụghị ihe okomoko n’ezie. N’oge Bible, a na-ele achịcha, mmanụ, na mmanya anya dị ka ihe a na-eri mgbe dum. (Tụlee Jenesis 14:18; Abụ Ọma 104:14, 15.) Mmiri ha adịchaghị mma, n’ihi ya a na-ejikarị mmanya eme ihe maka ọṅụṅụ, mgbe ụfọdụkwa iji ya eme ọgwụ. (1 Timoti 5:23) N’ihe banyere mmanụ, n’oge Elaịja, ọ bụ ezie na nwanyị Zarefat ahụ dara ogbenye nke ukwuu, ọ ka nwere mmanụ fọdụrụ ọ ga-eji sie ụtụ ọka fọdụụrụ ya. (1 Ndị Eze 17:12) N’ihi nke a, iwu ahụ bụ “emejọkwala mmanụ na mmanya vine” yiri ka ọ bụ ndụmọdụ e nyere ka a ghara imefusi ihe ndị a dị mkpa ngwa ngwa kama ka ha jiri nwayọ nwayọ jiri ha na-eme ihe. Ma ọ bụghị otú ahụ, a ‘ga-emejọ’ ha, ya bụ, ha ga-agwụsị tupu ụnwụ nri ahụ agwụsịa.
24. N’ihi gịnị ka ịnyịnya ojii ahụ na-agaghị anọgide na-agbagharị ruo ogologo oge?
24 Lee nnọọ ka anyị ga-esi nwee obi ụtọ na Onye Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ ga-emeri ịnyịnya ojii ahụ nke na-agbafe! N’ihi na e dere banyere onyinye ịhụnanya Ya n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, sị: “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị. . . . Ọtụtụ ọka [ga-adịkwa] n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:7, 16; leekwa Aịsaịa 25:6-8.
Ịnyịnya Ahụ Ya Yiri Ozu na Onye Na-anọkwasị Ya
25. Mgbe Jisọs meghere akara nke anọ ahụ, olu ònye ka Jọn nụrụ, gịnịkwa ka nke a na-egosi?
25 A kọchabeghị akụkọ ahụ. Jisọs meghere akara nke anọ, Jọn na-akọkwara anyị ihe si na ya pụta: “Mgbe ọ saghekwara akara nke anọ, m wee nụ olu nke ihe nke anọ ahụ nke dị ndụ, ka ọ na-asị, Bịa.” (Mkpughe 6:7) Nke a bụ olu nke cherub ahụ nke yiri ugo na-efe efe. Nke a na-egosipụta amamihe nke na-ahụ ihe dị n’ebe dị anya, n’eziokwu, ọ dịwokwa mkpa ka Jọn, òtù Jọn ahụ, na ndị ohu Chineke ndị ọzọ nile n’elu ala jiri nghọta na-eme ihe, n’iburu ihe e gosipụtara n’ebe a n’uche. Site n’ime nke a, anyị ga-enweta nchebe ruo n’ókè ụfọdụ pụọ n’ihe otiti ndị na-emekpa ha ahụ, bụ́ ndị maara ihe n’ụzọ nke ụwa n’ime ọgbọ nke oge a nke dị mpako, na-emekwa omume rụrụ arụ.—1 Ndị Kọrint 1:20, 21.
26. (a) Ònye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke anọ ahụ, n’ihi gịnịkwa ka ụcha akpụkpọ ahụ nke ịnyịnya nke a ji kwesị ekwesị? (b) Ònye na-esochi onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke anọ ahụ, gịnị na-emekwa ndị o gburu?
26 Mgbe onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke anọ zara òkù ahụ, ihe egwu ọhụrụ ndị dị aṅaa ka ọ na-atọhapụ? Jọn na-akọrọ anyị, sị: “M wee hụ, ma lee, ịnyịnya nke ahụ ya yiri ozu: onye na-anọkwasịkwa ya, aha ya bụ Ọnwụ; Hedis wee soo ya gaa.” (Mkpughe 6:8a) Onye na-anọkwasị n’ịnyịnya nke ikpeazụ nke a nwere aha, bụ: Ọnwụ. Ọ bụ nanị ya n’ime ndị ahụ na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ndị dị n’Apọkalịps ahụ mere ka a mata onye ọ bụ hoo haa otú ahụ. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Ọnwụ na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke ahụ ya yiri ozu, ebe a na-eji okwu ahụ e ji akọwa ihe na-acha ozu ozu (Grik, khlo·rosʹ) na-eme ihe n’akwụkwọ ndị Grik iji kọwaa ihu ndị ụcha ha na-adịghị mma, dị ka à ga-asị na ha na-arịa ọrịa. Ọzọkwa, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, n’otu ụzọ a na-apụghị ịkọwa akọwa, ihe na-esochi Ọnwụ bụ Hedis (ili), ebe Hedis na-anara nye onwe ya ndị nile onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke anọ ahụ tigburu. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ndị a gaje inwe mbilite n’ọnwụ, mgbe ‘ọnwụ na Hedis nyeghachiri ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.’ (Mkpughe 20:13) Ma olee otú Ọnwụ si enweta ndị ahụ ọ na-egbu?
27. (a) Olee otú onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ahụ a kpọrọ Ọnwụ si enweta ndị ọ na-egbu? (b) Gịnị ka okwu ahụ bụ “otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụwa” pụtara, bụ́ ndị Ọnwụ nwere ike n’ahụ ha?
27 Ọhụụ ahụ kọwara ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ahụ, sị: “E wee nye ha ike ịchị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụwa, iji mma agha, na iji oké ụnwụ, na iji ọnwụ, na-egbu, iwerekwa anụ ọhịa nke ụwa na-egbu.” (Mkpughe 6:8b) Ọ bụghị nnọọ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi n’ụwa n’ụzọ nkịtị, kama akụkụ dị ukwuu nke ụwa, ma mmadụ ò bijupụtara ha ma ọ bụ na mmadụ ebijupụtaghị ha, ga-abụ ndị mgbafe ya ga-emetụta. Onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke a na-achịkọrọ ndị nile oké mma agha nke onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke abụọ ahụ, ụnwụ na ụkọ nri nke onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke atọ, gburu. Ọ na-egbukwa ndị nke ya site n’ajọ ọrịa na-efe efe, sitekwa n’ala ọma jijiji, dị ka a kọwara ya na Luk 21:10, 11.
28. (a) Olee ụzọ e siworo nwee mmezu amụma n’ihe banyere ‘ajọ ọrịa na-efe efe’? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo chebe ndị Jehova pụọ n’ọtụtụ ọrịa taa?
28 Otu ihe dị mkpa n’oge a bụ ‘ajọ ọrịa na-efe efe.’ Dị ka ihe sitere n’Agha Ụwa Mbụ ahụ pụta, oké ahụ ọkụ sitere Spain gburu ihe karịrị nde mmadụ 20 n’ime nanị ọnwa ole na ole dị n’agbata 1918 na 1919. Nanị ókèala ajọ ihe otiti nke a na-emetụtaghị bụ agwaetiti nta nke St. Helena. N’ebe ndị e belatara ọnụ ọgụgụ mmadụ bi na ha n’ụzọ dị ukwuu, e sunyere nnukwute ọkụ dị iche iche e ji na-esure mkpokọba nke ozu ndị nwụrụ anwụ n’ọkụ. Taakwa, e nwere ọnụ ọgụgụ na-eyi egwu nke ọrịa obi na ọrịa cancer nke ihe na-akpata ọtụtụ n’ime ya bụ mmetọ nke ụtaba. N’ime ihe a kọwara dị ka “iri afọ nke jọrọ njọ” nke afọ ndị 1980, ụzọ ndụ nke megidere iwu ma ọ bụrụ na a gbasoo ụkpụrụ Bible tụkwasịrị ihe otiti nke ọrịa AIDS ‘n’ajọ ọrịa na-efe efe’ ahụ. N’afọ 2000, a kọrọ na dọkịta ukwu na-awa ahụ́ na United States kpọrọ ọrịa AIDS “ihe pụrụ ịbụ ọrịa kasị njọ nke ụwa hụtụworo.” O kwuru na nde mmadụ 52 n’ụwa nile ebutewo nje HIV na ọrịa AIDS, nde mmadụ 20 n’ime ha anwụwokwa. Lee nnọọ ka ndị Jehova si nwee obi ụtọ na ezi ndụmọdụ nke Okwu ya na-eme ka ha zere ịkwa iko na iji ọbara eme ihe na-ekwesịghị ekwesị, bụ́ ebe e si na-enweta ọtụtụ ọrịa taa!—Ọrụ 15:28, 29; tụlee 1 Ndị Kọrint 6:9-11.
29, 30. (a) Nkọwa dị aṅaa ka ‘ikpe anọ jọrọ njọ’ ahụ e kwuru okwu ya n’Ezikiel 14:21 nwere taa? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịghọta site n’okwu ahụ bụ “anụ ọhịa” nke dị ná Mkpughe 6:8? (ch) Gịnị yiri ka ọ bụ isi ihe dị n’ọnọdụ amụma nke a?
29 Ọhụụ Jọn kpọtụkwara anụ ọhịa aha dị ka ihe nke anọ na-akpata nnwụchu ọnwụ. N’eziokwu, e lere ihe anọ ahụ mmeghe nke akara nke anọ ahụ gosipụtara—agha, ụnwụ, ọrịa, na anụ ọhịa—anya n’oge ochie dị ka ihe ndị bụ isi na-akpata nnwụchu ọnwụ. N’ihi nke a, ha ga-ese onyinyo ihe nile na-akpata nnwụchu ọnwụ taa. Ọ bụ nnọọ dị ka Jehova dọrọ ndị Israel aka ná ntị, sị: “[Otú ahụkwa ka ọ ga-adị] mgbe ọ bụ ikpe m anọ jọrọ njọ, bụ́ mma agha na oké ụnwụ na ajọ anụ ọhịa na ajọ ọrịa na-efe efe, ka m zigara na Jerusalem, ibipụ mmadụ na anụmanụ n’ime ya.”—Ezikiel 14:21.
30 A dịghị anụkarị akụkọ n’oge a banyere anụ ọhịa igbu mmadụ, ọ bụ ezie na ná mba ndị na-emepechabeghị anya, anụ ọhịa anọgidewo na-egbu mmadụ. N’ọdịnihu, ha pụrụ igbu mmadụ ọbụna karị ma ọ bụrụ na ala dị iche iche atọgbọrọ n’efu n’ihi agha ma ọ bụ oké ụnwụ amịkpọsịa ndị mmadụ ruo n’ókè ha na-agaghị enwekwa ike ịchụpụ anụ ọhịa ndị agụụ na-agụ. Ọzọkwa, e nwere ọtụtụ mmadụ taa ndị, dị ka ụmụ anụmanụ na-enweghị uche, na-egosipụta àgwà anụ ọhịa ndị na-eyighị ndị ahụ a kọwara n’Aịsaịa 11:6-9. Ọ bụ ndị a ka ụta dịịrị maka mmụba zuru ụwa ọnụ nke imempụ ndị e jikọtara ha na mmekọahụ, igbu ọchụ, iyi ọha mmadụ egwu, na ịtụ bọmbụ n’ime ụwa nke oge a. (Tụlee Ezikiel 21:31; Ndị Rom 1:28-31; 2 Pita 2:12.) Onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya nke anọ ahụ na-achịkọrọkwa ndị ha gburu. N’eziokwu, isi ihe dị n’ihe nkiri amụma nke a yiri ka ọ bụ na onye na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ahụ ahụ ya yiri ozu na-achịkọrọ ndị nwụchuru ọnwụ site n’ụzọ dị iche iche.
31. N’agbanyeghị oké mbibi ihe ndị na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ahụ na-acha ọkụ ọkụ, nke ojii na nke ahụ ya yiri ozu kpataworo, n’ihi gịnị ka a pụrụ iji gbaa anyị ume?
31 Ihe e gosiri mgbe e meghere akara anọ ndị mbụ ahụ na-emesi anyị obi ike n’ihi na ọ na-agwa anyị ka obi ghara ikoropụ anyị n’ihi agha, agụụ, ọrịa, na ihe ndị ọzọ na-akpata nnwụchu ọnwụ ndị jupụtara ebe nile taa; anyị ekwesịghịkwa ịkwụsị inwe olileanya n’ihi na ndị ndú bụ mmadụ enwebeghị ike idozi ihe isi ike ndị e nwere ugbu a. Ọ bụrụ na ọnọdụ ndị dị n’ụwa emewo ka ọ pụta ìhè na ndị na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ahụ na-acha ọkụ ọkụ, nke ojii, na nke ahụ ya yiri ozu na-agbagharị ugbu a, echefukwala na Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha bụ onye mbụ malitere ịgbafe. Jisọs aghọwo Eze, o nwewokwa mmeri ruo n’ókè ịchụpụ Setan n’eluigwe. Mmeri ndị ọzọ o nwetara agụnyewo ịchịkọta ndị nile fọdụrụ n’ụmụ nke Israel ime mmụọ nakwa oké ìgwè mmadụ ahụ zuru mba nile, ndị ọnụ ọgụgụ ahụ ruru ọtụtụ nde, maka nlanarị gabiga oké mkpagbu ahụ. (Mkpughe 7:4, 9, 14) Ọ ghaghị ịnọgide na-agba ruo mgbe o nwezuru mmeri ya.
32. Gịnị ka a hụrụ ná mmeghe nke ọ bụla n’ime akara anọ ndị ahụ?
32 Ọkpụkpọ òkù ahụ bụ “Bịa” esochiwo mmeghe nke ọ bụla n’ime akara anọ ndị ahụ. Na nke ọ bụla, otu ịnyịnya na onye na-anọkwasị n’elu ya na-agbapụta. Malite n’akara nke ise, anyị adịghị anụkwa ọkpụkpọ òkù dị otú ahụ. Ma ndị ahụ na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ndị ahụ ka nọ na-agba, ha ga-anọgidekwa na-eme otú ahụ n’oge nile nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. (Tụlee Matiu 28:20.) Oké ihe omume ndị ọzọ dị aṅaa ka Jisọs kpughere mgbe ọ na-emeghe akara atọ ndị fọdụrụnụ? Ụfọdụ n’ihe omume ndị ahụ bụ nke anya mmadụ na-adịghị ahụ. Ndị ọzọ, ọ bụ eziokwu na a na-ahụ ha anya, ka ga-abụ n’ọdịnihu. Ma otú o sina dị, mmezu ha bụ ihe e ji n’aka. Ka anyị lee ihe ha bụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otú ọ dị, rịba ama na “nwanyị” ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 12:1 nwere ‘okpueze ihe atụ nke kpakpando iri na abụọ.’
b Maka nkọwa miri emi nke na-akwado na Jisọs batara n’Alaeze ya na 1914, lee peji nke 215-218 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi, bụ́ nke Ndịàmà Jehova, bipụtara.
c Ọ bụ ezie na ọtụtụ nsụgharị dere okwu a ịbụ “inwe mmeri” (Revised Standard, The New English Bible, King James Version) ma ọ bụ “ịtụkwasị uche ya n’inwe mmeri” (Phillips, New International Version), ojiji e jiri ụdị ngwaa okwu na-egosi ihe omume nkịtị mee ihe n’asụsụ Grik mbụ n’ebe a na-enye echiche nke imezu ihe omume ma ọ bụ nke ihe omume ikpeazụ. N’ihi ya, akwụkwọ Robertson bụ Word Pictures in the New Testament kwuru, sị: “Ụdị ngwaa nke dị n’ebe a na-ezo aka ná mmeri ikpeazụ.”
d Lee New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji.
Igbe dị na peeji nke 92]
Eze ahụ Na-enwe Mmeri
N’ime afọ ndị 1930 na 1940, ndị iro gbalịsiri ike ime ka o yie ka à ga-asị na ozi Ndịàmà Jehova megidere iwu, bụrụ imempụ, ma ọ bụ ọbụna na-anwa ikpu ọchịchị ihu. (Abụ Ọma 94:20) Nanị n’afọ 1936, e nwere ihe ndekọ banyere ugbo 1,149 ndị uwe ojii jidere ha n’ime United States. Ndịàmà ahụ buuru ọtụtụ okwu ikpe garuo ụlọikpe ukwu bụ United States Supreme Court, ndị a bụkwa ụfọdụ n’ime mmeri ndị pụtara ìhè ha nwetara.
Na May 3, 1943, ụlọikpe Supreme Court, n’okwu nke Murdock megide Pennsylvania, kpebiri na ọ dịghị mkpa ka Ndịàmà ahụ nata laịsensị iji wee nara ndị mmadụ ego mgbe ha nyere ha akwụkwọ. N’otu ụbọchị ahụ, mkpebi e mere n’okwu nke Martin megide Obodo Struthers kwuru na o megideghị iwu ịkụ mgbịrịmgba ọnụ ụzọ mgbe a na-ekere òkè ná nkesa ụlọ n’ụlọ nke mpempe akwụkwọ na ihe ndị ọzọ e ji eme mkpọsa.
Na June 14, 1943, ụlọikpe Supreme Court kpebiri n’okwu nke Taylor megide Mississippi na Ndịàmà ahụ adịghị agba ndị mmadụ ume inupụrụ ọchịchị isi site ná nkwusa ha. N’otu ụbọchị ahụ, n’okwu nke West Virginia State Board of Education megide Barnette, Ụlọikpe ahụ kwuru na òtù na-elekọta ụlọ akwụkwọ enweghị ikike ịchụpụ ụmụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ, bụ́ ndị jụrụ ikele ọkọlọtọ. N’ụbọchị nke na-eso ya kpọmkwem, ụlọikpe High Court nke Australia wepụrụ mmachibido mba ahụ machibidoro Ndịàmà Jehova, na-akọwa na nke a “megidere iwu, bụrụ nke e ji anya ụfụ na mmegide wee mee.”
Igbe dị na peeji nke 94]
‘E Nyere Ya Ike Ịnapụ Udo n’Ụwa’
Olee ebe nkànụzụ na-eduje? Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail nke Toronto, Canada, January 22, 1987, depụtara ihe na-esonụ site n’okwu Ivan L. Head kwuru, bụ́ onyeisi oche nke ụlọ ọrụ International Development Research Centre:
“A na-eche na ọ bụ eziokwu na otu n’ime ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ọkà n’ọrụ nkànụzụ anọ ọ bụla n’ụwa, bụ́ ndị na-arụ ọrụ ime nnyocha na imeziwanye ihe na-arụ ọrụ n’imepụta ngwá agha. . . . Ná ngụkọta nke 1986, ihe a na-emefu karịrị $1.5 nde n’otu minit ọ bụla. . . . Ànyị nọ ná ntụkwasị obi karị n’ihi ilekwasị anya n’ụdị nkànụzụ dị otú a? Nkwakọba ngwá agha nuklia nke mba ndị bụ́ dike nwere, nwere ike mgbawa nke ngwá agha nile ndị agha nile jiri mee ihe n’Agha Ụwa nke Abụọ—okpukpu 6,000. Agha Ụwa nke Abụọ ụzọ 6,000. Kemgbe 1945, e nwewo ihe na-erughị izu asaa mgbe ọ na-adịghị ebe a na-ebu agha n’elu ụwa. E nwewo ihe karịrị 150 agha nke mba na mba ma ọ bụ ndị a na-ebu n’ime nanị otu mba, ndị a na-eche na ha tara isi nde mmadụ 19.3, nke ọtụtụ n’ime ha bụ n’ihi nkànụzụ ọgbara ọhụrụ ndị e mepụtaworo n’oge nke a nke United Nations.”
Ka ọ na-erule n’afọ 2005, agha ndị a lụrụ atawo isi ihe karịrị nnọọ nde mmadụ 20.
Igbe dị na peeji nke 98, 99]
Otú E Si Hazie Akwụkwọ Mkpughe
Ebe anyị gaworo n’ihu rute ugbu a ná ntụle anyị na-atụle akwụkwọ Mkpughe, anyị na-amalite ịhụ, n’ụzọ doro anya karị, otú e si hazie akwụkwọ ahụ. Mgbe okwu mmeghe ya nke na-akpali akpali gasịrị (Mkpughe 1:1-9), a pụrụ ile Mkpughe anya dị ka nke e kewara gaa na 16 ọhụụ dị iche iche n’ụzọ dị otú a:
ỌHỤỤ NKE 1 (1:10–3:22): Jọn nọ ná mkpali nke mmụọ nsọ wee hụ Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube, onye na-ezije ozi ndụmọdụ ndị na-akpali akpali nye ọgbakọ asaa ahụ.
ỌHỤỤ NKE 2 (4:1–5:14): Ọ hụrụ ịdị ebube nke ocheeze Jehova Chineke nke dị n’eluigwe. Onye a nyere Nwa Atụrụ ahụ otu akwụkwọ.
ỌHỤỤ NKE 3 (6:1-17): Mgbe ọ na-emeghe akara isii ndị mbụ dị n’akwụkwọ ahụ, Nwa Atụrụ ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-ekpughe ọhụụ ọtụtụ ihe mejupụtara nke ihe ndị gaje ime n’ụbọchị Onyenwe anyị. Ndị ịnyịnya anọ ahụ nke Mkpughe gbafere, ndị ohu Chineke e gburu n’ihi okwukwe ha natara uwe ọcha, a kọwakwara ‘oké ụbọchị ahụ nke iwe.’
ỌHỤỤ NKE 4 (7:1-17): Ndị mmụọ ozi ejighachi ifufe nke mbibi azụ ruo mgbe a kazuru 144,000 ndị so n’Israel ime mmụọ akara. Oké ìgwè mmadụ ndị sitere ná mba nile enye Chineke na Kraịst ekele maka nzọpụta ha, a na-achịkọtakwa ha maka nlanarị gabiga oké mkpagbu ahụ.
ỌHỤỤ NKE 5 (8:1–9:21): Mgbe e meghere akara nke asaa ahụ, a nụrụ ụda opi ike asaa, nke isii ndị bu ụzọ n’ime ha mejupụtara ọhụụ nke ise ahụ. Opi ike ndị a na-akpọsa amamikpe Jehova megide ihe a kpọrọ mmadụ. Opi nke ise na nke isii na-edubatakwa ‘ahụhụ nke mbụ na nke abụọ.’
ỌHỤỤ NKE 6 (10:1–11:19): Otu mmụọ ozi dị ike nyere Jọn akwụkwọ nta, a tụrụ ụlọ nsọ ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, anyị na-agụkwa ihe banyere ahụmahụ nke ndịàmà abụọ ahụ. O ji ọfụfụ nke opi nke asaa mechie, nke na-akpọsa ahụhụ nke atọ nye ndị iro Chineke—Alaeze Jehova na nke Kraịst ya, nke na-abịanụ.
ỌHỤỤ NKE 7 (12:1-17): Nke a na-akọwa ọmụmụ nke Alaeze ahụ, nke mere ka Maịkael tụda agwọ ahụ, bụ́ Setan, n’elu ala.
ỌHỤỤ NKE 8 (13:1-18): Anụ ọhịa ahụ dị oké ike esi n’osimiri rịgopụta, anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ, nke yiri nwa atụrụ na-agbakwa ihe a kpọrọ mmadụ ume ife ya ofufe.
ỌHỤỤ NKE 9 (14:1-20): Ọhụụ mara mma nke 144,000 ahụ n’elu Ugwu Zaịọn. A nụrụ ozi ndị mmụọ ozi na-ezi gburugburu ụwa, e were mkpụrụ vine nke ụwa dị ka ihe ubi, a zọchakwara ebe nzọcha mkpụrụ vine nke iwe Chineke.
ỌHỤỤ NKE 10 (15:1–16:21): Ileba anya n’eluigwe ọzọ, nke ihe sochiri ya bụ ịwụpụ ọkwa asaa ahụ nke iwe Jehova n’elu ala. Ihe mechiri akụkụ nke a bụkwa nkọwa amụma nke ọgwụgwụ usoro ihe Setan.
ỌHỤỤ NKE 11 (17:1-18): Oké nwanyị ahụ na-akwa iko, bụ́ Babilọn Ukwu, na-anọkwasị n’elu anụ ọhịa na-acha uhie uhie, nke banyere n’abyss ruo nwa oge ma mesịa pụta ọzọ wee dọkasịa ya.
ỌHỤỤ NKE 12 (18:1–19:10): A mara ọkwa ọdịda na mbibi ikpeazụ nke Babilọn Ukwu ahụ. Mgbe e mezusịrị ihe e kpere n’ikpe megide ya, ụfọdụ ruru újú, ndị ọzọ toro Jehova; a mara ọkwa agbamakwụkwọ nke Nwa Atụrụ ahụ.
ỌHỤỤ NKE 13 (19:11-21): Jisọs eduru usuu ndị agha nke eluigwe jee imezu ihe Chineke kpere n’ikpe megide usoro ihe nke Setan, ndị agha ya na ndị na-akwado ya; nnụnụ ndị na-eri ihe nwụrụ anwụ erie ozu ha.
ỌHỤỤ NKE 14 (20:1-10): Ịtụba Setan bụ́ Ekwensu n’abyss, Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst na ndị ga-eso ya bụrụ eze, ule ikpeazụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, na mbibi nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya.
ỌHỤỤ NKE 15 (20:11–21:8): Mbilite n’ọnwụ nke mmadụ nile na oké Ụbọchị Ikpe ahụ; eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ amalite ịdị adị, na-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ na-eme ezi omume ọtụtụ ngọzi.
ỌHỤỤ NKE 16 (21:9–22:5): E mechiri akwụkwọ Mkpughe site ná nkọwa mara mma nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ, bụ́ nwunye Nwa Atụrụ ahụ. Ndokwa Chineke maka ịgwọ ọrịa na inye ihe a kpọrọ mmadụ ndụ esite n’obodo ahụ na-erudata.
Mkpughe mechiri site n’okwu ekele na ịdọ aka ná ntị ndị na-akpali akpali site n’ọnụ Jehova, site n’ọnụ Jisọs, site n’ọnụ mmụọ ozi ahụ, sitekwa n’ọnụ Jọn n’onwe ya. Òkù a na-akpọ mmadụ nile bụ “Bịa”!—Mkpughe 22:6-21.