Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 8/15 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ohu Jehova Nwere Ezi Olileanya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Anyị Ga Na-ejegharị N’aha Jehova Ruo Mgbe Ebighị Ebi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Toonụ Jaa Maka Ikpe Ya Nile!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 8/15 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

■ Ụfọdụ n’ime ndị Kraịst e tere mmnadụ hà ga-agabiga “mkpagbụ ukwu” ahụ ịdi ndụ n’elụ ala n’ime ụwa ọhụrụ ahụ tupu a kpọje ha n’eluigwe?

Bible ekwughị nke ahụ hoo haa.

Ọ dịwo anya ndị Kraịst malitere inwe mmasị n’ịmara ụdị ịhe ùgwù ndị Chineke pụrụ ime ka o rute ha aka. (Ọrụ 1:6) Nke ahụ abụkarịwo eziokwu n’oge anyị a kemgbe e guzobere Alaeze ahụ. (Matiu 24:3, 24, 34) Ebe ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a ga-abịa n’oge ha, ndị Kraịst echewo echiche ma ụfọdụ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ hà ga-adị ndụ gabiga “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke” wee jee ozị n’elu ala ruo ogologo oge ụfọdụ tupu ha anata ụgwọ ọrụ ha nke elụigwe. (Mkpụghe 16:14) Bible ekwughị na nke a bụ ihe ga-eme, ma e werewo ụkpụrụ nke ihe ndị mere eme na amụma ụfọdụ mee ihe iji gosi na nke a pụrụ ime. Kama ikwesi olu ike n’otu ihe, anyị pụrụ ịgbachi nkịtị na-ele anya ka anyị hụ otú Chineke ga-esi lebara okwu ahụ anya.

Ụfọdụ ihe mere eme ndị e dekọrọ na Bible na-enwe ihe ndị kwekọrọ na ha n’etiti ndị Chineke mgbe oge ụfọdụ gasịrị. Dị ka ihe atụ, anyị maara na Jona nọrọ n’ime azụ ukwu ahụ ruo ụbọchị atọ ehihie na abalị. Ụfọdụ ndị pụrụ ile nke ahụ anya nanị dị ka ihe atụ nke nnapụta Chineke, ma Jisọs kwuru na nke a bụ ihe atụ amụma nke otú ya onwe ya ga-esi nọọ n’ime ili rụo ogologo oge a pụrụ iji tụnyere nke ahụ tupu mbilite n’ọnwụ ya. (Jona 1:17; Matiu 12:40) Ee, ahụmahụ Jona bụ ihe atụ amụma. N’ụzọ kwere nghọta, ndị ohu Chineke elewo amụma na ihe ndekọ Bible ụfọdụ anya kpọmkwem iji hụ ma hà gosiri otú Jehova ga-esi mesoo ha n’ọdịnihu.

Dị ka ihe atụ nke metụtara amụma Bible, Ụlọ Nche (Bekee) nke December 15, 1928, kọwara Maịka 5:2-15. Akwụkwọ Maịka kọrọ ihe banyere ‘ndị Asiria’ ibibi Sameria na ndị Juu ịlọghachi site ná ndọrọ n’agha na Babilọn. (Maịka 1:1, 5-7; 4:10) Ma o zokwara aka n’ihe ndị ga-eme mgbe oge ụfọdụ gasịrị, dị ka ọmụmụ a ga-amụ Mesaịa ahụ na Betlehem. (Maịka 5:2) Maịka burụ amụma na mgbe a napụtasịrị ha site “n’aka Asiria,” “ndị Jekọb fọdụrụ” ga-eyi “igirigi sitere n’ebe Jehova nọ,” djkwa ka “nwa ọdụm n’etiti ìgwè ewu na atụrụ nile.” (Maịka 5:6-8) Ụlọ Nche ahụ kwurụ, sị: “A pụrụ iwere nke a dị ka ihe na-egosi na ụfọdụ n’ime ihe ahụ fọdụrụ ga-anọ n’elụ ala ọbụna mgbe a lụsịrị agha Amagedọn, ha ga-enwekwa ọrụ ụfọdụ ha ga-arụ n’oge ahụ n’aha Onyenwe anyị, ijikwa wetara ya otụto na nsọpụrụ.” Rịba ama ụdi asụsụ dị nwayọọ nke ezi uche dịkwa na ya e ji webata ihe nke a nke pụrụ ime: “A pụru iwere nke a dị ka ihe na-egosi.”

Gịnị banyere ihe ndekọ Bible nke pụrụ ikwekọ ná nlanarị dị otú ahụ n’elu ala? Otụ ihe atụ nke e wepụtaworo metụtara Noa na ezinụlọ ya. E lewo Noa anya dị ka onye sere onyịnyo Jisọs n’oge ọgwụgwụ nke a. (Jenesis 6:8-10; Matiu 24: 37) Dị ka Noa duuru nwunye ya na ụmụ ha ndị ikom atọ na ndị nwunye ụmụ ha gabiga ọgwụgwụ nke usoro ihe oge ochịe ahụ, Kraịst ga-eduzi ihe ahụ fọdụrụ n’òtù nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ na ndị ahụ ghọrọ ụmụ nke “Nna nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi,” bụ́ Jisọs. Nwụnye Noa gabigara iju Mmiri ahụ, kerekwa òkè n’ịmaliteghachi ezi ofụfe n’elu ala nke e meworo ka ọ dị ọcha. Ihe kwekọrọ na ya pụrụ ịbụ nlanarị nke ihe fọdụrụ n’òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ.—Aịsaịa 9:6, 7; 2 Ndị Kọrint 11:2; Mkpughe 21: 2, 9.a

E lewokwa ihe ndekọ Bible ndị ọzọ anya dị ka ndị na-atụ aro na ụfọdụ n’ime ndị e tere mmanụ nwere ike ịdị ndụ banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Dị ka ihe atụ, Jeremaịa dịrị ndụ gabiga mbibi nke Jerusalem; “nwoke ahụ” nke ji mpì ink odeakwụkwọ nọdụrụ wee hụ ọrụ mbibi ahụ tupu ọ laghachi wee nye akụkọ ozi ya.—Ezikiel 9:4, 8,11.

Okwu ndị a na-ekwu banyere eziokwụ ahụ nke bụ na ọ pụrụ ikwe omụme ụfọdụ n’ime ndị ahụ e tere mmanụ ịlanarị banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ bụ ndị e bụ ihe dị mma n’uche wee na-ekwụ, ọ bụkwa n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị meworo eme e dekọrọ na Bible, bụ́ ndị pụrụ inwe ihe ndị kwekọrọ na ha mgbe oge ụfọdụ gasịrị. Ọ bụrụ na o mesịa bụrụ na ọ dịghị nke ọ bụla ná ndị ahụ e tere mmanụ fọdụrụ n’elu ala, ọ dịghị ihe kwesịrị ịkpata enweghị afọ ojuju. Anyị anakwereworị na a na-aghọta okwu ndị dị na Bible nke ọma karị ka oge na-aga. Dị ka ihe atụ, Ụlọ Nche nke Janụary 15, 1982, tụlere Maịka 5:6-9 ọzọ wee kọwaa na “ọ dịghị mkpa ka ihe fọdụrụ ahụ nke Israel ime mmụọ chere ruo mgbe a lụsịrị . . . Ha-magedọn iji wee bụrụ ‘igirigi’ nke udo nye ndị” mmadụ. Ọzọkwa, ntụle nke a gosịkwara na ọ puru ime eme na ihe fọdụrụ ahụ pụrụ ịdị ndụ gabiga oké agha Chineke ahụ, ruokwa nwa mgbe, “[nọgidekwa] na-adị ka ‘igirigi’ na-enye ume ọhụrụ nye ‘oké ‵ịgwè mmadụ’ ahụ na ‘atụrụ ọzọ.’” Otú ọ dị, anyị pụrụ ịhụ na ngabiga nke oge na mmụba nke ìhè ime mmụọ pụrụ ịgbasawanye, gbanweekwa nghọta anyị nke amụma ma ọ bụ nke ihe omume ndị e dekọrọ na Bible.—Ilu 4:18.

Anyị maara na Bible jikọtara ‘ọbịbịa nke Nwa nke mmadụ’ na ‘nchịkọta nke ndị a họpụtaworo site n’ikuku anọ ahụ.’ (Matiu 24: 29-31) Ọzọkwa, n’oge ‘ọnụnọ nke Onyenwe anyị’ n’ike Alaeze, a ga-akpọlite ndị e tere mmanụ nọ n’ụra ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:15, 16) Ndị a a kara akara ga-anọ n’ebe ahụ ịghọ akụkụ nke nwunye Nwa Atụrụ ahụ. Olee mgbe nke ahụ ga-eme?

N’akwụkwọ Mkpughe, ozugbo Jọn kọsịrị banyere ogbugbu Chineke gburu nwanyị okpukpe ahụ na-akwa iko, bú Babilọn Ukwu ahụ, ọ kọwara “ọlụlụ nwụnye nke Nwa Atụrụ ahụ.” A na-ewepụ otụ “nwanyị” rụrụ arụ, nke na-akwa iko, anyị na-ahụkwa “nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, bụ́ nwụnye Nwa Atụrụ ahụ,” nke ‘e gbokwasịworo ezi ákwà ọcha na-enwu enwu, nke dikwa ọcha nke nọchiri anya ezi omụme nile nke ndị nsọ.’ (Mkpughe 18:10; 19:2, 7, 8; 21:9) Mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ bụ akụkụ nke mkpagbu ukwu ahụ. (Matiu 24:21; Mkpughe 7:14) Ya mere, a pụrụ ịtụgharị ya n’uche na ụfọdụ ndị so n’òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ga-adị ndụ gabiga mkpagbu ukwu ahụ dị ka ihe àmà nke nnwapụta na nchebe nke Jehova. (Zefanaịa 2:3; tụlee Matiu 24:22.) Ọ bụrụ na e si otú a chebe ha n’elu ala, ha pụrụ ịnọgide n’ebe a ruo mgbe Chineke ga-ekpebi ịkpọgo ha n’eluigwe.

Otú ọ dị, ihe e dere ná Mkpughe abụghị kpọmkwem n’usoro ọ ga-esi mee. Ọ bụghị dị ka à ga-asị na ịhe nta ahụ fọdụrụ nke ndị e tere mmanụ ga-adị mkpa iji malite ụwa ọhụrụ ahụ, n’ihi na ha azụpụtaworị ọtụtụ nde ndị Kraịst na-egụzosi ike, ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’elu ala. N’ihi nke a, Chineke pụrụ ịkpọrọ ndị ya e tere mmanụ gaa n’eluigwe ozugbo e bibisịrị Babilọn Ukwu ahụ, na-edozi ọnọdụ maka “ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ” iwere ọnọdụ. Ndị nsọ nile ga-esi otú a nwee ike iso Kraịst kere òkè ‘n’iji mkpanaka ígwè zụọ mba nile dị ka atụrụ’ n’akụkụ fọdụrụ nke mkpagbu ukwu ahụ. (Mkpughe 2:26, 27; 19:11-21) Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka Chineke ga-esi mee ihe, 144,000 nile ahụ na Jisọs ga-anọ ya ‘iso Kraịst chịa dị ka eze ruo otu puku afọ ahụ dum.’—Mkpughe 20:4.

O dị nnọọ mma na ndị Chịneke nwere mmasị dị ukwuu n’ileba anya n’otú ọ ga-esi duzie ihe ndị ga-emenụ nakwa otú ọ ga-esi kwụghachi ndj ohu ya ụgwọ ọrụ. (Tụlee 1 Pita 1:12.) Nke a na-egosipụta obi ike ha nwere na a gaịe imezu ihe ọ na-achọ. Ọ bu ezie na anyị apụghị, anyị ekwesịghikwa ikwesi olu ike banyere umụ irighiri ihe dị iche iche, anyị pụrụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-elepụ anya ịhụ ihe ga-emenụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Tụlee akwụkwọ: You May Survive Armageddon Into God’s New World, peji 61, 292, 351; “Ka Eme Ihe l Nacho n’Uwa,” peji 347; Ụlọ Nche(Bekee) nke May 1, 1942, peji 133. (Ọ bụ ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc, bipụtara ha nile.)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya