Kwusaa Alaeze Ahụ
1 Ná Ndị Hibru 10:23, a gbara anyị ume ‘ijidesi nkwupụta nke olileanya anyị ike.’ Olileanya anyị na-adaberekwa n’Alaeze Chineke. Jisọs nyere iwu kpọmkwem na a ghaghị ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ ná mba nile. (Mak 13:10) Ọ dị anyị mkpa iburu nke a n’uche ka anyị na-eje ozi anyị.
2 Mgbe anyị zutere ndị mmadụ, anyị na-agbalị ịmalite mkparịta ụka banyere ihe na-amasị ha ma ọ bụ ihe na-echegbu ha. Anyị na-akpọtụkarị ihe ndị ha maara nke ọma, dị ka ime mpụ n’agbata obi, nsogbu ndị na-eto eto na-enwe, nchegbu banyere inweta ihe e ji ebi ndụ, ma ọ bụ ọgba aghara n’ihe omume ụwa. Ebe ọ bụ na uche nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ tụkwasịrị ná “nchegbu nke ndụ” ndị a, mgbe anyị gosiri na anyị nwere mwute, na-aghọtakwa, ndị mmadụ ga-ekwupụtakarị ihe dị n’uche ha. (Luk 21:34) Nke a pụrụ imeghere anyị ụzọ ikerịta olileanya anyị.
3 Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị elezighị anya, mkparịta ụka ahụ pụrụ ịdabere n’ihe ndị na-adịghị ewuli elu ruo n’ókè nke na anyị agaghị enwe ike imezu nzube anyị ji bịa—ikwusa ozi Alaeze ahụ. Ọ bụ ezie na anyị na-akpọtụ uche n’ọnọdụ ọjọọ ndị na-eweta ahụhụ dị ukwuu, ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịdọrọ uche gaa n’Alaeze ahụ, bụ́ nke ga-agwọta kpam kpam nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Anyị nwere olileanya dị ebube n’ezie nke dị ndị mmadụ oké mkpa ịnụ banyere ya. Ya mere ọ bụ ezie na anyị pụrụ ikwurịta akụkụ ụfọdụ nke ‘oge a dị oké egwu’ ná mmalite, anyị kwesịrị ịtụkwasị uche ngwa ngwa n’ozi anyị bụ isi, “ozi ọma ebighị ebi.” N’ụzọ dị otú a anyị ga-ejezu ozi anyị.—2 Tim. 3:1; 4:5; Mkpu. 14:6.