Ntụleghachi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke September 2 ruo December 23, 1996. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide ahụ, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. “Anụ ọhịa” ahụ nwere isi asaa na mpi iri a kọwara ná Mkpughe 13:1 abụghị onye ọzọ karịa Setan bụ́ Ekwensu. [uw p. 63 para. 4]
2. E nweghị “azụ ukwu” ọ bụla n’ezie nke nwere ike ilo mmadụ. (Jona 1:17) [w89 4/15 p. 31, igbe]
3. Amụma dị na Daniel 9:24, 25 na-atụ aka n’ọmụmụ Jisọs. [kl p. 36 para. 8]
4. Amụma dị na Maịka 3:12 na-arụtụ aka ná mbibi na ịtọgbọrọ n’efu Jerusalem nke bịara na 607 T.O.A. [w89 5/1 p. 15]
5. Ọ dị anyị mkpa ife Chineke n’ime mmụọ, ịbụ ndị obi jupụtara n’okwukwe na ịhụnanya na-akpali; nke ahụ bụ ihe nile a chọrọ anyị n’aka. [kl p. 45 para. 4]
6. Usoro ihe àmà atọ na-anwapụta na Jisọs bụ Mesaịa ahụ bụ (1) osuso ọmụmụ Jisọs, (2) amụma e mezuru, na (3) akaebe nke Jehova Chineke. [kl p. 34-38 para. 6-10]
7. N’ụzọ bụ isi, ọ bụ alaeze ebo abụọ nke Juda ka e bu n’uche dee amụma Hosea. [w89 3/1 p. 14]
8. Ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa inyocha ofufe anyị iji jide n’aka na e jighị omume nke asọpụrụghị Chineke metọọ ya, na-aghọtakwa echiche Chineke nke e setịpụrụ na James 1:27. [kl p. 51 para. 20]
9. Dị ka Zefanaịa 3:9 si kwuo, ndị Chineke ga-adị n’otu n’ụwa ọhụrụ n’ihi na ha nile ga-asụ otu asụsụ—Hibru. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 6/1 p. 30, igbe.]
10. Ná mmezu nke Daniel 12:1, Maịkael anọwo “na-eguzo” eri 1914 mgbe ọ ghọrọ Eze nke Alaeze eluigwe Chineke; n’isi nso ọ “ga-eguzo ọtọ” n’aha Jehova dị ka Eze Onye Agha a na-adịghị emeri emeri, na-ebibi usoro ajọ omume nke a. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w93 11/1 p. 23 para. 23.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Olee ndị bụ “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” e zoro aka n’ebe ha nọ na Hagaị 2:7, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ha si ‘abịa’? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 6/1 p. 31 para. 5.]
12. Okwu Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa site n’ọnụ ndị Hibru atọ ahụ na-ekpughe na nrubeisi ha nye Chineke adabereghị ná nchebe na nnapụta Chineke? (Dan. 3:16-18) [w88 12/1 p. 19 para. 14]
13. Akụkụ akwụkwọ nsọ dị aṅaa buru amụma banyere ebe ọmụmụ nke Mesaịa? [w89 5/1 p. 14 para. 5, igbe]
14. N’ihi gịnị ka ọrụ ndị dị ike a rụrụ n’aha Jisọs agaghị abụ ihe àmà e ji n’aka nke ihu ọma ma ọ bụ nkwado Chineke? [kl p. 46 para. 6-7]
15. Gịnị ka Abụ Ọma 2:2 na-egosi banyere ụzọ ndị nile ga-esi nabata Jisọs dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa? [kl p. 36 para. 9]
16. Ebe ọ bụ na e nwere ụdị ofufe ndị Jehova na-adịghị anakwere, gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị achọọ ka Chineke nakwere ofufe anyị? [kl p. 45 para. 5]
17. Ebe ọ bụ na ịnakwere Jisọs Kraịst dị ka Onyenwe anyị dị mkpa n’ezi ofufe, n’ihi gịnị ka Jisọs na-agaghị anakwere ụfọdụ ndị na-azọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya? [kl p. 46 para. 6, 7]
18. Ọ bụ ezie na ndị ndú okpukpe ndị Juu nke ụbọchị Jisọs chere na Chineke nakweere ofufe ha, olee otú Jisọs si lee ya anya, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee dị ka ha mere? [kl p. 48 para. 12, 13]
19. Na Hagaị 2:9, olee ụlọ nsọ bụ “ụlọ a,” olee nke bụ ‘nke mbụ,’ n’ihi gịnịkwa ka ebube nke “ụlọ a” ji dị ukwuu karịa ‘nke mbụ’? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 6/1 p. 30, igbe.]
20. Gịnị ka Hosea 14:2 na-agba ndị Israel ume ime, oleekwa otú Ndịàmà Jehova si emezu amụma ahụ taa? (Hib. 13:15) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 9/15 p. 10 para. 1-2.]
Denye okwu ma ọ bụ ahịrị okwu nke dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Onye amụma bụ́ _________________________ kpọrọ obodo _________________________ obodo ọbara n’ihe dị ka afọ 200 mgbe _________________________ rụsịrị ọrụ Chineke nyere ya n’ebe ahụ. [w89 4/15 p. 31 para. 1, w89 5/15 p. 24 para. 5]
22. Setan na-eji aghụghọ aranye ndị mmadụ imezu ọchịchọ _________________________ n’ụzọ _________________________ . [uw p. 65 para. 9]
23. Iji bụrụ ndị e chebere n’ụzọ ime mmụọ, anyị agaghị eleghara iyikwasị akụkụ ọ bụla nke ihe agha nile nke Chineke anya, nke na-agụnye _________________________ “ihe mgbochi obi nke _________________________ “nkwadebe nke _________________________ nke udo,” “ọta nke bụ _________________________ “okpu agha nke _________________________ na _________________________ nke mmụọ nsọ.” [uw p. 68 para. 14]
24. Ndị na-arapara n’okpukpe ọdịnala, ma n’ime Krisendọm ma n’èzí ya, na-eche na ha nwere mkpụrụ obi _________________________ nke ga-eme ka _________________________ ghara ịdị mkpa. [uw p. 71 para. 3]
25. Mgbe ndị Rom bibisịrị Jerusalem na _________________________ dị ka otu ndị, _________________________ pụrụ n’anya n’akụkọ ihe mere eme, dị nnọọ ka Obadaịa buworo n’amụma. [w89 4/15 p. 30 para. 2, igbe]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. A kpọrọ ndị inyom ahụ na-ahụ ndụ okomoko n’anya ndị bi na Sameria “nne ehi nke Beshan” n’ihi na ha (mara abụba ma nwee akụ̀: bi na Beshan; kwanyere di ha ka ha rigbuo ndị ogbenye) (Emọs 4:1) [w89 4/1 p. 22 para. 2, igbe]
27. Akwụkwọ Emọs, e dere n’ihe dị ka n’agbata (855 T.O.A.; 829 T.O.A.; 830 T.O.A.) na 804 T.O.A. na-eme ka a ghọta (ịdị njikere; ibu ụzọ mata ọdịnihu; ikike) Chineke nwere ibu ụzọ hụ ọdachi. [w89 4/1 p. 22 para. 2]
28. Mgbe o tolitesịrị ma malite ozi ya n’afọ ndụ nke (33; 29; 30), Jisọs gosipụtakwara (nkwanye ùgwù; mmasị; ịhụnanya) dị ukwuu o nwere maka ndị mmadụ ibe ya. [kl p. 40 para. 16]
29. (Pita; Jọn; Pọl) hotara Joel 2:32 (n’Ọrụ 2:40; Ndị Rom 10:13; 1 Timoti 2:4), bụ ebe ọ na-emesi ike mkpa nke ịkpọku aha Jehova. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 4/1 p. 20 para. 16.]
30. Otu eze na otu gọvanọ keere òkè n’igbu (Jemes; Stifen; Jisọs). Site mgbe ahụ gaa n’ihu ndị bụbu ndị iro bụ́ (Pọl; Banabas; Herọd) na (Kaịafas; Paịlet; Banabas) ghọrọ nnukwute enyi. [kl p. 36 para. 9]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na okwu ndị e depụtara n’okpuru: 1 Tim. 2:3, 4; Hos. 10:12; Zef. 2:1-3; Jes. 1:26, 27; 1 Jọn 2:15-17
31. Ka Chineke wee nakwere ofufe anyị, ọ bụghị nanị na a gaghị eji omume dị iche iche nke asọpụrụghị Chineke metọọ ya kamakwa ọ ga-agụnye ihe nile Chineke weere dị ka ihe dị mkpa. [kl p. 51 para. 20]
32. Site n’ime ihe ziri ezi ná ndụ anyị kwa ụbọchị, anyị ga-enweta ebere ịhụnanya Jehova. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 3/15 p. 23 para. 2-3.]
33. Anyị kwesịrị ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ iji nweta ezi ihe ọmụma Chineke ma mee uche ya, na-arapagidesi ike n’ihe ọ chọrọ maka ofufe a na-anakwere. [kl p. 52 para. 22]
34. Dị ka ezi ndị Kraịst, anyị aghaghị izere ihe omume ọ bụla na-egosipụta mmụọ nke ụwa asọpụrụghị Chineke dị anyị gburugburu. [kl p. 50 para. 17]
35. Iji bụrụ onye e zobere n’ụbọchị Jehova, ọ dị mkpa inwe ihe karịrị ihe ọmụma na-adịghị omimi nke Akwụkwọ Nsọ. [w89 6/1 p. 30 para. 4]