Abụ Ọma
2 Ndị eze ụwa na-ejikere,
Ndị isi na-ezukọtakwa ka otu ndị+
Ka ha lụso Jehova na onye o tere mmanụ ọgụ.+
3 Ha na-asị: “Ka anyị dọbisịa agbụ ha kere anyị,
Tụfusịakwa ụdọ ha.”
4 Onye nọ n’ocheeze n’eluigwe ga-achị ọchị.
Jehova ga-akwa ha emo.
5 N’oge ahụ, ọ ga-eji iwe gwa ha okwu,
Jirikwa oké iwe na-ewe ya yie ha egwu.
7 Ka m kọsaa ihe Jehova kwuru.
Ọ gwara m, sị: “Ị bụ ọkpara m.+
Abụrụla m nna gị taa.+
8 Rịọ m, m ga-enye gị mba dị iche iche ka ha bụrụ ihe i ketara,
Nyekwa gị ebe niile ụwa sọtụrụ ka ha bụrụ nke gị.+
10 Ugbu a, unu ndị eze, gosinụ na unu na-aghọta ihe.
Unu ndị na-ekpe ikpe n’ụwa, nabatanụ aka ná ntị a na-adọ unu.*
11 Na-atụnụ egwu Jehova mgbe unu na-efe ya,
Na-amakwanụ jijiji mgbe unu na-aṅụrị ọṅụ.
12 Kwanyerenụ ọkpara ya ùgwù,*+ ma ọ́ bụghị ya, Chineke* ga-ewe iwe,
Unu ewee laa n’iyi,+
N’ihi na o nwere ike iwe iwe ngwa ngwa.
Ndị niile na-agbaba n’ime ya na-enwe obi ụtọ.