Ihe Ọhụrụ nke Ga-enyere Anyị Aka Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl
1. Olee isiokwu ọhụrụ ga-agba n’Ụlọ Nche nke ọhaneze, gịnịkwa mere e ji dee ya?
1 Malite n’ọnwa Jenụwarị, a ga-enwe isiokwu ọhụrụ ga na-agba n’Ụlọ Nche nke ọhaneze. Ọ ga-enyere anyị aka ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ihe a kpọrọ isiokwu ahụ bụ, “Mụta Ihe n’Okwu Chineke.” Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwe ụlọ ga-achọ ịgụ isiokwu nke ọ bụla, ma ihe e bu n’obi dee isiokwu nke ọ bụla bụ ka anyị na ndị nwe ụlọ kwurịta ihe dị na ha.
2. Olee otú isiokwu ahụ ga na-adị?
2 Otú Ọ Ga Na-adị: Isiokwu ya na isiokwu nta ndị dị n’ime ya ga-abụ ajụjụ anyị nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ mgbe anyị na ya na-ekwurịta ya. E dere amaokwu Baịbụl ndị a ga-agụ agụ ka onye nwe ụlọ nwee ike iji aka ya gụọ ya otú ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ. E mere ka paragraf nke ọ bụla dị obere nke na anyị na onye nwe ụlọ nwere ike iji ya kwurịta okwu ma ọ bụrụgodị na onye ahụ enwechaghị ohere. N’isiokwu nke ọ bụla, e kwuru na onye chọrọ ịmatakwu ihe ahụ a kọwara nwere ike ịgụ akwụkwọ Bible Na-akụzi. Nke a ga-emekwa ka ọ dịrị gị mfe iji akwụkwọ Bible Na-akụzi mụwara onye nwe ụlọ ihe mgbe o kwesịrị ka i mee otú ahụ.
3. Mgbe ị nọ ozi ọma ụlọ na ụlọ, ole otú i nwere ike isi jiri isiokwu ọhụrụ a malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl ozugbo?
3 Otú A Ga-esi Eji Ya Akụziri Mmadụ Ihe: Mgbe ị na-enyefe magazin, i nwere ike ịjụ ajụjụ ga-eme ka onye nwe ụlọ nwee mmasị n’isiokwu ahụ. Dị ka ihe atụ, isiokwu dị n’Ụlọ Nche Jenụwarị 1 kọwara uru Baịbụl bara. I nwere ike ịjụ, sị: “Ì weere Baịbụl ka Okwu Chineke, ka ì weere ya ka akwụkwọ nkịtị dị mma ọgụgụ? [Chere ka ọ zaa.] M ga-egosi gị otu ihe ga-amasị gị banyere ihe a m jụrụ gị.” Gosi ya ajụjụ nke mbụ dị n’isiokwu ahụ, gụọ paragraf nke mbụ, gụọkwa amaokwu Baịbụl e kwuru ka a gụọ. Gụghachi ajụjụ ahụ, jụzie ya ihe o chere. Gị na ya tụlee ajụjụ ndị nke ọzọ, ole ọ bụla unu nwere ike ịtụle. Tupu ị lawa, gosi ya ajụjụ ọzọ unu ga-atụle, kwuokwanụ oge ọzọ ị ga-abịa. Gaghachi na nke ya n’izu ọ bụla ka unu tụlekwuo isiokwu ahụ ruo mgbe ị ga-ewetara ya magazin ọzọ. Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ịgwa onye nwe ụlọ na gị na ndị mmadụ na-amụ Baịbụl. Gwakwa ya na ị chọrọ igosi ya otú e si eme ya ozugbo ahụ. Jirizie isiokwu ọhụrụ a gosi ya otú gị na ndị mmadụ si eme ya.
4. Olee otú anyị ga-esi jiri isiokwu ọhụrụ a malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl ma anyị gaa nletaghachi?
4 I nwekwara ike iji isiokwu ọhụrụ a malite ọmụmụ Baịbụl ma ị gaa nletaghachi nakwa ma ị gaa na nke ndị ị na-enye magazin. Naanị ihe i nwere ike ikwu bụ: “E nwere ihe ọhụrụ gbara n’Ụlọ Nche. Ka m gosi gị otú e si eji ya amụ Baịbụl.” Ekpere anyị bụ ka isiokwu ọhụrụ a nyere ọtụtụ ndị aka ‘inweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’—1 Tim. 2:4.