Ndị Na-eto Eto—Olee Ihe Unu Ga-eji Ndụ Unu Eme? (Nkebi nke Mbụ)
Ka ndị na-eto eto na-etoru ogo mmadụ, ha ga-ekpebi ihe ha ga-eji ndụ ha mee. Baịbụl yiri map nke nwere ike inyere ndị na-eto eto aka ịma ihe ha kwesịrị ime. (Ilu 3:5, 6) Ọ bụrụ na ha ejiri Baịbụl zụọ akọnuche ha nke ọma, ọ ga-enyere ha aka ịna-eme ihe Chineke chọrọ. (Rom 2:15) Ka anyị tụleghachi ihe anyị mụrụ n’isiokwu bụ́, “Ndị Na-eto Eto—Olee Ihe Unu Ga-eji Ndụ Unu Eme?” nke dị n’Ụlọ Nche Nọvemba 15, 2010. Ọ ga-enyere ndị na-eto eto aka ịma ihe ha ga-eji ndụ ha eme. Ka anyị tụlee paragraf nke 1 ruo nke 11 n’Ụlọ Nche ahụ.
Ị laruo, biko gụọ paragraf ndị ọzọ dị n’isiokwu a ka i nwee ike ịza ajụjụ mgbe anyị ga-atụle ya n’izu ọzọ. Gụọkwa traktị bụ́, Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee? Gbalịakwa lee vidio bụ́, Young People Ask—What Will I Do With My Life? Traktị a na vidio a kwuru ihe ndị ga-abara ndị na-eto eto uru.