Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be p. 282-p. 285
  • Ntụziaka Nye Ndị Nlekọta Ụlọ Akwụkwọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ntụziaka Nye Ndị Nlekọta Ụlọ Akwụkwọ
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi nke Afọ 2015 Ga-enyere Anyị Aka Ịna-ezi Ihe nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Ụlọ Akwụkwọ nke Na-akwadebe Anyị Maka Ihe Ndị Kasị Mkpa
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Ntụziaka Maka Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
    Ntụziaka Maka Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
  • Otu Ụlọ Akwụkwọ Na-aga nke Ọma nke Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be p. 282-p. 285

Ntụziaka Nye Ndị Nlekọta Ụlọ Akwụkwọ

N’ỌGBAKỌ ọ bụla, a na-ahọpụta otu onye okenye ịbụ onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọ bụrụ na e nyewo gị ibu ọrụ a, ịnụ ọkụ n’obi gị maka ụlọ akwụkwọ ahụ na mmasị onwe onye i nwere n’ọganihu nke onye mmụta nke ọ bụla pụrụ ịtụnye ụtụ dị mkpa n’ihe ụlọ akwụkwọ ahụ na-arụzu n’ọgbakọ unu.

Otu akụkụ dị mkpa nke ọrụ gị bụ iduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke a na-enwe n’ọgbakọ unu kwa izu. Buru n’uche na n’oge nke ọ bụla, e nwere ndị ọzọ na-abịanụ tinyere ndị mmụta ndị nwere ihe omume. Duzie ụlọ akwụkwọ ahụ n’ụzọ ga-eme ka ọgbakọ dum nweta ihe ncheta ndị na-akpali akpali, ndị bara uru, ndị nwere ihe jikọrọ ha na otu n’ime ebumnobi nke ụlọ akwụkwọ ahụ ma ọ dịkarịa ala, bụ́ ndị e kwuru na peeji nke 5 ruo nke 8 n’akwụkwọ a.

Nwee mmasị ná ndị mmụta nile, ma è kenyere ha ihe omume ịgụ ihe, ime ihe omume ndị a na-eme n’ụdị ihe ngosi, ma ọ bụ ikwu okwu. Nyere ha aka ile ihe ha na-eme anya ọ bụghị nanị dị ka ihe omume kama dị ka ohere ha nwere inwe ọganihu n’ozi ha na-ejere Jehova. Otú ọ dị, mgbalị ha onwe ha na-etinye dị oké mkpa n’ọganihu ha. Ma ọ dịkwa mkpa ka i gosi mmasị obiọma, nyere ha aka ịghọta uru isi ihe ndị a ga-enye ndụmọdụ na ha bara, ma kọwaara ha otú a pụrụ isi tinye ndụmọdụ dị otú ahụ n’ọrụ. Iji mezuo nke ahụ, ṅaa ntị nke ọma n’okwu nke ọ bụla ka i wee nwee ike ikwu ihe ndị bara uru.

Jide n’aka na ị malitere ma mechie ụlọ akwụkwọ n’oge. Setịpụ ezi ihe nlereanya site n’ime ka ihe ndị gị onwe gị ga-ekwu ghara ịgafe oge e nyere maka ha. Ọ bụrụ na okwu onye mmụta agafee oge, gị onwe gị ma ọ bụ onye na-enyere gị aka kwesịrị inye ya ihe àmà. Onye mmụta ahụ kwesịrị ikwutọpụ ahịrịokwu ya ma si n’elu ikpo okwu pụọ. Ọ bụrụ na ihe omume ọzọ agafee oge, gbubilata ihe ndị gị onwe gị ga-ekwu, mgbe ahụ soro nwanna ahụ kwurịta ya mgbe a gbasara nzukọ.

Mgbe ị nọ ya, i kwesịrị iduzi ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ dị mgbe ị na-agaghị enwe ike ịnọ ya, onye okenye ọzọ òtù ndị okenye buru ụzọ họpụta kwesịrị ịhụ maka ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ enyemaka n’ịkwadebe usoro ihe omume, idepụta na ikesa mpempe akwụkwọ e ji ekenye ihe omume, ma ọ bụ ime ndokwa maka ndị ga-anọchi anya ndị ọzọ n’usoro ihe omume, ohu na-eje ozi nke òtù ndị okenye kenyere ya pụrụ inye aka n’ihe ndị a.

Idebanye Aha Ndị Mmụta. Gbaa ndị nkwusa nile ume idebanye aha ha n’ụlọ akwụkwọ. Ndị ọzọ so ọgbakọ na-akpachi anya pụrụ idebanye aha ha ma ọ bụrụ na ha kwenyere n’ihe Bible na-akụzi, ndụ ha ekwekọọkwa n’ụkpụrụ Ndị Kraịst. Mgbe mmadụ kwupụtara ọchịchọ ka e debanye aha ya, jaa ya mma nke ọma. Ọ bụrụ na onye ahụ aghọbeghị onye nkwusa, i kwesịrị, dị ka onye nlekọta ụlọ akwụkwọ, isoro ya kwurịta ihe ndị a chọrọ iji debanye aha n’ụlọ akwụkwọ, ọ kasị mma ime ya n’ihu onye na-eduziri ya ọmụmụ Bible (ma ọ bụ n’ihu nne ma ọ bụ nna ya kwere ekwe). Ihe ndị a a chọrọ bụ otu ihe ahụ a chọrọ n’aka mmadụ tupu ọ ghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ha dị na peeji nke 97 ruo 99 ná Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị. Nwee ihe ndepụta nwere ihe ọmụma kasị ọhụrụ nke ndị nile debanyere aha ha n’ụlọ akwụkwọ ahụ.

Iji Fọm Ndụmọdụ Eme Ihe. Fọm ndụmọdụ nke onye mmụta ọ bụla dị n’ime akwụkwọ ya, na peeji nke 79 ruo 81. Dị ka àgwà ha na-egosi, a pụrụ iji isi ihe ọ bụla a ga-enye ndụmọdụ na ya mee ihe, malite na nke 1 ruo nke 17, mgbe e nyere onye mmụta ihe omume ịgụ ihe. Maka ihe omume ndị a na-eme n’ụdị ihe ngosi, a pụrụ iji isi ihe ọ bụla a ga-enye ndụmọdụ na ya mee ihe ma e wezụga nke 7, nke 52, na nke 53. Ndụmọdụ a ga-enye maka okwu a ga-ekwu ekwu na-agụnye isi ihe nile e wezụga nke 7, nke 18, na nke 30.

Mgbe e kenyere mmadụ isi ihe a ga-enye ndụmọdụ na ya, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ kwesịrị ịhụ na e ji pensịl denye ihe n’okpuru “Ụbọchị E Kenyere Ya” n’oghere dịdewere isi ihe ahụ na fọm ndụmọdụ nke dị n’ime akwụkwọ nke onye mmụta ahụ. Mgbe onye mmụta ahụ mesịrị ihe omume ya, jụọ ya mgbe nanị ya nọ ma o mere ihe omume (ndị) e gosiri ná ngwụsị nke ntụle isi ihe ahụ a ga-enye ndụmọdụ na ya. Ọ bụrụ na o mere ya, e kwesịrị ịkanye akara n’igbe dị na fọm ahụ. Ọ bụrụ na ị na-atụ aro ka ọ nọgide na-arụ ọrụ n’otu isi ihe ahụ a ga-enye ndụmọdụ na ya, ọ dịghị ihe ọzọ ọ dị mkpa ka e denye na fọm ndụmọdụ ahụ; edenyela ihe ọ bụla n’oghere maka “Ụbọchị E Mesịrị Ya.” E kwesịrị idenye ihe na ya nanị mgbe ọ dị njikere ịgafe n’isi ihe ọzọ. Ọzọkwa, na peeji nke 82 n’akwụkwọ nke onye mmụta ahụ, e kwesịrị idenye akara ụbọchị n’aka ekpe nke ọnọdụ okwu e jiri mee ihe mgbe ọ bụla o kwusịrị okwu onye mmụta. E nwere ohere dị na fọm ndụmọdụ ahụ nakwa n’ihe ndepụta nke ọnọdụ okwu ka e wee nwee ike iji nke ọ bụla mee ihe ugboro abụọ. Ndị mmụta kwesịrị ijide akwụkwọ ha n’oge ihe omume na-aga n’ihu.

Kenye nanị otu isi ihe a ga-enye ndụmọdụ na ya n’otu oge. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ na-akasị mma ikenye isi ihe ndị a ga-enye ndụmọdụ na ha n’usoro ahụ e ji depụta ha. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị mmụta ụfọdụ egosipụta nkà pụrụ iche, ị pụrụ ịgba ha ume ịmụ na itinye ụfọdụ ihe ọmụmụ n’ọrụ n’onwe ha. Mgbe ahụ ị pụrụ inyere ha aka n’isi ihe ndị ahụ i chere ga-akasị tụnye ụtụ n’uto ha dị ka ndị ọkà okwu na ndị ozizi dị irè.

Ọ bụrụgodị na e debawo aha onye mmụta n’ụlọ akwụkwọ kemgbe ọtụtụ afọ, ọ pụrụ irite uru dị ukwuu site n’ịmụ na itinye ihe ọmụmụ nke ọ bụla n’ọrụ. Iji nyere ndị mmụta bụ́ ndị nwere mkpa ụfọdụ kpọmkwem aka, ị pụrụ ịhọrọ nkà okwu ụfọdụ ka ha rụọ ọrụ na ha kama ịgbaso fọm ndụmọdụ ahụ n’usoro e ji depụta ha.

Inye Ndụmọdụ. Mgbe ị na-enye ndụmọdụ, jiri ihe atụ na ụkpụrụ ndị sitere na Bible mee ihe nke ọma. Ndị mmụta kwesịrị ịchọpụta na ndụmọdụ a na-enye nakwa mmụọ e ji na-enye ya bụ nke ụkpụrụ ndị dị elu nke Okwu Chineke na-eduzi.

Buru n’uche na ị bụ ‘onye ọrụ ibe’ nke ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị. (2 Kọr. 1:24) Dị ka ha, ọ dị gị mkpa ịnọgide na-etinye mgbalị inwe ọganihu dị ka onye ọkà okwu na onye ozizi. Mụọ n’onwe gị akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, tinyekwa ndụmọdụ ya n’ọrụ, setịpụkwa ezi ihe nlereanya ka ndị ọzọ wee mee otú ahụ.

Ka ị na-eme otú ahụ, mee ya ihe mgbaru ọsọ gị inyere ndị mmụta aka ịghọ ndị na-agụ ihe nke ọma, ndị ọkà okwu ruru eru, na ndị ozizi dị irè. Iji mezuo nke ahụ, gbalịa inye aka n’ụzọ ọ bụla dị mkpa ka ndị mmụta wee ghọta ihe nkà okwu dị iche iche bụ, ihe mere ha ji dị mkpa, na ụzọ isi zụlite ha. A haziri akwụkwọ a n’ụzọ ga-enyere gị aka ime nke ahụ. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, a na-achọ n’aka gị ihe karịrị nanị ịgụpụta ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ a. Tụlee isi ihe ha na-ekwu na ụzọ isi tinye ha n’ọrụ.

Ọ bụrụ na onye mmụta mere nke ọma n’otu isi ihe, jaa ya mma. Kwuo ná mkpirikpi ihe mere o ji dị irè ma ọ bụ ihe ihe o mere ji dị mkpa. Ọ bụrụ na ọ pụrụ irite uru site n’ilebakwu anya n’otu ihe, hụ na ọ ghọtara ihe kpatara ya. Soro ya tụlee otú ọ ga-esi mee ya. Kpọọ okwu aha, ma n’otu mgbe ahụ, nwee obiọma.

Ghọta na ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ibili ọtọ gwa ìgwè mmadụ okwu. Ọ bụrụ na mmadụ echee na ya emeghị nke ọma, ọ pụrụ ịdị na-eche ma ya kwesịrị ịnọgide na-agbalị. Ṅomie Jizọs, bụ́ onye na-egwepịaghị “ahịhịa amị e chihịara echihịa” ma ọ bụ menyụọ “ogho oriọna na-akwụ anwụrụ.” (Mat. 12:20) Buru mmetụta uche nke onye mmụta ahụ n’uche. Mgbe ị na-enye ndụmọdụ, ka ihe ga-eduzi gị bụrụ ma onye mmụta ahụ ọ bụ onye ọhụrụ ka ọ bụ onye mmụta nweworo ahụmahụ. Ezi ịja mma, nke na-ekpo ọkụ pụrụ ime ka ndị mmadụ nwekwuo obi ike ịnọgide na-eme ike ha.

Mesoo onye mmụta ọ bụla n’ụzọ nkwanye ùgwù. Ndị Rom 12:10 na-agwa anyị, sị: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” Lee ndụmọdụ kwesịrị ekwesị ọ bụ nye onye ndụmọdụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke! Ọ bụrụ na onye mmụta ahụ tọrọ gị, jiri nlezianya tinye ndụmọdụ ahụ e nyere na 1 Timoti 5:1, 2, n’ọrụ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị afọ ole mmadụ dị, mgbe e ji obiọma nye ya ndụmọdụ ndị metụtara ịgbanwe ụzọ o si eme ihe, ọ na-anabatakarị ya.—Ilu 25:11.

Mgbe ị na-enye ndụmọdụ, mesie ebumnobi nke ọzụzụ a na-enye ike nye onye mmụta ahụ. Ebumnobi ahụ abụghị nanị ime nke ọma ka e wee jaa ya mma ma gwa ya ka ọ gafee n’isi ihe ọzọ a ga-enye ndụmọdụ na ya. Nzube ya abụghị iji bụrụ ọkà okwu na onye ozizi ndị ọzọ ga-enwe mmasị n’ebe ọ nọ. (Ilu 25:27) Ihe anyị chọrọ bụ iji onyinye anyị nke ikwu okwu too Jehova ma nyere ndị ọzọ aka ịmata ya na ịhụ ya n’anya. Ọzụzụ anyị na-anata bụ iji kwadebe anyị ịrụ ọrụ ahụ a kọwara na Matiu 24:14 na 28:19, 20, n’ụzọ dị irè. Ka oge na-aga a pụrụ ịkpọ ụmụnna nwoke e mere baptizim bụ́ ndị ruru eru òkù ka ha soro na-elekọta “ìgwè atụrụ Chineke” dị ka ndị ọkà okwu ihu ọha na ndị ozizi.—1 Pita 5:2, 3.

Tụọrọ ndị mmụta aro ka ha gụọ ebe a tụlere isi ihe ọzọ a ga-enye ha ndụmọdụ na ya n’ime akwụkwọ a n’ime ụbọchị ole na ole mgbe e kenyesịrị ya. Gbaa ha ume iji ihe ha na-amụta na-eme ihe mgbe ha na-akwadebe ihe omume ha maka ụlọ akwụkwọ, ná mkparịta ụka ha na-enwe kwa ụbọchị, n’ịza ajụjụ ná nzukọ, nakwa n’ozi ubi.

Ikenye Ihe Omume. Dị ka o kwesịrị ịdị, e kwesịrị ime nke a izu atọ ma ọ dịkarịa ala tupu oge eruo. E kwesịrị ide ihe omume nile dị otú ahụ ede ma o kwe mee.

Ọ bụ ndị okenye ka e kwesịrị ikenye ihe omume ndị metụtara izi ọgbakọ ihe, ọ ga-akasị mma ka ọ bụrụ ndị ga-eme ihe omume ndị dị otú ahụ n’ụzọ dị irè, nakwa ndị ohu na-eje ozi, ndị bụ́ ezigbo ndị ozizi ka a ga-ekenye ha.

N’ikpebi ihe omume onye mmụta ndị a ga-ekenye ụmụnna nwoke na ndị a ga-ekenye ụmụnna nwanyị, gbasoo ntụziaka ndị e nyere n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụ na ụmụnna nwoke e nwere dị ole na ole ma e nwere ọtụtụ ụmụnna nwanyị na-ekwu okwu ndị mmụta, lezie anya hụ na ị na-enye ụmụnna nwoke ohere zuru ezu ikwu okwu ndị na-abụghị nanị ịgụ ihe.

Buru ọnọdụ ndị mmadụ n’otu n’otu n’uche mgbe ị na-eke ihe omume. Ọ̀ dị mkpa ikenye otu onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi okwu n’ụlọ akwụkwọ n’otu ụbọchị ahụ o nwere ihe omume ná Nzukọ Ije Ozi ma ọ bụ n’otu izu ahụ o nwere okwu ihu ọha n’ọgbakọ? Ọ̀ dị mkpa ikenye otu nwanna nwanyị ihe omume n’otu ụbọchị ahụ e kenyere otu n’ime ụmụ ya ndị na-eto eto, bụ́ onye ọ pụrụ ịdị mkpa na ọ ga-enyere aka, ihe omume? Isiokwu ahụ ò kwesịrị ekwesị, karịsịa n’ihe banyere onye na-eto eto ma ọ bụ onye mmụta a na-emebeghị baptizim? Chọpụta iji jide n’aka na ihe omume dabara adaba n’isi ihe a ga-enye ndụmọdụ na ya, bụ́ nke onye mmụta ahụ na-arụ ọrụ na ya.

Maka ihe omume ndị a na-ekenye ụmụnna nwanyị, dị ka ọ na-adịkarị, onye mmụta ahụ ga-eji aka ya họrọ ọnọdụ okwu ya n’ikwekọ ná ntụziaka ndị dị na peeji nke 78 na nke 82. E kwesịrị ikenye ya otu onye inyeaka, ma ọ pụrụ inwekwa onye inyeaka ọzọ. Ọ bụrụ na onye mmụta arịọ ka e nye ya onye inyeaka ga-akasị daba adaba n’otu ọnọdụ okwu, e kwesịrị ilebara arịrịọ ahụ anya.

Klas Ndị Ọzọ. Ọ bụrụ na e nwere ihe karịrị ndị mmụta 50 e debanyere aha ha, unu pụrụ iche echiche iji ebe ndị ọzọ na-eme ihe maka ihe omume ndị mmụta. Dị ka mkpa ọgbakọ sị dị, a pụrụ iji ndokwa a mee ihe maka ihe omume nile nke ndị mmụta ma ọ bụ nanị maka abụọ ndị ikpeazụ.

Nke ọ bụla n’ime klas ndị ọzọ ahụ kwesịrị inwe onye ndụmọdụ ruru eru, ọ ga-akasị mma ka ọ bụrụ okenye. N’ebe ọ dị mkpa, a pụrụ iji ohu na-eje ozi ruru nnọọ eru mee ihe. Òtù ndị okenye kwesịrị inye nkwado maka ndị ndụmọdụ a. Soro ha na-arụkọ ọrụ n’ụzọ chiri anya ka e wee nọgide na-enyekwuru ndị mmụta aka n’ụzọ dị irè n’agbanyeghị ebe ha ga-anọ mee ihe omume ha ọzọ.

Klas Pụrụ Iche Maka Ịmụ Otú E Si Agụ Ihe. Ọ bụrụ na òtù ndị okenye ekpebie na ọ dị ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ mkpa inweta ọzụzụ bụ́ isi n’otú e si agụ ihe n’asụsụ a na-asụ n’ọgbakọ ha, unu pụrụ ime ndokwa maka nke a n’ihe banyere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọzụzụ a pụrụ ịgụnye nkà ndị bụ́ isi n’ịmụta otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe, ma ọ bụ nzube ya pụrụ ịbụ ịdị na-agụ ihe nke ọma karị.

Ọ bụghị iwu na a ga na-enwe klas ndị ahụ n’otu oge ahụ a nọ na-eme ihe omume ndị mmụta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Iji nye aka n’ụzọ zuru ezu, a pụrụ ịchọkwu oge karịa otú a pụrụ iwepụtali n’oge ụlọ akwụkwọ na-aga n’ihu. Ndị okenye ọgbakọ pụrụ ikpebi ihe a chọrọ na mgbe a ga na-enye ọzụzụ dị otú ahụ. Dị ka mkpa si dị, a pụrụ ime ndokwa izi ihe n’ìgwè ma ọ bụ n’otu n’otu.

A chọrọ onye ozizi ruru eru. Ọ ga-aka mma ka e kenye nwanna nwoke nke na-agụ ihe nke ọma na onye maara asụsụ ahụ nke ọma ọrụ ahụ. Ọ bụrụ na e nweghị nwanna nwoke ga-eme ya, ndị okenye pụrụ ịgwa nwanna nwanyị ruru eru, onye bụ́ ezi ihe nlereanya ka o nye aka. O kwesịrị ikechi isi mgbe ọ na-akụziri ìgwè ahụ ihe.—1 Kọr. 11:3-10; 1 Tim. 2:11, 12.

E wepụtawo akwụkwọ nta bụ́ Apply Yourself to Reading and Writing n’ọtụtụ asụsụ. Na Nigeria, a na-ebipụta broshuọ bụ́ How to Read and Write na Bekee. A haziri akwụkwọ ndị a maka iji ha na-akụzi nkà ndị bụ́ isi n’otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe. A pụkwara iji akwụkwọ ndị ọzọ kụzie ihe, na-adabere n’ikike ịgụ ihe nke ndị debanyere aha ha. Mgbe ndị mmụta nweworo ọganihu ruo n’ókè zuru ezu, e kwesịrị ịgba ha ume ikere òkè n’usoro ihe omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke a na-enwe mgbe nile.

Dị ka onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji mee ka ọgbakọ rite uru. Kwadebe nke ọma, n’ikwekọkwa na ndụmọdụ dị ná Ndị Rom 12:6-8, lekọta ihe omume gị dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa Chineke nyefere gị n’aka ilekọta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya