Foto nke aka ekpe: Ebe otu nwanna nwaanyị nọ n’Alabama, nke dị n’Amerịka, ji gramafon na-akpọ okwu Nwanna Rutherford. Ihe a mere ihe dị ka n’afọ 1938; foto nke aka nri: Obodo Swizaland
NKEBI NKE 1
Eziokwu Gbasara Alaeze Chineke—Ịkụziri Ndị Mmadụ Okwu Chineke
KA E were ya na gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl nọ na-amụ ihe, unu asapeta otu amaokwu Akwụkwọ Nsọ gbasara ihe unu na-amụ, gị agụọ ya ma kọwara ya ihe ebe ahụ na-ekwu. Ya aghọta ihe ị kọọrọ ya ma na-ele gị anya. Obere oge ya ajụọ gị, sị, “Ihe ị na-agwa m ugbu a ọ̀ bụ na ụwa a ga-aghọ paradaịs anyị ebiri na ya ruo mgbe ebighị ebi?” Onye gị na ya so amụmụọ ọnụ ọchị ma jụọ ya, sị, “Ọ́ bụghị ihe ebe a anyị gụrụ na Baịbụl ugbu a kwuru?” Onye ahụ ị na-amụrụ Baịbụl anọrọ jii, fufee isi, ma kwuo, sị, “Kemgbe m gawara chọọchị, a kụzitụbereghị m ụdị ihe a.” Gị ekwuo n’obi gị na o kwukwara ụdị ihe a izu ole na ole gara aga, mgbe ị kụziiri ya na aha Chineke bụ Jehova.
Ụdị ihe a ò metụla gị? Ụdị ihe a emetụla ọtụtụ ụmụnna anyị. E nwere ihe ụfọdụ na-eme ka anyị cheta ihe ndị magburu onwe ha Chineke kụziiri anyị. Ihe ahụ ọ kụziiri anyị bụ eziokwu dị na Baịbụl. Chetụgodị echiche ma jụọ onwe gị, sị, “Olee otú m si mụta eziokwu?” Anyị ga-aza ajụjụ a ná nkebi a. Eziokwu a Chineke ji nwayọọ nwayọọ na-akụziri ndị ya na-egosi na Alaeze Chineke dị adị n’eziokwu. Kemgbe otu narị afọ ugbu a, Eze nke Alaeze a, bụ́ Jizọs Kraịst, na-agbasi mbọ ike na-akụziri ndị Chineke eziokwu a.