Ụwa Nke Akụ̀ Na Ụba Kewasịrị
SITE n’ihe dị ka afọ 1945 ruo 1989, ụwa lụrụ Agha Nzuzo. N’oge ahụ, ụwa kewara ụzọ atọ ma a bịa n’ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mba ndị nọ n’ọchịchị Kọmụnist, bụ́ nke Union of Soviet Socialist Republics nọ n’isi ha na mba ndị na-anọghị n’ọchịchị Kọmunist, bụ́ nke United States nọ n’isi ha, ejighị anya ahụ ibe ha. Mba ndị na-akwụnyeghịrị nke ọ bụla n’ime òtù abụọ ahụ mejupụtara ihe a sị na ọ bụ Ụwa nke Atọ.
Ma, ka e mesịrị, a bịara lewe okwu ahụ bụ́ “Ụwa nke Atọ” anya dị ka okwu mkparị, ma jirizie okwu bụ́ “mba ndị na-emepeghị emepe” dochie ya. Ka oge na-aga, e lewekwara okwu nke a anya ọjọọ. N’ihi ya, ndị ọkà n’ihe banyere ịhazi akụ̀ na ụba malitere iji okwu bụ́ “mba ndị na-emepe emepe” mewe ihe. N’ụzọ dị otú a, okwu ahụ kwụsịziri ịbụ nke e ji egosi ọdịiche e nwere n’ihe banyere ọchịchị, ma ghọzie nke e ji egosi ọdịiche e nwere n’ihe banyere akụ̀ na ụba.
Ugbu a, na narị afọ nke 21 a, ụwa abụghịzikwa nke e kewara ụzọ atọ ahụ e kwuru banyere ha n’elu ma a bịa n’ihe banyere ọchịchị. Ma, a bịa n’ihe banyere ọnọdụ akụ̀ na ụba na inwe ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe, a ka nwere ọdịiche n’etiti mba ndị mepere emepe na mba ndị na-emepe emepe. Ndị njem bụ́ ndị si mba ndị mepere emepe na-eso ndị ogbenye, bụ́ ndị na-adọga inweta ihe ha riri, emekọ ihe.
Ya mere, ọ dị mkpa ịjụ, sị: Ọ̀ bụ iwu na ụwa ga-anọgiderịrị bụrụ nke e kewara ekewa n’ihe banyere ọnọdụ akụ̀ na ụba? Ka à pụrụ ime ka ndị ọgaranya na ndị ogbenye hara nhata site n’ime ka ọnọdụ obibi ndụ ha bụrụ otu?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
© Qilai Shen/Panos Pictures