Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 58 p. 140-p. 141 para. 3
  • E Bibiri Jeruselem

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Bibiri Jeruselem
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Amụma E Buru Gbasara Mezaya—Nnukwu Osisi Sida
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • Ije Ozi “n’Oge Ikpeazụ”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Jehova Ga-akwụghachi Onye Ọ Bụla Dị Ka Ọrụ Ya Si Dị
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Oge Ihe Dị Iche Iche Mere ná Ndụ Ezikiel
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 58 p. 140-p. 141 para. 3
Ebe a na-agba Jeruselem na ụlọ nsọ dị na ya ọkụ

ISI NKE 58

E Bibiri Jeruselem

Ndị Juda kwụsịrị ife Jehova ọtụtụ ugboro ma fewe arụsị. Jehova gbalịrị inyere ha aka ruo ọtụtụ afọ. O zigara ọtụtụ ndị amụma ka ha dọọ ha aka ná ntị, ma ha egeghị ntị. Kama, ha nọ na-achị ha ọchị. Olee otú Jehova si mee ka ha kwụsị ikpere arụsị?

N’oge ahụ, eze Babịlọn bụ́ Nebukadneza nọ na-alụso obodo dị iche iche agha, na-emerikwa ha. Oge mbụ o meriri Jeruselem, o jidere Eze Jehoyakin, ndị isi Juda, ndị dike ha, na ndị omenkà ha ma kpụrụ ha niile laa Babịlọn. O bukwaara akụ̀ niile dị n’ụlọ nsọ Jehova. Nebukadneza meziri Zedekaya eze Juda.

Mgbe Zedekaya malitere ịchị Juda, o rubeere Nebukadneza isi. Ma, obodo ndị dị Juda nso na ndị amụma ụgha gwara ya ka o nupụrụ ndị Babịlọn isi. Jeremaya gwara Zedekaya, sị: ‘Ọ bụrụ na i nupụrụ ya isi, a ga-enwe ụkọ nri na Juda, ndị bi na ya ga-arịa ọrịa, a ga-egbukwa ha.’

Mgbe Zedekaya chịchara afọ asatọ, o nupụụrụ ndị Babịlọn isi. Ọ gwara ndị agha Ijipt ka ha bịa nyere ya aka. Nebukadneza zigara ndị agha ya ka ha gaa lụso Jeruselem agha, ha agaa gbaa ya gburugburu. Jeremaya gwara Zedekaya, sị: ‘Jehova kwuru na ọ bụrụ na ị chịliere ndị Babịlọn aka elu, ha agaghị egbu gị, ha agaghịkwa ebibi Jeruselem. Ma ị jụ, ndị Babịlọn ga-agba Jeruselem ọkụ, dọrọkwa gị n’agha.’ Zedekaya gwara Jeremaya, sị: ‘Agaghị m achịliri ha aka elu.’

Mgbe otu afọ na ọnwa isii gachara, ndị agha Babịlọn kwaturu mgbidi Jeruselem, gbaakwa obodo ahụ ọkụ. Ha gbara ụlọ nsọ ya ọkụ, gbuo ọtụtụ ndị, dọrọkwa ọtụtụ puku mmadụ n’agha.

Zedekaya si na Jeruselem gbapụ, ma ndị Babịlọn chụwara ya jide ya. Ha jidere ya n’ebe dị nso na Jeriko ma kpụgara ya Nebukadneza. Nebukadneza gburu ụmụ Zedekaya ndị nwoke n’ihu ya. Ọ rụkpọziri Zedekaya anya ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ, ya anọrọ ebe ahụ nwụọ. Ma, Jehova kwere ndị Juda nkwa, sị: ‘Afọ iri asaa gachaa, m ga-eme ka unu laghachi na Jeruselem.’

Olee ihe ga-eme ụmụaka ndị so ná ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn? Hà ga na-erubere Jehova isi?

“Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ikpe gị ziri ezi, e kwesịkwara ịtụkwasị ya obi.”​—Mkpughe 16:7

Ajụjụ: Ònye bụ Nebukadneza? Olee ihe o mere Jeruselem? Ònye bụ Zedekaya?

2 Ndị Eze 24:1, 2, 8-20; 25:1-24; 2 Ihe E Mere 36:6-21; Jeremaya 27:12-14; 29:10, 11; 38:14-23; 39:1-9; Ezikiel 21:27

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya