Gịnị Ka Ụfọdụ Ndị Chere na Amagedọn Bụ?
“Ha wee kpọkọta ha n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn [Amagedọn] n’asụsụ Hibru.”—MKPUGHE 16:16.
GỊNỊ na-agbata gị n’obi ma ị nụ “Amagedọn”? O nwere ike ịbụ na ihe na-agbata gị n’obi bụ nnukwu ọdachi nke ga-egbuchapụ ndị mmadụ. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi na ndị isi okpukpe na-ekwukarị banyere Amagedọn n’agbanyeghị na ọ bụ naanị otu ebe ka e dere ya na Baịbụl.
Ihe ndị mmadụ na-ekwukarị banyere Amagedọn ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl kwuru? Ọ dị mkpa ka ị mata azịza ajụjụ a. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ị mata ihe Amagedọn bụ n’eziokwu, ụjọ na-atụkarị ndị mmadụ agaghịzi na-atụ gị, ọ ga-eme ka i nwee olileanya, meekwa ka ị ghara ịna-ele Chineke anya ọjọọ.
Lebagodị anya n’ajụjụ atọ na-esonụ ma chọpụta ihe dị iche n’ihe ọtụtụ ndị na-ekwu banyere Amagedọn na ihe Baịbụl kwuru.
1. AMAGEDỌN Ọ̀ BỤ ỌDACHI NDỊ MMADỤ GA-AKPATA?
Ndị na-eme nchọpụta na ndị nta akụkọ na-ekwukarị na “Amagedọn” bụ ọdachi ndị mmadụ na-akpata. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị sịrị na Agha Ụwa nke Mbụ na nke Abụọ bụ Amagedọn. Mgbe a lụchara agha abụọ ahụ, ụjọ nọ na-atụ ndị mmadụ na mba Amerịka na Sọviet Yuniọn ga-eji ngwá agha ga-egbukpọ ndị mmadụ lụso ibe ha agha. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi kpọrọ agha ahụ a tụrụ ụjọ na ha ga-alụ “agha Amagedọn nke a ga-eji ngwá agha ga-egbukpọ ndị mmadụ lụọ.” Taa, ọtụtụ ndị na-eme nchọpụta na-atụ ụjọ na otú ndị mmadụ si emebisị ụwa ga-eme ka ụwa laa n’iyi. Ha kpọkwara otú a ụwa nwere ike isi laa n’iyi “Amagedọn.”
Ihe a ha na-ekwu pụtara na ọ bụ ndị mmadụ ga-ekpebi ihe ga-eme ụwa a na ihe niile dị n’ime ya nakwa na ọ bụrụ na ndị ọchịchị emeghị ihe ha kwesịrị ime, ụwa ga-ala n’iyi.
Ihe Baịbụl kwuru bụ na Chineke agaghị ekwe ka ndị mmadụ laa ụwa a n’iyi. Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Jehovaa ekeghị ụwa a ka ọ tọgbọrọ “n’efu.” Kama, o kere ya ka ndị mmadụ “biri n’ime ya.” (Aịzaya 45:18) Chineke agaghị ekwe ka ndị mmadụ laa ụwa a n’iyi, kama nke ahụ, ọ ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.
2. AMAGEDỌN Ọ̀ BỤ ỌDACHI GA-EMERE ONWE YA?
Mgbe ụfọdụ, nnukwu ọdachi mee, ndị nta akụkọ na-akpọ ya “Amagedọn.” Dị ka ihe atụ, n’afọ 2010, otu akwụkwọ kwuru na “e nweela ‘Amagedọn’ na Heiti.” Ihe mere akwụkwọ ahụ ji kwuo ihe a bụ n’ihi otú ala ọma jijiji mere ná mba ahụ si gbuo ndị mmadụ, mebisịa ihe ha ma mee ka ndị mmadụ taa ahụhụ. Ọ bụghị naanị ọdachi ndị merela eme ka ndị nta akụkọ na ndị na-eme fim na-akpọ “Amagedọn,” ha na-akpọkwa ndị nke ha chere ka ga-eme eme “Amagedọn.” Dị ka ihe atụ, ha na-ekwu na nkume nwere ike isi n’eluigwe dakwasị ụwa ma bibie ya. Ha sịrị na ihe a ha chere ga-emenụ bụ “Amagedọn.”
Ihe a ha na-ekwu pụtara na Amagedọn na-egbu onye ọ bụla ọ hụrụ, ma ndị ọma ma ndị ọjọọ, nakwa na ihe ọ sọkwara mmadụ mee, ọ ga-egburịrị ya.
Ihe Baịbụl kwuru bụ na Amagedọn agaghị egbu onye ọ bụla ọ hụrụ. Naanị ndị Amagedọn ga-egbu bụ ndị ajọ omume. Baịbụl kwere nkwa na n’oge na-adịghị anya, “onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya.”—Abụ Ọma 37:10.
3. CHINEKE Ọ̀ GA-EJI AMAGEDỌN BIBIE ỤWA A?
Ọtụtụ ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche kweere na otu ụbọchị, ọgụ ikpeazụ kpụ ọkụ n’ọnụ ga-ada n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ nke ga-emezi ka e kpochapụ ụwa. Otu ụlọ ọrụ dị n’Amerịka nke na-eme nnyocha gbara ọtụtụ ndị ajụjụ ọnụ banyere “Amagedọn.” Ụlọ ọrụ a kwuru na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara ndị toro eto ha gbara ajụjụ ọnụ ahụ kweere na ọ bụ “agha Amagedọn” ga-ebibi ụwa.
Ihe a ha na-ekwu pụtara na Chineke ekeghị ndị mmadụ ka ha biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi nakwa na o keghị ụwa ka ọ dịruo ebighị ebi. Ọ pụtakwara na mgbe Chineke kere ndị mmadụ, o bu n’obi na o nwere mgbe ha niile ga-anwụcha.
Ihe Baịbụl kwuru bụ na Chineke “tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5) Baịbụl kwuru banyere ndị bi n’ụwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
N’eziokwu, ihe ọtụtụ ndị na-ekwu banyere Amagedọn adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru. Oleezi nke bụ́ eziokwu?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Baịbụl kwuru na Jehova bụ aha Chineke.