Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 10/1 p. 7
  • Ozi Ọma A Chọrọ Ka Mmadụ Niile Nụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ọma A Chọrọ Ka Mmadụ Niile Nụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Na-abara ma Anyị ma Ndị Ọzọ Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ezi Iso Ụzọ Kraịst Na-enwe Mmeri!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 10/1 p. 7

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ?

Ozi Ọma A Chọrọ Ka Mmadụ Niile Nụ

Mkpọli a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ mere ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike, meekwa ka ha jiri ọrụ o nyere ha kpọrọ ihe. Pọl onyeozi gara n’ebe dị iche iche n’Eshia Maịnọ nakwa n’obodo ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian. O hiwere ọtụtụ ọgbakọ Ndị Kraịst n’ebe ndị ahụ ma gbaa Ndị Kraịst ahụ ume ka ha ghara ikwe ka àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ a na-akpagbu ha mee ka ha daa mbà. N’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara Ndị Kraịst, ha mụbara, ozi ha gbasakwara ebe niile.

E mechara tụọ Pọl mkpọrọ. Ma mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, o degaara ọgbakọ Ndị Kraịst akwụkwọ ozi ndị o ji gbaa ha ume ma nye ha ndụmọdụ. Ọ gwara ha ka ha kpachara anya maka na nke ka njọ ka ga-eme, ya bụ, na e nwere Ndị Kraịst ga-ahapụ ezi ofufe. Mmụọ nsọ Chineke mere ka Pọl mata na ndị yiri ‘anụ ọhịa wolf obi tara mmiri’ ga-abata n’etiti Ndị Kraịst, na-ekwu “ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.”—Ọrụ Ndịozi 20:29, 30.

Mgbe ọ na-erule afọ 96 Oge Ndị Kraịst, e nweela Ndị Kraịst hapụrụ ezi ofufe. N’oge ahụ, Jizọs, bụ́ onye nọzi n’eluigwe mgbe ahụ, mere ka Jọn onyeozi hụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Jọn dere ha n’akwụkwọ Mkpughe. Ihe Jọn dere gosiri na ndị mmegide ma ọ bụ ndị nkụzi ụgha agaghị emeli ka Chineke ghara imezu ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ. O kwuru na “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile” ga-anụ ozi ọma Alaeze Chineke. (Mkpughe 14:6) A ga-eme ka ụwa bụrụghachi paradaịs. Onye ọ bụla chọkwara ime uche Chineke nwere ike ibi na ya.

Í cheghị na ihe ndị a Baịbụl kwuru bụ “ozi ọma”? Ọ bụrụ otú ahụ, gbalịa ka ị mụtakwuo ihe ndị Chineke kwuru gbasara ụmụ mmadụ, bụ́ ndị e dere na Baịbụl, chọpụtakwa otú ihe ndị ahụ nwere ike isi baara gị uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu.

I nwere ike ịga n’Ịntanet danloduo Baịbụl na www.jw.org. I nwekwara ike ịnọ n’ebe ahụ gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?, na Ozi Ọma Si n’Aka Chineke. I nwekwara ike ịgụ akwụkwọ ndị ọzọ kwuru ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na Baịbụl si n’aka Chineke nakwa otú anyị ga-esi eme ihe Baịbụl kwuru ma n’ezinụlọ anyị ma ná ndụ anyị. I nwekwara ike ịgwa Ndịàmà Jehova ka ha kọwakwuoro gị ihe ndị na-edoghị gị anya.

​—Ihe a kọrọ n’isiokwu a si n’Ọrụ Ndịozi, Ndị Efesọs, Ndị Filipaị, Ndị Kọlọsi, Faịlimọn, 1 Jọn, Mkpughe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya