Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 4 p. 4-7
  • Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndụ na Ọnwụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndụ na Ọnwụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • BAỊBỤL MERE KA ANYỊ MATA NKE BỤ́ EZIOKWU
  • OTÚ OZIZI MKPỤRỤ OBI ANAGHỊ ANWỤ ANWỤ SI GBASAA
  • “EZIOKWU AHỤ GA-EMEKWA KA UNU NWERE ONWE UNU”
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Nkwenye Gị ná Mbilite n’Ọnwụ Siruru n’Ike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ụzọ I Si Ele Mkpụrụ Obi Anya Na-emetụta Ndụ Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Mkpụrụ Obi Ọ̀ Na-adịgide Mgbe A Nwusịrị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Olileanya Ka Mma Maka Mkpụrụ Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 4 p. 4-7
Ihe a bụ ozu dị n’ili

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU GBASARA NDỤ NA ỌNWỤ?

Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndụ na Ọnwụ

Akwụkwọ Jenesis kọọrọ anyị ihe Chineke gwara nwoke mbụ o kere aha ya bụ Adam. Ọ sịrị ya: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.” (Jenesis 2:​16, 17) Ihe a Chineke gwara Adam gosiri na á sị na o gere Chineke ntị, ọ garaghị anwụ. Kama, ọ gaara anọgide na-adị ndụ n’ogige Iden.

Mgbe Adam na Iv karala nká

Ọ dị mwute na kama Adam irubere Chineke isi ma dịrị ndụ ebighị ebi, o nupụụrụ ya isi. Nwunye ya nyere ya mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila, ya erie. (Jenesis 3:​1-6) Nsogbu ihe a Adam mere kpatara ka na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ taa. Pọl onyeozi kwuru banyere ya, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) “Otu mmadụ” ahụ bụ Adam. Ma, olee ihe mere ihe ahụ Adam mere ji bụrụ mmehie, oleekwa ihe mere o ji kpata ọnwụ?

Adam kpachaara anya nupụrụ Chineke isi ma ọ bụ mebie iwu ya. Ihe a o mere bụ mmehie. (1 Jọn 3:⁠4) Dị ka Chineke gwara Adam, ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ. Ọ bụrụ na Adam na ụmụ ya ana-erubere Chineke isi, ha agaghị abụ ndị mmehie, ha agaghịkwa anwụ anwụ. Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ, kama o kere ha ka ha dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

O doro anya na ọnwụ ‘agbasaala ruo mmadụ niile,’ otú ahụ Baịbụl kwuru. Ma, è nwere ihe na-esi anyị n’ahụ́ pụọ gaa biri ebe ọzọ ma anyị nwụọ? Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na e nwere. Ha na-ekwu na e nwere ihe dị anyị n’ime a na-akpọ mkpụrụ obi, nakwa na ọ naghị anwụ anwụ. Ma, ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na Chineke ghaara Adam ụgha. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na e nwere ihe na-esi anyị n’ahụ́ pụọ gaa biri ebe ọzọ ma anyị nwụọ, ọ pụtara na ihe ahụ Chineke kwuru, ya bụ, na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, abụghị eziokwu. Ma, Baịbụl kwuru, sị: ‘Ọ gaghị ekwe omume na Chineke ga-agha ụgha.’ (Ndị Hibru 6:18) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ Setan bụ onye na-agha ụgha n’ihi na ọ gwara Iv, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.”​—⁠Jenesis 3:⁠4.

Ugbu a, ajụjụ bụ, ọ bụrụ na ozizi ahụ bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ abụghị eziokwu, gịnịzi na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

BAỊBỤL MERE KA ANYỊ MATA NKE BỤ́ EZIOKWU

Akwụkwọ Jenesis gwara anyị otú Chineke si kee mmadụ. Ọ sịrị: “Jehova bụ́ Chineke wee jiri ájá si n’ala kpụọ mmadụ ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya, mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” E si n’okwu Hibru bụ́ ne’phesh,a sụgharịa okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi dị ndụ.” Ihe okwu ahụ pụtara bụ “ihe dị ndụ nke na-eku ume.”​—⁠Jenesis 2:⁠7.

Ihe a niile na-egosi na Baịbụl mere ka o doo anya na mgbe Chineke kere mmadụ, o kenyeghị ya mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ n’ime. Kama, mmadụ ọ bụla bụ “mkpụrụ obi dị ndụ.” Ọ bụ ya mere na ị chọọ elu, chọọ ala, e nweghị ebe ị ga-ahụ “mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ” na Baịbụl.

Ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na Chineke ekenyeghị ihe ụfọdụ ndị na-akpọ mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ n’ime mmadụ, oleezi ihe mere ọtụtụ okpukpe ji akụzi na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ? Iji mata, ka anyị leba anya n’ihe ndị Ijipt oge ochie kweere.

OTÚ OZIZI MKPỤRỤ OBI ANAGHỊ ANWỤ ANWỤ SI GBASAA

E nwere onye Grik na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Herodotus. Ọ dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga. O kwuru na ndị Ijipt bụ “ndị mbụ kwuru na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ.” Ndị Babịlọn oge ochie bụ ndị ọzọ kweere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Tupu Alegzanda Onye Ukwu emerie Izrel na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu n’afọ 332 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị ọkà mmụta Grik nọ na-akụziri ndị mmadụ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ihe a mere ka ozizi a gbasaa n’obodo niile ndị Grik na-achị.

E nweghị ebe ị ga-aga na Baịbụl hụ “mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ”

N’oge ndịozi Jizọs, òtù ndị Juu abụọ a ma ama aha ha bụ ndị Esin na ndị Farisii kụziri na mmadụ nwụọ, mkpụrụ obi ya na-apụ gaa ebe ọzọ biri. Akwụkwọ a na-akpọ The Jewish Encyclopedia kwuru, sị: “Ọ bụ ndị Grik kụziiri ndị Juu na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Onye kacha kụzie ya bụ onye Grik a ma ama aha ya bụ Plato.” Otu onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme n’oge ndịozi Jizọs aha ya bụ Josephus kwuru na ozizi a esighị na Akwụkwọ Nsọ, kama na o si na “nkwenkwe ndị Grik.” Josephus weere nkwenkwe a ka akụkọ ifo.

Ka ozizi ndị Grik a bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ nọ na-agbasa, ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst bịara kwere na ya, ma malite ịkụziri ya ndị mmadụ. Otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Jona Lendering kwuru, sị: “Plato kụziiri ndị mmadụ na e nwere mgbe mkpụrụ obi anyị nọ n’ebe mara mma, ma ugbu a, na ha nọzi n’ụwa ọjọọ. Ọ bụ ihe a mere ndị ahụ sị na ha bụ Ndị Kraịst ji kwere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ ma na-akụzi ya.” Ọ bụ otú a ka ha si malite ịkụzi ozizi ndị ọgọ mmụọ a, ya esoro n’isi ihe ha na-akụziri ndị mmadụ.

“EZIOKWU AHỤ GA-EMEKWA KA UNU NWERE ONWE UNU”

N’oge ndịozi Jizọs, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Okwu nke si n’ike mmụọ nsọ kwuru hoo haa na n’oge ikpeazụ, ụfọdụ ga-adapụ n’okwukwe, na-aṅa ntị n’okwu nduhie ndị si n’aka mmụọ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:⁠1) Ihe a o kwuru bụ ihe na-eme taa. Ozizi mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ so ‘n’ozizi ndị mmụọ ọjọọ.’ O sighị na Baịbụl, kama, o si n’aka ndị ọgọ mmụọ na ndị ọkà mmụta oge ochie.

Ma, obi dị anyị ụtọ na Jizọs gwara anyị, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:32) Ọ bụrụ na anyị amụta eziokwu dị na Baịbụl, ọ ga-eme ka anyị nwere onwe anyị n’ozizi ụgha na ihe ndị na-adịghị mma ọtụtụ okpukpe na-eme taa. Ọ ga-emekwa ka anyị nwere onwe anyị ná nsogbu dị iche iche nkwenkwe ụgha na omenala ndị a na-eme banyere ndị nwụrụ anwụ na-akpatara ndị mmadụ.​—⁠Gụọ igbe bụ́ “Olee Ebe Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?”

Ọ bụghị uche Chineke ka ụmụ mmadụ na-ebi naanị afọ iri asaa ma ọ bụ afọ iri asatọ n’ụwa a, gazie ebe ọzọ biri ruo mgbe ebighị ebi. Ihe o bu n’uche kee anyị bụ ka anyị biri n’ụwa a ruo mgbe ebighị ebi ma na-erubere ya isi. Ihe a gosiri na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. E nweghịkwa ihe ga-eme ka ọ ghara imezu ihe a bụ́ uche ya. (Malakaị 3:⁠6) O si n’ọnụ otu ọbụ abụ mee ka obi sie anyị ike. Ọ sịrị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi”​—⁠Abụ Ọma 37:29.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ndụ na ọnwụ, gụọ isi nke 6 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig. Ihe a nwekwara ike ibuga gị ebe ahụ.

a Otú Bible Nsọ nke Union Version si sụgharịa ne’phesh bụ, “madụ ahụ we ghọ nkpuru obi di ndu.” Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik sụgharịrị ya “mmadụ ahụ wee ghọọ onye dị ndụ,” ebe Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society sụgharịkwara ya “nke mere ka mmadụ ghọọ mmadụ dị ndụ.”

Mmadụ Ọ̀ Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi?

Afọ ole na ole gara aga, ndị na-eme nchọpụta kwuru na e nwere ahịhịa ụfọdụ ha hụrụ n’ala Oké Osimiri. Ha kwuru na ahịhịa ndị a anọọla ọtụtụ puku afọ. Ọ ga-abụ na ha adịla ndụ karịa ihe ọ bụla dị ndụ n’ụwa. Ụdị ahịhịa a juru eju n’ala Oké Osimiri Mediterenian nke dị n’agbata Spen na Saịprọs.

Ọ bụrụ na ahịhịa ga-adịru ndụ otú a, ụmụ mmadụ kwanụ? Ụfọdụ ndị sayensị na-amụ gbasara ịka nká kwuru na ha nwere olileanya ime ka mmadụ na-adị ogologo ndụ. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ kwuru gbasara ịka nká sịrị na ndị sayensị “e nweela ọtụtụ ihe ọhụrụ ha mepụtara” ná mbọ ha na-agba ka mmadụ na-adị ogologo ndụ. Anyị amabeghị ma hà ga-emecha mee ka mmadụ na-adị ogologo ndụ.

Ma, ndị sayensị agaghị emeli ka mmadụ dị ndụ ebighị ebi. Baịbụl kwuru na ọ bụ Jehova Chineke, onye kere anyị, ga-emeli ya. Ọ sịrị: “N’ihi na ọ bụ gị bụ isi iyi nke ndụ.” (Abụ Ọma 36:⁠9) Jizọs kpere ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:⁠3) Anyị gbalịa mata Jehova Chineke na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst, na-eme ihe dị ha mma, anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi.

Ahịhịa mmiri

Ndị na-eme nchọpụta kwuru na ụdị ahịhịa a na-adị n’ala Oké Osimiri anọọla ọtụtụ puku afọ

OLEE EBE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ NỌ?

Mgbe Jizọs na-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ

Baịbụl kwuru na ndị nwụrụ anwụ nọ n’ili, na-echere mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:​28, 29) Ha anaghị ata ahụhụ ebe ahụ n’ihi na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:⁠5) Mgbe Jizọs na-akụziri ndị mmadụ ihe, o ji ọnwụ tụnyere oké ụra. (Jọn 11:​11-14) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ ma ọ bụ na-achụrụ ha àjà ka obi na-adị ha mma. Ha enweghị ike inyere anyị aka ma ọ bụ merụọ anyị ahụ́ n’ihi na “ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol.” (Ekliziastis 9:10) Ma, Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, meekwa ka ọnwụ ghara ịdị ruo mgbe ebighị ebi.​—⁠1 Ndị Kọrịnt 15:​26, 55; Mkpughe 21:⁠4.

Ihe Mere I Ga-eji Tụkwasị Ihe Baịbụl Kwuru Obi

Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. N’ihi gịnị? Lebagodị anya n’ihe ndị na-esonụ.

  • Abụba ọkụkọ na komkom ịnk

    Uche Chineke Ka E Dere na Ya: Baịbụl nwere akwụkwọ iri isii na isii. Ọ bụ ihe dị ka mmadụ iri anọ dere ya. O were ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ isii iji dechaa ya. A malitere ide ya n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, dechaa ya n’ihe dị ka afọ 98 Oge Ndị Kraịst. Ma, ihe e dere na ya na-ekwu otu ihe, ha anaghị emegide ibe ha. Ihe a gosiri na ọ bụ uche Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ka e dere na ya. Ọ bụ ya gwara ndị dere ya ihe ha dere.

  • Mgbidi

    Akụkọ Ndị A Kọrọ na Ya Mere Eme: Ihe ndị mere eme gosiri na ihe ndị a kọrọ na Baịbụl bụ eziokwu. Otu akwụkwọ aha ya bụ A Lawyer Examines the Bible kwuru, sị: “Ndị na-akọ akụkọ ndị na-atọ ụtọ na akụkọ ifo na-elezi anya akọ ihe ndị ha sị na ha mere n’ebe dị anya, nakwa ihe a na-amaghị mgbe ha mere, . . . ma ndị dere akụkọ ndị dị na Baịbụl na-ekwu nnọọ oge ha mere na ebe ha mere.”

  • Atom

    Ihe O Kwuru Banyere Sayensị Bụ Eziokwu: Baịbụl abụghị akwụkwọ sayensị. Ma, mgbe ọ bụla o kwuru gbasara sayensị, ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. O kwukwara ihe ndị ahụ ọtụtụ afọ tupu ndị sayensị amata banyere ha. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ iwu e nyere ndị Izrel na Levitikọs isi iri na atọ na isi iri na anọ. E kwuru banyere ịdị ọcha na ịkpọpụ onye na-arịa ọrịa na-efe efe iche n’iwu ndị ahụ. Chineke nyere ha iwu a ọtụtụ afọ tupu ndị mmadụ amata banyere nje na otú ọrịa si efe mmadụ. Baịbụl kwukwara na ụwa dị gburugburu, nakwa na e nweghị ihe e kokwasịrị ụwa na ya. Ma, ọ bụ mgbe ọtụtụ narị afọ gachara ka ndị sayensị chọpụtara na ihe a bụ eziokwu.​—⁠Job 26:7; Aịzaya 40:⁠22.

Ihe ndị a bụ ihe atụ ole na ole na-egosi na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie.”​—⁠2 Timoti 3:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya