Job
5 “Biko, kpọọ òkù! Ọ̀ dị onye na-aza gị?
Ònye n’ime ndị nsọ ka ị ga-agbakwuru?
2 N’ihi na iwe ga-egbu onye nzuzu,
Anyaụfụ ga-egbukwa onye ọ na-adị mfe ịrata.
3 Mụ onwe m ahụwo ka onye nzuzu na-agbanye mgbọrọgwụ,+
Ma na mberede amalitere m ịbụ ebe obibi ya ọnụ.
5 Onye agụụ na-agụ na-eri ihe onye ahụ wetara n’ubi;
Mmadụ na-ewere anụ ọ bọrọ abọ n’ebe o konyere ya,
Ọnyà na-anwakwa ijide akụ̀ ha.
6 N’ihi na ihe ọjọọ adịghị esi n’ájá nkịtị epupụta,
Nsogbu adịghịkwa esi n’ala nkịtị epulite.
7 N’ihi na a mụrụ mmadụ ịta ahụhụ,
Dị ka ikerike ọkụ si efeli elu.
8 Otú ọ dị, mụ onwe m ga-ajụ Chineke ase,
Ọ bụkwa Chineke ka m ga-enyefe okwu m,+
9 Onye na-eme oké ihe ndị a na-apụghị ịchọpụtacha achọpụtacha,
Ihe dị ebube a na-apụghị ịgụta ọnụ;+
10 Onye na-eme ka mmiri zoo n’elu ụwa,+
Onye na-ezipụkwa mmiri ka o zoo n’ala;+
11 Onye na-eme ka ndị dị ala nọrọ n’ebe dị elu,+
Ka ndị na-eru uju wee nọrọ n’ebe dị elu ha n’ihi nzọpụta ha nwetara;
12 Onye na-akụghasị atụmatụ ndị aghụghọ,+
Ka aka ha wee ghara ịrụpụta ihe;
13 Onye na-ejide ndị maara ihe n’aghụghọ ha,+
Onye na-emekwa ka atụmatụ ndị aghụghọ ghọọ ihe mgbagwoju anya;+
14 Ha na-ezute ọchịchịrị ọbụna n’ehihie,
Ha na-asọgharịkwa ìsì n’etiti ehihie dị ka ọ̀ bụ n’abalị;+
15 Onye na-azọpụta mmadụ ná mma agha nke si ha n’ọnụ,
Na-anapụtakwa ogbenye n’aka onye dị ike,+
16 Ka olileanya wee dịrị onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+
Ma ajọ omume na-emechi ọnụ ya.+
17 Lee! Obi ụtọ na-adịrị onye Chineke na-abara mba;+
Ajụkwala ịdọ aka ná ntị nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile!
18 N’ihi na ya onwe ya na-eme ka ndị mmadụ nwee ihe mgbu, ma ọ na-ekechi ọnyá ha;
Ọ na-etijasị ndị mmadụ, ma aka ya na-agwọ ha.
22 Ị ga-achị mbibi na agụụ ọchị,
Ị gaghịkwa atụ anụ ọhịa nke ụwa egwu.
24 Ị ga-amarakwa na udo bụ ụlọikwuu gị,
Ị ga-agakwa hụ ala anụ ụlọ gị na-ata ahịhịa, ọ dịghịkwa ihe ị ga-achọ achọ.
27 Lee! Nke a bụ nchọpụta anyị meworo. Otú ahụ ka ọ dị.
Nụrụ ya, gị onwe gị kwa, mara ya.”