Ntụziaka e nyere onye nduzi nke ụbọ akwara. Abụ olu ụtọ, abụ.
67 Chineke ga-emere anyị amara wee gọzie anyị;+
Ọ ga-eme ka anyị nweta ihu ọma ya+—Sila—
2 Ka e wee mara ụzọ gị n’ụwa,+
Marakwa nzọpụta gị n’etiti mba niile.+
3 Ka ndị dị iche iche too gị, Chineke;+
Ka ndị dị iche iche, ha niile, too gị.+
4 Ka mba dị iche iche ṅụrịa ọṅụ, tiekwa mkpu ọṅụ,+
N’ihi na ị ga-ekpe ndị dị iche iche ikpe ziri ezi;+
Ị ga na-edukwa mba dị iche iche n’elu ụwa. Sila.
5 Ka ndị dị iche iche too gị, Chineke;+
Ka ndị dị iche iche, ha niile, too gị.+
6 Ala ga-emepụta ihe nke ọma;+
Chineke bụ́ Chineke anyị ga-agọzi anyị.+
7 Chineke ga-agọzi anyị,+
Nsọtụ niile nke ụwa ga-atụkwa egwu ya.+