16 Nwa agbọghọ ahụ mara mma nke ukwuu,+ ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ọ dịghị nwoke ya na ya nweworo mmekọahụ;+ o wee gbadaa n’isi mmiri ahụ wee malite ịgbanye mmiri n’ite mmiri ya, e mesịa, ọ gbagotere.
7 O wee bụrụ onye na-elekọta+ Hadasa, ya bụ, Esta, nwa nwanne nna ya,+ n’ihi na o nweghị ma nna ma nne; nwa agbọghọ ahụ makwara mma n’ahụ́, dịkwa mma ile anya,+ ma mgbe nne ya na nna ya nwụrụ Mọdekaị kpọọrọ ya dị ka nwa ya nwaanyị.