6 Jehova nwere mma agha. Ọ ga-ejupụta n’ọbara.+ A ga-eme ka o jupụta n’abụba, jupụtakwa n’ọbara ụmụ ebule na mkpi, na abụba+ si n’akụrụ ebule. N’ihi na Jehova nwere àjà ọ kwadebere na Bọzra, ọ ga-asụkwa ndị mmadụ akwụ n’ala Idọm.+
13 “N’ihi na ejiriwo m onwe m ṅụọ iyi,”+ ka Jehova kwuru, “na ọ dịghị ihe ọzọ Bọzra+ ga-aghọ ma ọ bụghị ihe ijuanya,+ ihe nkọcha, ihe a lara n’iyi na ihe a bụrụ ọnụ; obodo ya niile ga-aghọkwa ebe a lara n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.”+