4 “Abụ m onye mbịarambịa na onye ọbịa n’etiti unu.+ Nyenụ m ebe m ga na-eli ozu n’ala unu ka ọ bụrụ nke m, ka m wee lie onye nwụnahụrụ m ka ọ pụọ m n’anya.”+
9 O ji okwukwe biri dị ka ọbịa n’ala nkwa ahụ dị ka à ga-asị na o bi n’ala ọzọ,+ biekwa n’ụlọikwuu,+ ya na Aịzik+ na Jekọb,+ bụ́ ndị ha na ya na-eketa otu nkwa ahụ.+