11 Ewoo, Jehova, biko, ka ntị gị nụrụ ekpere ohu gị na ekpere+ ndị ohu gị, bụ́ ndị ịtụ egwu aha gị+ na-atọ ụtọ; biko, mee ka ohu gị nwee ihe ịga nke ọma taa,+ meekwa ka ọ bụrụ onye nwoke a ga-emere ebere.”+
10 N’ihi na a ghaghị ime ka anyị niile pụta ìhè n’ihu oche ikpe Kraịst,+ ka onye ọ bụla wee nweta ụgwọ ọrụ ya maka ihe ndị o ji ahụ́ ya mee, dị ka ihe ndị o mere si dị, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ.+