18 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye kere eluigwe,+ Onye bụ́ ezi Chineke,+ Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya,+ Onye mere ka o guzosie ike,+ onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya:+ “Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ.+
11 “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto+ na nsọpụrụ+ na ike,+ n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile,+ ọ bụkwa n’ihi uche gị+ ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.”+