13 Ha wee sị: “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ.+ Anyị bụ ụmụ otu nwoke+ nke nọ n’ala Kenan; lee, nwanne anyị nke ọdụdụ na nna anyị nọ taa,+ ma onye nke ọzọ anọkwaghị.”+
7 Ha wee sị: “Nwoke ahụ jụrụ ajụjụ kpọmkwem banyere anyị na ndị ikwu anyị, sị, ‘Nna unu ọ̀ ka nọ ndụ?+ Ùnu nwere nwanne ọzọ?’ anyị wee kọọrọ ya ihe ndị a.+ Ò nwere otú anyị ga-esi mara na ọ ga-asị, ‘Kpọtanụ nwanne unu’?”+