38 Otú ọ dị, ọ sịrị: “Nwa m agaghị eso unu gaa, n’ihi na nwanne ya nwoke anwụwo, ọ fọdụkwara naanị ya.+ Ọ bụrụ na ọ nwụọ n’ihe mberede n’ụzọ, unu ga-eme ka m jiri mwute gbadaruo Shiol+ n’isi awọ́ m.”
7 Ha wee sị: “Nwoke ahụ jụrụ ajụjụ kpọmkwem banyere anyị na ndị ikwu anyị, sị, ‘Nna unu ọ̀ ka nọ ndụ?+ Ùnu nwere nwanne ọzọ?’ anyị wee kọọrọ ya ihe ndị a.+ Ò nwere otú anyị ga-esi mara na ọ ga-asị, ‘Kpọtanụ nwanne unu’?”+