19 A na-enye gị onwe gị iwu+ ka ị gwa ha, sị: “Meenụ ihe a: Sinụ n’ala Ijipt were ụgbọala+ unu ga-eji bute ụmụntakịrị unu na ndị nwunye unu, unu ga-ejikwa otu bute nna unu n’ebe a.+
47Josef wee bịa kọọrọ Fero, sị:+ “Nna m na ụmụnne m na ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha nakwa ihe niile ha nwere esiwo n’ala Kenan bịa, lee, ha nọ n’ala Goshen.”+