5 O wee kpọpụta ya n’èzí wee sị: “Biko, lelie anya n’eluigwe gụọ kpakpando ndị a ọnụ, ma ọ bụrụ na i nwere ike ịgụta ha.”+ O wee gaa n’ihu ịsị ya: “Otú a ka mkpụrụ gị ga-adị.”+
5 Ị ga-ekwukwa n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, sị, ‘Nna m bụ onye Siria nke nọ na-ala n’iyi;+ o wee gbadaa Ijipt+ ma biri n’ebe ahụ dị ka ọbịa, ya na mmadụ ole na ole;+ ma n’ebe ahụ, ọ ghọrọ mba ukwu, nke dị ike ma dị ọtụtụ.+
12 N’ihi ya, sitekwa n’aka otu nwoke,+ onye dị ka onye nwụrụ anwụ,+ a mụtara ụmụ dị nnọọ ọtụtụ ka kpakpando dị n’eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.+