4 ‘M ga-eme ka mkpụrụ gị mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe, m ga-enyekwa mkpụrụ gị ala a niile;+ ọ bụkwa site ná mkpụrụ gị ka mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha,’+
5 Otú ọ dị, o nyeghị ya ihe nketa ọ bụla n’ime ya, ee e, ọbụnadị otu amaụkwụ;+ kama o kwere nkwa iwere ya nye ya ka ọ bụrụ nke ya,+ na iwere ya nye mkpụrụ ya nke ga-anọchi ya,+ mgbe ọ na-enwebeghị nwa.+