28“Ma gị onwe gị, kpọta Erọn nwanne gị, ya na ụmụ ya ndị ikom, ka ha si n’etiti ụmụ Izrel bịakwute gị, ka o wee bụrụ onye nchụàjà m,+ ya bụ, Erọn,+ Nedab na Abaịhu,+ Elieza na Ịtama,+ bụ́ ụmụ Erọn.
43 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eyi ya mgbe ha na-abanye n’ụlọikwuu nzute ma ọ bụ mgbe ha na-agaru ebe ịchụàjà ahụ iji jee ozi n’ebe nsọ ahụ, ka ha wee ghara ibutere onwe ha njehie wee nwụọ. Ọ bụ ụkpụrụ ga-adịrị ya na ụmụ ya ga-anọchi ya, ruo mgbe a na-akaghị aka.+
15 Ị ga-etekwa ha mmanụ dị ka i tere nna ha mmanụ,+ ha ga-abụ ndị nchụàjà m, mmanụ ị ga-ete ha ga-eme ka ha na-eje ozi dị ka ndị nchụàjà ruo mgbe a na-akaghị aka n’ọgbọ ha niile.”+