44 N’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu;+ unu ga-edo onwe unu nsọ, unu ga-adịkwa nsọ,+ n’ihi na adị m nsọ.+ Ya mere, unu ejila ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè mee ka mkpụrụ obi unu ghara ịdị ọcha.
30 Unu ga-arụzukwa ọrụ dịịrị unu n’ebe m nọ wee ghara ime nke ọ bụla n’omenala rụrụ arụ ndị e meworo tupu unu abịa,+ ka unu wee ghara iji ha mee onwe unu ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”
5 Sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “N’ụbọchị m họọrọ Izrel,+ m welikwara aka m elu+ ṅụọrọ mkpụrụ nke ụlọ Jekọb iyi,+ meekwa ka ha mara m n’ala Ijipt.+ Ee, m weliri aka m ṅụọrọ ha iyi, sị, ‘Abụ m Jehova Chineke unu.’+