22 Iwe Chineke wee dị ọkụ maka na ọ gawara; mmụọ ozi Jehova wee guzo n’ụzọ iguzogide ya.+ Ọ nọ n’elu nne ịnyịnya ibu ya na-aga, mmadụ abụọ na-ejere ya ozi sokwa ya.
16 Mgbe Devid leliri anya, ọ hụrụ mmụọ ozi Jehova+ ka o guzo n’agbata eluigwe na ụwa ma tụdo Jeruselem mma agha ya ọ mịpụtara amịpụta;+ Devid na ndị okenye, bụ́ ndị yi ákwà iru uju,+ wee gbuo ikpere n’ala ozugbo, kpudo ihu n’ala.+