8 Ndị ikom niile nwere obi amamihe+ n’ime ndị na-arụ ọrụ ahụ wee rụọ ụlọikwuu ahụ,+ kweekwa ákwà ụlọikwuu iri ndị e ji ezigbo eri linin a kpara akpa na eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie kwee; ọ kpara cherọb na ha, dị ka nke onye na-akpa ihe n’ákwà kpara.