14 “‘Ọ bụrụkwa na onye mbịarambịa bi n’etiti unu dị ka ọbịa, ya onwe ya kwa ga-akwadebe àjà ememme ngabiga a na-emere Jehova.+ Dị ka ụkpụrụ ememme ngabiga na usoro ya si dị ka ọ ga-eme ya.+ Otu ụkpụrụ ga-adịrị unu, ọ ga-adịrị ma onye mbịarambịa ma nwa afọ ala unu.’”+
3 Ruo ụbọchị asaa, erikọtala ya na ihe ọ bụla e tinyere ihe iko achịcha.+ Ị ga-erikọta ya na achịcha na-ekoghị eko, bụ́ achịcha mmekpa ahụ́, n’ihi na i ji ọsọ ọsọ pụta n’ala Ijipt,+ ka i wee na-echeta ụbọchị i si n’ala Ijipt pụta, ruo ụbọchị niile nke ndụ gị.+
7 Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta,+ dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo+ nwa atụrụ ememme ngabiga+ anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.+