6Jehova wee gwa Mozis, sị: “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m gaje ime Fero,+ n’ihi na ọ bụ aka dị ike ga-eme ka ọ hapụ ha ka ha laa, ọ bụkwa aka dị ike ga-eme ka ọ chụpụ ha n’ala ya.”+
34 Ka Chineke ọ̀ nwara iji ihe nnwapụta,+ ihe ịrịba ama+ na ọrụ ebube+ na agha+ na aka dị ike+ na ogwe aka ọ gbatịrị agbatị+ na ihe na-eme ka a tụọ oké egwu+ si n’etiti mba ọzọ kpọpụtara onwe ya otu mba, dị ka ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu meere unu n’Ijipt n’ihu unu si dị?
10 I wee mee ihe ịrịba ama ma rụọ ọrụ ebube megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ndị ala ya niile,+ n’ihi na ị maara na ha mesoro ha omume mpako;+ i wee meere onwe gị aha+ dị ka ọ dị taa.