3 Agụụ mmiri wee na-agụ ndị Izrel, ha wee na-atamu ntamu megide Mozis, na-asị: “Gịnị mere i ji kpọpụta anyị n’Ijipt iji mee ka agụụ mmiri gụgbuo anyị na ụmụ anyị na anụ ụlọ anyị?”+
13 Ọ̀ bụ ntakịrị ihe na i si n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị ka i gbuo anyị n’ala ịkpa a,+ mere i jikwa na-anwa ime onwe gị onyeisi anyị gabiga ókè?+
3 O wee zụọ gị ka ị dị umeala ma mee ka agụụ+ gụọ gị wee nye gị mana,+ nke gị onwe gị ma ọ bụ nna gị hà na-amaghị; iji mee ka ị mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta ga-eme ka mmadụ dị ndụ.+