12 “Ọ bụrụ na e resị gị nwanne gị, ya bụ, nwoke Hibru ma ọ bụ nwaanyị Hibru,+ ọ bụrụkwa na o jeworo gị ozi afọ isii, n’ime afọ nke asaa ị ga-ahapụ ya ka ọ lawa wee bụrụ onye nweere onwe ya.+
14 “Ná ngwụcha afọ asaa, onye ọ bụla n’ime unu ga-ahapụ nwanne ya,+ bụ́ onye Hibru,+ onye e resịrị ya,+ nke jewooro ya ozi afọ isii, ka ọ laa; ị ga-ahapụ ya ka o nwere onwe ya.” Ma nna nna unu hà egeghị m ntị, ha atọghịkwa ntị ha n’ala.+