19 Ruo ụbọchị asaa, a gaghị ahụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu, n’ihi na onye ọ bụla detụrụ ihe e tinyere ihe na-eko achịcha ire, ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa ma ọ bụ nwa afọ,+ a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ ná nzukọ Izrel.+
17 A gaghị etinye ya ihe na-eko achịcha wee ghee ya.+ Enyewo m ha ya ka ọ bụrụ òkè ha n’àjà a na-esurere m n’ọkụ.+ Ọ bụ ihe kasị nsọ,+ dị ka àjà mmehie nakwa dị ka àjà ikpe ọmụma.
7 Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta,+ dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo+ nwa atụrụ ememme ngabiga+ anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.+