25 Onye nchụàjà ga-ekpuchikwara+ nzukọ ụmụ Izrel dum mmehie ha, a ga-agbagharakwa ha mmehie ahụ; n’ihi na e mere ya n’amaghị ama,+ ha onwe ha kwa wetara àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ dị ka onyinye ha, wetakwa àjà mmehie ha n’ihu Jehova n’ihi ihe ha mere n’amaghị ama.