19 “‘Ọ bụrụ na ihe na-agbapụta nwaanyị n’ahụ́, ihe ahụ na-agbapụta ya n’ahụ́ ewee bụrụ ọbara,+ ọ ga-anọ n’adịghị ọcha+ nke ịhụ nsọ ya+ ruo ụbọchị asaa, onye ọ bụla metụrụ ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
24 Ọ bụrụ na e nwee ka ya na nwoke si dinaa, adịghị ọcha nke ịhụ nsọ ya ewee mesa ya,+ nwoke ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa, ihe ndina ọ bụla nwoke ahụ dinara na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.
18 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị nọ ná nsọ ya edinaa, o wee kpughee ọtọ nwaanyị ahụ, nwoke ahụ ekpughewo isi ọbara nwaanyị ahụ, nwaanyị ahụ n’onwe ya ekpughewokwa ebe ọbara ya si asọpụta.+ N’ihi ya, a ga-ebipụ ha abụọ n’etiti ndị ha.