Ọpụpụ 32:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 Mozis wee guzo n’ọnụ ụzọ ámá ebe ha mara ụlọikwuu, sị: “Ònye dịnyeere Jehova? Ya bịakwute m!”+ Ụmụ Livaị niile wee malite izukọta n’ebe ọ nọ. Ọnụ Ọgụgụ 8:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 “Si n’etiti ụmụ Izrel kpọrọ ndị Livaị, meekwa ka ha dị ọcha.+ Ọnụ Ọgụgụ 18:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Kpọrọkwa ụmụnne gị ndị si n’ebo Livaị, bụ́ ọnụmara nna gị, bịa nso, ka ha sonyere gị wee na-ejere gị ozi,+ na-ejere ma gị onwe gị ma ụmụ gị ozi, n’ihu ụlọikwuu Ihe Àmà.+ Malakaị 2:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Unu ga-amarakwa na ọ bụ m ziteere unu iwu a,+ ka ọgbụgba ndụ+ mụ na Livaị wee dịgide,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
26 Mozis wee guzo n’ọnụ ụzọ ámá ebe ha mara ụlọikwuu, sị: “Ònye dịnyeere Jehova? Ya bịakwute m!”+ Ụmụ Livaị niile wee malite izukọta n’ebe ọ nọ.
2 Kpọrọkwa ụmụnne gị ndị si n’ebo Livaị, bụ́ ọnụmara nna gị, bịa nso, ka ha sonyere gị wee na-ejere gị ozi,+ na-ejere ma gị onwe gị ma ụmụ gị ozi, n’ihu ụlọikwuu Ihe Àmà.+
4 Unu ga-amarakwa na ọ bụ m ziteere unu iwu a,+ ka ọgbụgba ndụ+ mụ na Livaị wee dịgide,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.