23 Ọ bụ ndị Livaị ga na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute, ọ bụkwa ha ga-aza ajụjụ maka njehie ha.+ Ọ bụ ụkpụrụ ga-adịru mgbe a na-akaghị aka n’ọgbọ unu niile, ya bụ, na ha agaghị enweta ihe nketa+ n’etiti ụmụ Izrel.
15 “‘Ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Livaị,+ ụmụ Zedọk,+ ndị rụrụ ọrụ e kwesịrị ịrụ n’ebe nsọ m mgbe ụmụ Izrel si n’ebe m nọ kpafuo,+ ga-abịa n’ihu m jeere m ozi. Ha ga-eguzokwa n’ihu m+ na-eche abụba+ na ọbara+ n’ihu m,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.