24 “A ga-eli Erọn dị ka e liri ndị ya,+ n’ihi na ọ gaghị abanye n’ala ahụ m ga-enye ụmụ Izrel, n’ihi na unu nupụrụ isi n’iwu m n’ihe banyere mmiri Meriba.+
28 Mozis wee yipụ Erọn uwe ya ma chịrị ha yiwe Elieza nwa ya, e mesịa, Erọn nwụrụ n’ebe ahụ, n’elu ugwu ahụ.+ Mozis na Elieza wee si n’ugwu ahụ gbadata.
38 Erọn onye nchụàjà wee gbagoo n’Ugwu Họọ dị ka Jehova nyere ya n’iwu, o wee nwụọ n’ebe ahụ n’afọ nke iri anọ mgbe ụmụ Izrel pụtasịrị n’ala Ijipt, n’ọnwa nke ise, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ.+
6 “Ụmụ Izrel wee si Bierọt Bene-jeekan+ kwalie gawa Mosira. N’ebe ahụ ka Erọn nwụrụ, e wee lie ya n’ebe ahụ;+ Elieza nwa ya nwoke wee malite ije ozi n’ọnọdụ ya dị ka onye nchụàjà.+