20 ruo mgbe Jehova ga-eme ka ụmụnne unu zuru ike, dị ka unu onwe unu, ha enwetakwa ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye ha n’ofe Jọdan; e mesịa, onye ọ bụla n’ime unu ga-alọghachi n’ihe nketa ya nke m nyere unu.’+
23 Jọshụa wee weghara ala ahụ dum, dị ka ihe niile Jehova kwere Mozis ná nkwa si dị,+ Jọshụa wee nye ya Izrel ka ọ bụrụ ihe nketa ha n’òkè n’òkè, dị ka ebo ha si dị.+ Ala ahụ enweghị nsogbu agha ọzọ.+