25 Jehova wee gbadata n’ígwé ojii+ gwa ya okwu,+ werekwa ụfọdụ n’ime mmụọ+ dị n’ahụ́ ya mee ka ọ dakwasị ndị okenye iri asaa ahụ. O wee ruo na ozugbo mmụọ ahụ dakwasịrị ha, ha malitere ime ka ndị amụma; ma ha emeghị ya ọzọ.+
8 M na-agwa ya okwu ihu na ihu,+ si otú ahụ na-egosi ya ihe n’ụzọ doro anya, ọ bụghị n’ilu;+ ọ na-ahụkwa ọdịdị Jehova.+ Gịnị mere egwu atụghị unu ikwu okwu megide ohu m bụ́ Mozis?”+