17 M ga-agbadata+ wee gwa gị okwu n’ebe ahụ;+ m ga-ewerekwa ụfọdụ n’ime mmụọ+ dị n’ahụ́ gị wụkwasị ha, ha ga-enyekwara gị aka n’ibu ibu ha ka i wee ghara ibu ya naanị gị.+
9 O wee ruo na ozugbo ha gafere, Ịlaịja sịrị Ịlaịsha: “Rịọ ihe m ga-emere gị tupu e wepụ m n’ebe ị nọ.”+ Ịlaịsha wee sị: “Biko, ọ bụ ka m nweta+ òkè abụọ+ nke mmụọ gị.”+
15 Mgbe ụmụ ndị amụma nọ na Jeriko hụrụ ya n’ebe dịtụ anya, ha malitere ịsị: “Mmụọ+ Ịlaịja adakwasịwo Ịlaịsha.” Ha wee bịa izute ya wee kpọọrọ ya isiala.+