9 Jọshụa nwa Nọn jupụtara na mmụọ amamihe,+ n’ihi na Mozis bikwasịrị ya aka n’isi;+ ụmụ Izrel wee malite ige ya ntị, ha wee malite ime dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.+
17 Ọ ga-ejikwa mmụọ na ike Ịlaịja+ butere ya ụzọ, iji mee ka obi+ nke ndị bụ́ nna chigharikwuru ụmụ ha, meekwa ka ndị na-enupụ isi nwee ezi amamihe nke ndị ezi omume, iji kwadebere Jehova+ otu ndị.”+
8 kama unu ga-anata ike+ mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà+ m ma na Jeruselem+ ma na Judia dum nakwa na Sameria,+ ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”+